George Obiozor so azọ ọkwa onyeisi Ohanaeze Ndigbo daara n'ala n'ọgbakọ Imeobi

Otu n'ime mmadụ ise so azọ ọkwa onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ George Obiozor daarala n'aka n'oge ọgbakọ ha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. "N'okwu nchekwa, anyị bụ ndị omeiwu awụọla ụmụ Naijirịa n'ala" - Rochas Okorocha

    Rochas Okorocha

    ROCHAS OKOROCHA (Imo west)

    Aka chibụrụ Imo state bụ Rochas Okorocha ekwuola uche obi ya maka ọnọdụ nchekwa na Naijirịa dịka ndị omeiwu nwere nzụkọ ha taa.

    O bidoro sị "kamgbe m batara dịka onye omeiwu ọtụtụ mgbe ka anyị na-eme nkwanye ugwu maka ndị nwụrụ maọbụ tulie atụmatụ nchekwa dị iche iche".

    Okorocha gara n'ihu kwuo sị na ndị họpụtara ha bu n'obi na ha bụ ndị omeiwu ga-echekwa ndụ ha, kama o kwuru na ha adaala na nke ahụ.

    Ọ kọwara na dịka onye bụ nna ụmụaka, na ya amaghị ihe na-aga n'obi ndị awakporo ndị ezinụlọ n'obi.

    Okorocha chere na ha nwereike ị na-aju "Ọ bụ na ndị na-achi anyị enweghi ike ịzoputa anyị?".

    O kwuru na etu a ka ọ na echekwa ihe ezinụlo ndị ọru ubi egbupụru isi ga na-ekwu n'obi ha.

    Ọ gwara ndị omeiwu ibe ya sị"Ọbaghị uru na anyi nọ ebe a ma ọ bụrụ na anyi enweghi ike ichekwa ndụ na akụnụba ndị Naijirịa".

    Okorocha gwara ha sị "oruola mgbe anyị na onyeisiala Muhammadu Buhari ga-enwe nzụkọ maka ọnọdụ nchekwa na Naijirịa"

    O jụkwara na ọ bụrụ na-enwere ụzọ onyeisiala Naijirịa chọrọ ka e si nyere ya aka, ha dị njikere ma ọ bụrụ na-enweghị, ka ọ gbalịa hụ na nchekwa lọhachiri Naijirịa.

    O kwukwara sị, "ọzọ bụ kwa na ndị omeiwu kwesiri ị ga katsina were gbaa ndị a a tọrọ ụmụ ha obi ka ha mara na ndị omeiwu kwadoro ha.

    Biodun Christine Olujimi

    Ebe foto si, Biodun Christine Olujimi/Facebook

    BIODUN OLUJIMI (Ekiti South):

    Biodun Olujimi gwara ndị omeiwu ibe ya na ụlọọrụ onyeisiala anaghị ahụ ndi omeiwu dịka ndị ha na ha kweisri i so rụọ ọrụ maka ọdịmma Naijirịa.

    O kwuru sị "ụlọ ọrụ onyeisiala abụghị ihe nrite, ọ bụ oku ịrụ ọrụ".

    Ọ kwuru na ọ bụ onyeisiala ka ihe gbasara ọchịchị dị n'aka.

    Ọ kwukwara na mkpebi niile ha na-ekpebi dịka ndị omeiwu na enweghị nke ụlọọrụ onyeisiala na-eme ihe ọbụla maka ya.

    Olujimi jụrụ sị "Kedu etu anyị ga-anọ ụmụ akwụkwọ narị atọ na iri atọ abụrụ ndị atọọrọ atọ".

    O kpebiri sị, "anyị agaghị emere ndị nwụrụ anwụ Bọjet, anyi kwekọrịta na gọọmentị ga emeriri ihe ha kwesiri ime tupu anyi akwado bọjet ha ga-eme ihe ha kwesịrị ime".

    Matthew Aisagbonriodion Urhoghide

    Ebe foto si, Matthew Aisagbonriodion Urhoghide/Facebook

    MATTHEW URHOGHIDE (Edo South) :

    Mgbe ndị ụloomeiwu nta kpọrọ onyeisiala Muhammadu Buhari ka ha nwee mkparịta ụka maka etu nchekwa Naijirịa dị, o kwuburu na ọ ga-abịa ma mechaa kagbuo ya.

