George Obiozor so azọ ọkwa onyeisi Ohanaeze Ndigbo daara n'ala n'ọgbakọ Imeobi

Otu n'ime mmadụ ise so azọ ọkwa onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ George Obiozor daarala n'aka n'oge ọgbakọ ha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. 'Buhari abụghị Jibril' - Femi Adesina

    Onyeisiala Mohammadu Buhari

    Ebe foto si, @Presidency

    Femi Adesina apụtara kwuo hoo ha na okwu na Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari bụ nwoke Sudan aha ya bụ Jubril bụ okwu adigboroja.

    N'ozi o dere dịka Onyeisiala Buhari na-eme emume ncheta ọmụmụ ya dịka ọ gbara afọ 78, Maazị Adesina sị na ọ ga-amasị ya na ndị mmadụ ghọtara onye Buhari bụ ọfụma.

  2. FRSC sị onye enweghi NIN agaghi anata njiri mara ọkwọ ụgbọala

    Ngalaba na-ahụ maka mgbochimberede okporoụzọ bụ FRSC ekwuola na ha aghịghị ekwe ka onye enweghị akara NIN nwete njiri maraọkwọụgbọla

    Ọ bụ Bisi Kazeem bu Osote onyeisi ngalaba ahụ weputere ozi n'akara Twitter FRSC.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  3. Emmanuel Macron ebutela coronavirus

    Emmanuel Macron, onyeisiala mba Frans

    Ebe foto si, Getty Images

    Igbo bụ Igbo akụkọ na-eru anyị ntị n'ehihie a bụ na onyeisiala mba Frans bụ Emmanuel Macron ebutela nje coronavirus dịka ogosichara njirimara ya bụ ọrịa.

  4. 'Anyị na-atụ ụjọ na Boko Haram nwereike dughee ụmụ anyị ụzọ' - Nne na nna ụmụakwụkwọ atọọrọ

    Ụlo akwụkwọ Kankara

    Ebe foto si, Getty Images

    Ezinaụlọ ụ,ụakwụkwọ karịrị 300 ndị ntọrị nwụchiri na Katsina na-ekwu na ụjọ na-atụ ha na ndị a ji ha nwereike dughee ha ụzọna-adịghị mma.

    Ha kwukwara na e nwereike jide ha ọtụtụ afọ dịka ndị agha Naịjirịa na-achọ ha n'ime ọhịa.

    A na-eche na ọ bụ ndị Boko Haram jidere ụmụakwụkwọ a.

    N'ime ozi ha wetere, ndị Boko Haram na-ekwu na ọ bụ ha jidere ụmụakwụkwọ a n'obodo Kankara.

    Nne na nna ụmụakwụkwọ ndị na-atụ ụjọ na oge na-aga.

    A ma Boko Haram dịka ndị na-agbanwe uche ndị mmadụ ha ji were mee ha ndị agha ha.

    Shuaibu Kankara bụ onye mgbere bere akwa dịka ọ na-ekwu okwu sị: "Ha ga-agbanwe uche ụmụaka a ya bụrụ gọọmentị emeghi ngwa ngwa zọpụta ha."

    Nwa ya bụ Annas, dị afọ 13, so n'ime ndị atọrọla na Government Science School n'abalị Fraịde.

    Ụmụ ya abụọ gbara ọsọ gbaba n'ime ọhịa.

    Gọvanọ Aminu Bello Masari gwara BBC n'ụbọchị Wenesde na ụmụ akwụkwọ a nọ n'ime ọhịa dị na Zamfara steeti.

    Otu onye ọnụ na-ekwuru ya sị na ndị agha nọ n'ime ọhịa ahụ achọ umụaka a.

  5. Okeala anọ gọọmentị Naịjirịa gbachiri ga-agbape taa bụ Tọzde

    Okeala

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela iwu ka emeghe ngwangwa, ọkeala Naịjirịa na mba ndị agbataobi ha akpochiri kemgbe ọnwa Ọgụst 2019.

    Onye kwuru ihe bụ Minista okwu ego dị n'aka bụ Zainab Ahmed mgbe ha sị na ọgbakọ ndị isi ọrụ gọọmentị ụbọchị Wenezde.

    Gọọmentị nyereikike ka agbape okeala ya na mba Niji na Bini iji nye ohere ka ahịa malitekwa na-etiti mba abụọ ahụ.

    Nke a na-abịa dịka ọ gbachara otu afọ Naịjirịa gbachiri oke ala ndị a maka ịkwụsị ntụbata nri nakwa ngwa ọgụ.

    Okeala anọ ndị a ga-emepe n'usoro a:

    Okeala Seme na nke Nije meghere taa bụTọzde ebe nke Ilela dị na Sokoto, Maigatari dị na Jigawa na Mfun dị na Kros Riva ga-emepe tupu ụbọchị iri atọ na otu nke Disemba 202o.

