Ụlọikpe mkpegharị n'Amerịka akagbuola akwụkwọ a gbara sị ka a ghaara igbu otu nwaanyị a mara ikpe ọnwụ n'Amerịka nke bụ na igbu ya ga-aga n'ihu.
N'afọ 2004 ka Lisa Montgomery pịgburu nwaanyị dị ime na Missouri tupu ọ bọọ afọ nwaanyị ma tọọrọ nwa dị ya n'ime afọ.
Ọ bụrụ na a gaa n'ihu gbuo ya, ọ ga-abụ nwaanyị mbụ a mara ikpe ọnwụ ma gbuo ya kamgbe ihe ruru afọ iri asaa gara aga.
Eyiweburu igbu Montgomery n'ọnwa gara aga mana e mechaghị gbuo ya maka ọkaiwu ya butere coronavirus.
Mana e yigharịrị ya gaa ụbọchị 12 nke ọnwa Jenuwarị mana ọkaiwu ya sị agaghị emenwu ya ebe ha nwere akwụkwọ a gbara n'ụlọikpe.
Ụlọikpe kwadoro ihe ọkaiwu ya kwuru ma kwụsị onye dịrektọ ụlọmkpọrọ inye iwu ka e gbuo ya.
N'ụbọchị Fraịde, otu ndị ọkaikpe kpebiri na direktọ mere ka iwu si kwuo, ma sị ka a gaa n'ihu gbuo ya.
Ndị ọkaiwu Montgomery sị na ha ga-agba akwụkwọ ga-asị ndị ọkaịkpe lebagharịa anya na mkpebi ha.
Nwaanyị ikpeazụ gọọmentị Amerịka mara ikpe ọnwụ ma gbuo bụ Bonnie Heady, onye e ji ikuku gaasị gbagbuo na Missouri n'afọ 1953.