    "E nwere ndị na-etinye onyeisila n'ọnọdụ nke ga-eme ka anyi chee na onyeisilala enweghị nsọpụrụ ebe ndị ụlọomeiwu nọ.

    E kwenyere m na onyeisiala Naijirịa enweghị nsọpụru ebe ndị omeiwu nọ.

    ọtụtụ iwu anyị chọrọ ka ewepụta, anaghị eme ya.

    Anyị kwtere ka ewepụ ndị isi nchekwa na Naijirịa, mana emeghị ya.

    Anaghị m asị ka-achụpụ onyeisiala, a na m ekwu ka anyị gwa ya ka ọ.

  2. Gbachie 'Sim card' ọbụla enweghị akara njirimara 'NIN'- Gọọmenti etiti

    Gọọmenti etiti enyala ụmụ Naijiria izụụka abụọ iji denye akara njirimara ha nke si n'aka gọọmenti n'akara ekwentị ma nye ụlọọrụ ekwentịụ dịga iwu ịgbachi nke onye ọbụla emeghị otu a malite n'abalị 30 nke ọnwa Disemba, afọ 2020.

    Nke a so na mkpebi ha nwere na ọgbakọ ihe gbasara nzirita ozi n'ekwentị metụtara nke Mịnịsta nzirita ozi

    Ozi nke ọnụ na-ekwuru mịnịstrị ahụ bụ Ikechukwu Adinde binyere aka sị na ha kwuru na ya bụ nzọpụ ụkwụ dị oke mkpa n'okwu ịhazị ndebanye aha 'sim card' emerela.

  3. Ebonyi Judicial panel: Nna nwa mgbọ tụrụ chọrọ ka ndị uweojii kwụọ N15m

    Rev Dr Godwin Omoha bụ nna nwata nwaanyị mgbọ si n'egbe ndị uweojii tụụ n'anya ekwuola ka a kwụọ ya na ezinaụlọ ya nde naira iri na ise maka itiaka n'obi maka ego e mefuru n'ụlọọgwụ, ahụụfụ na ihe isi ike ha gabigara n'ihi ọdachi ahụ.

    Omoha kpọrọ oku ahụ ụbọchị Tuzde n'ọgbakọ gọọmenti Ebonyi steeti hibere maka inyocha mmekpahụ ndị uweojii na steeti ahụ.

    Onye akaebe bụ Elebe Chidindu Earnest kwuru na ya kwọ nwa ada Favour Omoha aga ahịa 'Margret Umahi International Market ' oge ndị uweojii na-akwa ndị na-eme ngagharịiwe mgbọ were kụwa ugegbe ụgbọala ha wre tụọ Favour n'isi n'akụkụ anya ya.

    Ọgbakọ maka EndSARS nnke Ebonyi

    Ebe foto si, Enyinna Omoke

  4. Ndị ntọ atọrọla Fada dịka ọ na-aga akwamozu nna ya

    Fada Valentine Ezeagu

    Ebe foto si, SMMM

    Ndị ntọ atọrọọla otu ụkọchukwu Katọlik nke otu ndị ụkọchụkwụ dị n'Ụmụahịa a kpọrọ 'Sons of Mary, Mother of Mercy(SMMM)' aha ya bụ Fada Valentine Ezeagu n'ụtụtụ taa bụ Fraide.

    A tọrọ Fada Ezeagu bụ onyeisi ụlọakwụkwọ Holy Family Secondary School Osusu dịka ọkwọ ụgbọala ya (Corolla 2005) aga Igbo-Ukwu maka akwamozi nna ya lara mụọ.

    Ndị nọ ebe ihe mere kwuru nadịmkpa anọ bu egbe si n'ọhịa tipụta na obodo Umuololo dị n'Arondizogu,tinye n'azụ ụgbọala ya ma kwọọ ya pụọ.

    Oge BBC kpọrọ onyeisi otu ụkochukwu SMMM bụ Fada George Okorie, o kwuru na ọ bụ ezie na atọọrọ Fada ma na o kweghị ekwụ ihe ọzọ banyere ya si n'okwu ahụ bụ okwu e nwere ka o siri dị.

  5. Umahi ewegarala ụlọomeiwu Ebonyi Bojetị N122bn

    Dave umahi

    Ebe foto si, Dave Umahi/Facebook

    Gọvanọ David Umahi ewegaarala ụlọomeiwu Ebonyi steeti bọjetị ijeri Naira 122 na ụma maka afọ 2021.