  6. Ụnụ asaala chi e! Taa ga-adiri anyị niile mma

  7. Uzodinma ewegarala ụlọomeiwu Imo Bọjet afọ 2021

    Hope Uzodinma

    Ebe foto si, Uzodinma Media

    Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma wegaarala ndị Ụlọomeiwu steeti ahụ akwụkwọ bọjeti afọ 2021 n'ụbọchị Tuzde.

    Uzodimma kwuru na bọjet ahụ nke ego ya bụ N346,169,972,082 gbadoro ụkwụ n'ihe atọ; nhaziharị akụnaụba, mwugharị na nnapụta.

    Gọvanọ Uzodinma gara n'ihu gbaa ama na gọọmenti steeti ahụ ka kwụsiri ike na-tinye ego na-abarta n'aka Gọọmenti n'ottu akpaego nke Bekee kpọrọ "Treasury Single Account"(TSA) maka ọdịmma ndị Imo.

  8. Ndị Miyetti Allah na-enye aka ịkpọlata ụmụakwụkwọ anyị ndị ekperima tọọrọ - Gọvanọ Katsina

    Gọvanọ Aminu Bello Masari

    Ebe foto si, Twitter/Aminu Bello Masari

    Nkọwa foto, Gọvanọ Aminu Bello Masari

    Gọvanọ Katsina steeti bụ Aminu Bello Masari ekwuola na ndị isi otu Miyetti Allah na-enyere ha aka na mkparịtaụka iji kpọlata ụmụakwụkwọ ndị ntọ tọọrọ n'obodo Kankara n'ụbọchị Fraịde.

    Masari kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ọ kọwara na onweghị mgbe o ji kwuo na gọọmentị na ndị ekperima tọọrọ ụmụakwụkwọ ahụ na-akparịtaụka.

    "Ihe m kwuru bụ na otu n'ime ndị ntọ ahụ kpọrọ nna otu n'ime ụmụakwụkwọ ahụ n'ekwentị, ma kwuo na ha chọrọ ka a kwụọ ha ụgwọ tupu ha atọhapụ ụmụakwụkwọ ahụ."

    "Kama ọ kpọgfhị aha ego ole ha chọrọ ka akwụọ ha, maọbụ oge a ga-akwụ ya."

    "Ọ bụghị onye ọrụ gọọmentị ka ha kpọrọ."

    Cheta na ndị otu Boko Haram ekwuola na ọ bụ ha tọọrọ ụmụakwụkwọ ahụ.

    Masari gara n'ihu kwuo sị: "mkparịtaụka ka na-aga n'ihu site n'aka ndị isi otu Miyetti Allah. Anyị nwere olileanya na anyị ga-anụ ozi ọma n'oge adịghị anya."

    Gọvanọ ahụ kọwara na ndịagha amatala ebe ndị ekperima ahụ nọ, kama ihe mere achọghị ịwakpo ha n'ike bụ ka a ghara inwe nwata akwụkwọ ọbụla merụrụ ahụ maọbụ nwụọ.

  9. West Brom ahọrọla Sam Allardyce dịka onye nkuzi ọhụrụ ha

    Slaven Bilic na Sam Allardyce
    Nkọwa foto, Slaven Bilic na Sam Allardyce

    Otu egwuregwu bọọlụ Westbromwich Albion ahọrọla Sam Allardyce dịka onye nkuzi ọhụrụ ha.

    Nke a na-abịa dịka ha chụrụ Slaven Bilic bụ onye na-akụziburu ha, n'ihi ọnpa ndị Westbrom na-agba kamgbe afọ bọọlụ ọhụrụ a malitere.

    Allardyce, onye gbara afọ iri isii na isii ga-arụ ọrụ dịka onye nkuzi Westbrom ruo ọnwa iri na asatọ.

    Ọ kuzierela otu egwuregwu Bolton Wanderers, Newcastle, nakwa Everton n'oge gara aga.

    Westbrom emeriela naanị otu asọmpi kamgbe afọ ọhụrụ 2020/2021 malitere.

    Ha bụ ndị nke itoolu na tebulu 'English Premier League'.

  10. Nke mere Ugbua: Gọọmenti agbapele agbata anọ Naijiria na mba ndị ọzọ

    Agbata

    Ebe foto si, Getty Images

    Gọọmenti Etiti akwadola ka a gbape agbata Naijiria anọ na-egbughị oge ọbụla.

    Agbata ndị a gbapere bụ Seme dị na Ọdịda-Anyanwụ, Mfun dị na Niger-Delta Ilela na Maigatari dị na mpagara ọdịda Anyanwụ Ugwu.

