You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Nwuchie ndị niile na-eke ihe onyonyo mwakpo ndị Fulani n'Ebonyi - Umahi

Aka na-achị Ebonyi steeti bụ David Umahi enyela iwu ka anwuchie ndị niile na-ekesa ihe onyonyo ọ kpọrọ adigboroja ha sị na-egosi ebe a na-awakpo ndị Fulani.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chiagozie Nwonwu

  1. Otu Golden Eaglets ga-ezute otu egwuregwu bọọlụ Ivory Coast na Wenesde na-abịa

    Otu Golden Eaglets nke Naịjirịa ga-ezute mba Ivory Coast na Lome dịka asọmpị iko mba Afrịka nke ndị agafebeghị afọ iri na asaa ga-amalite.

    Ọ bụ n’elekere anọ nke ehihe n’ụbọchị Wenesde ka asọmpị a ga-esu.

    Ọ bụ n'ụbọchị Satọde ka Golden Eaglets ga-ahu Naịjirịa gawa Ivory Coast.

    Ndi ikpeazu n'asọmpi a ga-agba Iko U17 AFCON na mba Moroko n'ọnwa Julaị.

  2. Ozi afọ ọhụrụ Buhari siri ụmụ Naijiria taa

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwegharịala ụmụ Naijiria nwka iji okwu nchekwa obodo kpọrọ ihe n'ụzọ pụrụ iche n'afọ 2021.

    N'ozi afọ ọhụụ o ziri n'ụtụtụ ụbọchị mbụ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2021, Buhari kwuru nana nchekwa so n'ihe kachasi mkpa gọọmentị ya ga-etinye uche na ya.

    Gee ihe ndị o kwuru n'uju:

  3. Afọ 2021, afọ ọganihu

    Ndewo ụmụ ibe dịka Olisa bi n'igwe kpọbatara anyị n'afọ ohụru!

    Afọ 2021, ga-abụrị gị afọ ọganihu.

    Ihe ọma mere onye ihu, mere onye azụ!

    Isee!