    Ụmahi kọwara na bọjetị ahụ ọ kpọrọ "Bọjetị nkwụdosikike n'ọnọdụ Ọtanisi"bụ iji gboo mkpa a nọ na ya n'oge ugbua.

    Ọ kọwara na ihe bataara steeti ahụ bụ N122,138,799,059.13 nke bụ pasent 92.53% bọjetị nke afọ 2020.

    O kwuru na bọjetị 2021 ji naanị pasent 0.6 karia etu nke 2020 siri rụọ ọrụ.

    Ụlọomeiwu

    Ebe foto si, Enyinna Omoke

  6. Ụlọikpe mba Yuganda enyela iwu ka atọhapụ Omah Lay na Tems

    Omah Lay na TEMS

    Ebe foto si, Omay Lay/TEMS/Twitter

    Ụlọikpe na mba Yuganda enyela iwu ka atọhapụ oti egwu Omah Lay na Tems.

    Ndị a ezigbo aha ha bụ Stanley Omah Dida na Temilade Openyi nọ n'aka ndị ọrụ nchekwa mba Yuganda kamgbe ụbọchị atọ.

    A nwuchiri ha dịka ha soro na ihe emume emere nke gọọmentị mba ahụ si megidere iwu ọgbakọ maka ọrịa covid-19.

    A nwuchiri ha na mmadụ anọ ọzọ bụ ndị mba Yuganda.

  7. Ihe anyị emebiri na ngagharịiwe End SARS karịrị otu Ijeri naịra - NPA

    Hadiza Usman

    Ebe foto si, Hadiza Usman

    Ngalaba na-ahụ maka ntụbata ahịa na Naịjirịa bụ 'Nigeria Ports Authority' ekwuola na jhe ndị ekperima mebiri n'ụlọorụ ha n'oge ngagharịiwe 'End SARS' karịrị otu nde Naịra.

    Onyeisi ngalaba a bụ Hadiza Bala-Usman kwuru nke a oge ọ gara ịkọwara ndị ụlọ omeiwu Naịjirịa atụmatụ mkpata na mmefu ego nke ndị NPA maka afọ 2021.

    Dịka Usman si kọị̀aa, ihe ndị ahụ gụnyere:ụgbọala iri abụọ na asaa, igwe kọmputa dị narị atọ na iri na asaa (317) nke e zuru n'ohi, ọtụtụ igwe 'photocopy' na ihe ndị ọzọ.

    O kwukwara na ụlọọrụ ha a gbara ọkụ ga-ewe ha nde naịra narị asatọ na asaa (N807m).

    "Agbakọchaa ihe niile ndịa ọ ga-akarị otu ijeri naịra (N1billion)," Bala-Usman kwuru.

  8. Ụlọomeiwu Ukwu

    Ebe foto si, Tope Brown

    Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu eduola mmadụ anọ ndị otu ha ọhụrụ bụ ndfdị meriri na ntuliaka mmeju e mere na nsonso a n'iyi ọrụ taa bụ Tuzde.

    Ndị e duru n'iyi ọrụ gụnyere; Henry Seriake Dickson na-anọchite Bayelsa West, Henry Seriake Dickson na-anọchite Plateau South, Adetokunbo Abiru na-anọchite Lagos -East na Cleopas Moses na-anọchite Bayelsa Central.

  9. Ihe mere gọvanọ Abia agaghị akpọghachi onye ọrụ ya fere Odumeje ego

    Ndị ngagharịiwe n'Umuahia maka Agbazuere

    Ebe foto si, Tenneson Ogueri

    Amabeghị mgbe Gọvanọ Abia steeti, Okezie Ikpeazụ, ga-akpọghachi onyeisi ndịọrụ ya bụ Anthony Agbazuere, bụ onye akwụsịtụrụ ọrụ dịka onyonyo pụtara ebe ọ na-efe ụkọchukwu Chukwuemeka Ohanemere, onye e ji Odumeje mara.

    Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ndị ntorobịa gara njem n'isi ụlọọrụ gọọmentị iji rịọ ka Ikpeazu gbaghara Agbazuere ma kpọghachi ya n'ọrụ.

    Ụmụ ntorobịa ahụ kwuru na Agbazuere bụ ezigbo nwanne ha welitere isi na gọọmentị Abịa steeti, ma bụrụkwa ukwu na anya ha ji ahụ ihe na-eme n'obi gọọmentị.