    Ọ bụ Mịnista na-ahụ maka ego na nhazi obodo bụ Zainab Ahmed bụ onye gbara ama a ka e mechara ọgbakọ ikuku ndị imeobi gọọmenti etiti nwere.

    Ahmed kwukwara na mmachi a machiri iihe ụfọdụ a na-atụbata dịka osikapa ka dị ire.

    Agbata ndị Ọzọ bụ ndị a ga-agbape ma e mechaa.

  11. Ụlọikpe mkpesa akagbuola ikpe a mara Olisa Metuh

    Olisa Metuh

    Ebe foto si, Channels TV

    Ụlọikpe mkpesa dị n’Abuja akagbuola mkpọrọ afọ asaa a tụrụ Olisa Metuh, bụbu ọnụ na-ekwuru ndị pati PDP, n’ọnwa Febrụwarị afọ a.

    Ha kwuru na ọkaikpe kpeburu ikpe ahụ bụ Okon Abang lere anya n’ihu, nke Bekee kpọrọ Bias, wee maa Maa Metuh ikpe.

    Cheta na ngalaba mgbochi nrụrụaka bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) kpụpụrụ Olisa Metuh ụlọikpe n'ihi ebubo na o riri ego gọọmentị Naịjirịa ruru narị nde narịa anọ (N400 million).

    Ihe ụlọikpe mkpesa kwuru

    Ụlọikpe mkpesa dị n'Abuja

    Ebe foto si, Barrister.ng

    Nkọwa foto, Ụlọikpe mkpesa dị n'Abuja

    Ndị ọkaikpe atọ lebara okwu a anya n'ụlọikpe mkpesa kwuru na ikpe a mara Olisa Metuh ezighi ezi.

    Ha atọ kwetara ihe ọkaiwu na-anọchite Metuh kwuru na Okon Abang kpere ikpe ahụ ka a ga-asị na o nwere ihe na-esere ya na Metuh.

    Ha kwuru sị: "Ọrụ dịịrị onye ọkaikpe bụ ikpe ikpe ziri ezi na-enweghị onyeọbụla ị ga-ekpelara."

    "Ihe akaebe niile anyị hụrụ gosiri anyị na ọkaikpe kpeburu ikpe a, tinyere echiche nke onwe ya n'ime ya bụ ikpe."

    "Ọ bụghị naanị ihe akaebe ọ hụrụ anya ka o ji kpebie ikpe, kama o tinyekwara ebumnuche nke aka ya."

    "E kpekwara ikpe a n'eleghị anya n'ikike dịịrị onye ahụ a mara ikpe."

    "Ọ ga-abụ ihe jọgburu onwe ya ma anyị gbachi nkịtị ka ikpe a guzo."

    N'ihi nke a, ha nyekwara iwu ka a malite n'isi kpegharịa ikpe ahụ.

    Etu ikpe Olisa Metuh si gaa

    Sambo Dasuki

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Olisa Metuh kwuru na ọ bụ Sambo Dasuki nyere ya ego ahụ nke ndị EFCC na-ebo ya ebubo na o zuru.

    Ọ bụ n'ọnwa Febrụwarị afọ a ka e kpebiri ikpe ahụ, ebe ọkaikpe Okon Abang nọrọ kwuo na ikpe mara Metuh n'eziokwu, ma tụọ ya mkpọrọ afọ asaa.

    Oge ikpe a na-aga n'ihu, Metu dara n'ọrịa ma rịọ ka ụlọikpe nye ikike ịga ala bekee ga leta ahụike ya anya, mana ọkaipe Okon Abang jụwara isi.

    Ugboro ugboro ka Metuh dara n'ụlọikpe n'ihi ọrịa, ugboro ugboro ka e bu ya ebu n'elu akwa si n'ụlọọgwụ bịa ụlọikpe n'ihi na ọkaikpe nyere iwu na ọ ga-abịarịrị.

    N'otu oge, Metu boro ebubo na ọkaikpe ahụ na-ele anya n'ihu iji megide ya, mana Okon Abang gọrọ agọ na nke ahụ abụghị eziokwu.

    Gbasara ebubo nrụrụaka, Metuh kwuru na ego ahụ a na-ebo ya ebubo izu bụ onyeisiala oge ahụ bụ Goodluck Jonathan kwadoro ka e nye ya.

    Ọ kọwara na onye nyere ya ego ahụ bụ Sambo Dasuki, onye ji ọkwa 'National Security Adviser' oge Jonathan nọ n'ọchịchị.

    Metuh gara n'ihu kọwaa na ego ahụ bụ maka iji rụọ ọrụ mgbasa ozi oge Jonathan na-achụ nta vootu maka ọkwa onyeisiala e mere n'afọ 2015.