    N'ịzahachị okwu ha, Odeakwụkwọ ukwu steeti ahụ bụ Barr. Chris Ezem, onye nabatara ndị ntorobịa ahụ, kwere ha nkwa na ozi ha ziri anwụrụọkụ ga-eruriri eligwe aka.

    Mana onye ọzọ ọnụ na-eru n'okwu na gọọmentị na-achọghị ka anụ aha ya gwakwara ndị ntaakụkọ na okwu ahụ ga-ata akpụ.

    O kwuru na "iwe gọọmentị bụ na Agbazuere na-emebo gọọmentị, ebe ha ka na-ebe akwa na ego adịghị eji arụ ụzọ maọbụ ịkwụ ụgwọ ọnwa nakwa ihe ndị ọzọ".

    Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu ahụ kọwara na gọvanọ chọrọ iji Agbazuere kuziere ndị ọzọ ihe ka ha ghara ịkpa ụdị agwa ahụ echi.

    Mgbe ndị ntaakụkọ kpọtụrụ ya n'ekwentị, Ojeozi mgbasa ozi steeti ahụ bụ Onyebuchi Omemanka sị na ya ahụghị mgbe ndị ahụ bịara ya bụ ngagharịiwe.

  10. Ọ bụghị eziokwu na a na-awakpo ndị Igbo na-ekpe alakụba - Ohaneze

    Nnia Nwodo
    Nkọwa foto, Nnia Nwodo bụ onyeisi otu Ohaneze Ndigbo

    Otu Ohaneze Ndigbo ekwuola na onweghị ndị na-awakpo ndị Igbo na-ekpe okpukperechi alakụba na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

    Emeka Attamah, onye enyemaka mgbasaozi nke onyeisi ndị Ohaneze bụ Nnia Nwodo, kwuru nke a n'ime akwụkwọ ozi o zipụrụ na mgbede Mọnde.

    Nke a na-abịa dịka otu a kpọrọ 'South East Muslim Organization of Nigeria' (SEMON) nakwa (Igbo Muslim Forum) na-ebo ebubo na ndị otu ha anaghị aṅụ mmiri tọgbọ iko na mpaghara ala Igbo.

    Ha bokwara ebubo na ndị otu IPOB na-awakpo ha kwa mgbe kwa mgbe ma na-emerụkwa ndị otu ha ahụ, mana onweghị ihe otu Ohaneze maọbụ ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ na-eme maka ya.

    N'akwụkwọ ozi ahụ, Nwodo kwuru na onwebeghị mkpesa ọbụla ha nwetara gbasara mwakpo maọbụ mkpagbu ndị okpukperechi alakụba n'ala Igbo ma gbachi nkịtị.

    Nwodo kwuru na ndị Igbo na-anabata ndị okpukperechi ọbụla dịka ha merela ọtụtụ afọ gara aga.

    Ọ kọwara na okpukperechi alakụba anọọla n'ala Igbo ihe karịrị otu narị afọ na-enweghị mmekpa ahụ ọbụla.

    "Keduzi mgbe mmekpa ahụ a na-ebo ebubo ya malitere?" Nwodo jụrụ.

    Ndị alakụba

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Okpukperechi alakuba adịla n'ala Igbo ihe karịrị afọ narị abụọ. Ọ bụ ya bụ okpukperechi nke abụọ kacha nwee ndị mmadụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ

    Ihe BBC chọpụtara

    BBC Igbo ezigala onye ntaakụkọ ka ọ gaa n'ogbe ndị ụka alakụba dị n'Ebonyi steeti, iji mee nchọpụta ma mara ma ebubo ndị a ọ bụ eziokwu.

    Mana ndị isi okpukperechi alakụba na steeti ahụ ekweghị akọrọ ya ihe ọbụla.

    Anyị gbara mbọ ịchọpụta mpaghara ebe ha sị na a wakporo mana anyị enweghị ike, n'ihi na ndị isi ha enyeghị anyị nkwado.

  11. Ọ bụ anyị nwụchiri ụmụakwụkwọ na Katsina - Boko Haram

    Abubakar Shekau

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Abubakar Shekau bụ onyeisi ndị Boko Haram

    Onyeisi ndị otu Boko Haram bụ Abubakar Shekau ekwuola na ọ bụ ha tọọrọ ọtụtụ ụmụakwụkwọ n'obodo Kankara dị na Katsina steeti.

    Shekau kwuru nke a site n'ozi o zipụtara n'isi ụtụtụ Tuzde.

    A na-echebu na ọ bụ ndị ekperima mmadụ amaghị ndị ha bụ kpara ya bụ arụ, mana ugbua, ndị Boko Haram ekwuola na ọ bụ ha.

    Shekau kwuru na ihe kpatara ha ji tọrọ ụmụakwụkwọ ahụ bụ iji kwụsị agụmakwụkwọ bekee bụ nke ha kwuru na ọ bụ ihe arụ n'okpukperechi alakụba.

    Nke a na-abịa dịka gọvanọ Katsina steeti bụ Aminu Bello Masari kwuru na gọọmentị na ndị ekperima tọọrọ ụmụakwụkwọ ahụ amalitela mkparịtaụka iji tọhapụ ha.

    Bello kwuru nke a oge ya na Onyeisiala Muhammadu Buhari nwechara obere nzukọ n'obodo ya bụ Daura.

    Amachabeghị kpọm kwem ụmụakwụkwọ ole a tọọrọ, mana a na-eche na ha karịrị narị atọ.

    Cheta na ụdị ihe a mere n'afọ 2014 oge Boko Haram tọọrọ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị karịrị narị abụọ n'obodo Chibok, dị na Borno steeti.

    Ruo taa, ihe karịrị mmadụ otu narị n'ime ha ka na-efu efu.

    Ọzọkwa, n'afọ 2018, Boko Haram nwuchikwara ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị karịrị otu narị n'obodo Dapchi dịkwa na Borno steeti.

    Ha mechara tọhapụ ha, mana otu onye n'ime ha bụ Leah Sharibu, ka nọkwa n'aka Boko Haram ruo taa.

  12. 'Electoral College' ekwuola na Joe Biden meriri ntuliaka Amerịka

    Joe Biden

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, A ga-edu Joe Biden n'iyi ọrụ n'ọnwa Jenụwarị

    Otu a kpọrọ 'Electoral College' na mba Amerịka akpọpụtala Joe Biden dịka onye meriri ntuliaka ọkwa onyeisiala mba ahụ nke e mere n'ọnwa Nọvemba.

    Dịka iwu Amerịka si dị, ọ bụ ndị 'electoral college' ga-ekpebi n'ezie onye meriri ntuliaka n'agbanyeghị onye meriri nke ahụ ọha obodo niile so mee na Nọvemba.

    N'ọgbakọ ha n'ụbọchị Mọnde, ndị 'electoral college' kwekọrịtara na mpụtara ntuliaka e mere n'ọnwa Nọvemba ziri ezi.

    Cheta na Joe Biden meriri ntuliaka ma rite vootu ndị electoral college 306 ebe Donald Trump ritere naanị 232.

    N'ozi ekele ya, Joe Biden kwuru na obi dị ya ụtọ na ọchịchị onye kwuo uche ya alaghachila kpọmkwem n'Amerịka.

    O kwukwara na ọ bụ ebumnobi ọtụtụ ndị Amerịka mezuru.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    N'aka nke ọzọ, onyeisiala Donald Trump ekwubeghị ihe ọbụla kamgbe ndị 'electoral college' nwechara ọgbakọ ha.

    Trump ka na-ekwusi ike na nnukwu nrụrụaka dị na ntuliaka ahụ e mere na Nọvemba.

    O kwetabeghi na Joe Biden meriri ya bụ ntuliaka.

    Ndị nkwado Trump agaala ụlọikpe dị icheiche ịnata ikike iji kagbuo ntuliaka e mere n'ọtụtụ steeti dị n'Amerịka, mana onwebeghị nke nwere isi.

  13. Ụtụtụ ọma

    Ụtụtụ ọma ụmụ Igbo.

    Ndewo dịka ị na-esonyere anyị na mgbasaozi nke taa.

  14. Daalụ dịka ị nọnyere anyị taa...Ka chi foo!

    Rahụ nụ duu!

  15. Nkeji Coronavirus

  16. "Chika Edoziem enweghị ike ịchụ onye ọbụla n'ọrụ n'ihi na Uche Mefor achụọla ya n'ọrụ kamgbe" - Solomon Egbo

    Solomon Egbo

    Ebe foto si, Solomon Egbo

    Solomon Egbo ekwuola na akwụkwọ ozi na efegharị nke Chika Edoziem binyere aka maka achụm n'ọrụ ya enweghi isi.

    O kwuru sị "ya bụ akwụkwọ achụm n'ọrụ enweghị isi maka na Uche Okafor-Mefor achụọla Chika Edoziem onye depụtara ya bụ akwụkwọ n'ọrụ kamgbe".

    Nke a na-eme dịka ewepụtara akwụkwọ ozi nke Chika Edoziem binyere aka were si na onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu achụpụla Mazi Solomon Egbo dịka onye otu Ipob nke Manchester United Kingdom ma na nke Ipob gburu gburu ụwa niile.

    Akwụkwọ ozi a kwuru na ọchụchụ ya bụ maka na ọ kpara agwa megide ụkpụrụ na ọchụchọ ndị otu Ipob.

  17. Gọvanọ Katsina agwaala Buhari na ha na akparịtaụka etu ụmụakwụkwọ a tọrọ ga-esi lọta

    Gọvanọ Aminu Masari ezuterela Onyeisiala Muhammadu Buhari maka okwu ụmụakwụkwọ atọrọ na Kankara.

    Gọvanọ gwara onyeisiala na ndị ojiegbe tọrọ narị kwụrụ narị ụmụakwụkwọ na obodo Kankara eziterele ha ozi ma kwuo na ha amalitela mkparịtaụka etu ụmụakwụkwọ a ga-esi laghchite.

    Ọ bụ n'obodo Onyeisiala Buhari bụ Daura.

    Masari ekwughi ụdịrị mkparịtaụka ha na ndị tọọ a na-akpa maọbụ na ha jụrụ ego iti aka n'obi tupu ha ahapụ ụmụakwụkwọ ahụ.

    Mana ọ sị na ha na-agba mbọ ịhụ na ọ gara nke ọma.

    Ọ sịkwa na ndị agha Naịjirịa amatala ebe ụmụakwụkwọ ahụ nọ.

    Ihe karịrị ụmụakwụkwọ 300 ka na-efu kemgbe ndi oji egbe wakporo ụlọ akwụkwọ ha.

    Ọ bụ umụakwụkwọ 800 nọ n'ụlọ akwụkwọ ahụ oge mwakpo a mere.

  18. BBC Nkeji

  19. Ndị uweojii Yuganda akpụpụla ndị oti egwu Naịjirịa ụlọikpe maka ịda iwu covid-19

    Ndị uweojii na mba Yuganda ekwuola na ha akpụrụla ndi oti egwu Naịjirịa atọ ụlọikpe na mba ahụ maka ha dara iwu etinyere maka iji belata mbawanye covod-19.

    Ha sị na Stanley Omah Didia eji Omah Lay mara, Temilade Openyi eji Tems mara nakwa Muyiwa Awomiyi ga-aga zara ọnụ ha n'ụlọikpe banyere ebubo na ha mere ihe ga-eme ka covid-19 fesasa ndị mmadụ na Yuganda.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Ha dere n'akara Twitter ha na ha chọbụrụ inye ya ohere ịpụ mana ozi si n'elu sị ka ejidesie ha ike.

    Ọ bụ ha na ndi Yuganda anọ ọzọ ka aka ji.

    Ha ga-anọ n'aka ndị uweojii ruo Wenezde bụ ụbọchị nke 16 nke ọnwa Desemba.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  20. US Election: Taa ka ndị Electoral College ga-ahọpụta onye ga-abụ onyeisiala Amerịka

    Ntuliaka mba Amerịka

    Ebe foto si, Getty Images

    Dịka iwu Amerịka siri dị, taa bụ ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Disemba ka ndị Electoral College ga-ahọpụta onye ga-abụ onyeisiala mba Amerịka.

    Nke a pụtara na steeti niile onye ọbụla soro zọọ ndọrọndọrọ ọchịchị onyeisiala Amerịka meriri, ndị ahụ ga atụnyere ya.

    Nke a ga-ekpebi nghọtahe dịka onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump na-ekwu na enwere nrụrụaka na ntuliaka e mere n'ụbọchi atọ nke ọnwa Nọvemba afọ 2020.

    Ọ bụ mgbe onye zọrọ ndọrọndọrọ ochichi meriri ntụliaka Electoral College ka onye ahụ ga-abụzị onyeisiala n'uju ya.

    Ọ bụ ndị a kpọrọ Electors ga-eme ntuliaka a.