    Mana Ọkaikpe Okon Abang kwenyere n'ihe ndị EFCC kwuru, nke bụ na Olisa Metuh kwesịrị ịmata na ego ahụ e nyere ya bụ ego enwetara site na nrụrụaka.

    Chetakwa na Sambo Dasuki, onye nyere Olisa Metuh ya bụ ego, nọkwa n'ụlọikpe ugbua, ebe ndị EFCC na-ebo ya ebubo izu ego ruru ijeri dọla abụọ ($2 billion).

    Ha kwuru na ego ahụ bụ ego gọọmentị wepụtara maka iji gote ngwa agha nke ndịagha Naịjirịa ga-eji buso ndị ekperima Boko Haram agha.

  12. 'Jonathan mere ọfụma ịchụ Sanusi n'ọrụ dịka onyeisi "CBN"'

    Goodluck Jonathan and Sanusi Lamido Sanusi

    Ebe foto si, Getty Images

    Gọvanọ Kano steeti bụ Umar Ganduje ekwuola na aka chịburu Naijirịa bụ Goodluck Jonathan mere ọfụma na ịchụ Sanusi Lamido Sanusi n'ọrụ dịka onyeisi Ụlọakụ Etiti bụ CBN n'ịchafụ n'afọ 2014.

    Ganduje, onye kwuru nke a n'emume iwepụtara ọha akwụkwọ ọhụrụ nke otu onye ntaakụkọ bụ Philip Melah dere, kwuru na "Jonathan zọpụrụ ụkwụ kara aka na ịchụ Sanusi n'ọrụ dịka onyeisi CBN Governor, nke rụrụ ụfọdụ afọ”.

    Dịka ụlọakụkọ Guardian siri kwuo, Ganduje kwuru na "oge Sanusi kwuru na nde dọla iri anọ na itoolu na-efu n'ọchịchị Jonathan, ihe kwuru n'obi bụ na mba, I kwesịrị na ya na Jonathan kara ịkpa ya n'ime ụlọ".

    Ganduje gara n'ihu kwuo na aka na-achị Kano steeti oge ahụ bụ Rabiu Kwakwanso mere Sanusi Emir iji bọọ Jonathan ọbọ, na ọ bụghị na Sanusi kacha mma ị nọ n'ọkwa ahụ.

    Cheta na kemgbe Ganduje jiri nọrọ n'ọkwa dịka Govanọ, ya na Sanusi adịghị mma nke mere na-a ọ chụturu ya n'ọkwa dịka Emir ka o bochara ya ebubo imefu ego n'ụzọ ekwesịghị nakwa na iji ọkwa ya na-akpasi ala.

    Mana Sanusi agọrọ agụghọ na ebubo ndị a niile bụ ụgha.

    Umar Ganduje

    Ebe foto si, Umar Ganduje/Facebook

  13. Somalia akwala Kenya ka ha kwaralii na be ha

    Ndị agha Somalia

    Ebe foto si, AU-UN

    N'Afrịka, gọọmentị mba Somalịa etinyela ndị agha obodo ha n'okeala ha na Kenya.

    Nke a na-abịa dịka Somalia tibigoro ụdọ mmekọrịta jikọtara ya Kenya ma nyekwa Kenya abalị asaa isi be ha pụọ.

    Ndị bị na ogbe Mandera dnị na ọnwụnwa anyanwụ mba Kenya dị na okeala Somalia kwuru na ahụrụ ndị agha Somalia n'Akụkụ be ha.

    Ọ na Mogadishu ka ndị Mandera na-azụkarị ahịa.

  14. Gọọmentị Naịjirịa ewepụtala usoro ga-enyeaka ịme ka ndị mmadụ na-eri ezigbo nri

    Yemi Osinbajo

    Ebe foto si, Osinbajo/Twitter

    Gọọmentị etiti Naịjirịa ebinyela aka n'akwụkwọ maka usoro ndị mmadụ ga-esi eri nri na-edozi ahụ.

    Ya bụ akwụkwọ ntuziaka maka ezigbo nri ndị National Council on Nutrition kpobobere nke Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo nọ n'isi ya sị na ya bụ usoro ga-enyeaka imemila agụụ na nsogbo sitere na ajọ nri.

  15. Agbaala ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ na Igboukwu, Anambra steeti

    Ogige ndị uweojii  Igbo-Ukwu a gbara ọkụ

    Ebe foto si, Chinonso

    Ụmụntorobịa iwe dị n'obi gbara otu ụlọọrụ ndị uweojii na Igboukwu, Anambra steeti ụnyaahụ maka otu onye keke ndị uweojii gbakenyere egbe.

    Kọmishọna ndị uweojii na ya bụ steeti bụ John Abanga na-arịọ ndị mmadụ ha dere jụụ na ya nye ya bụ onye uweojii kpara agwa ahụ ntaramahụhụ dịịrị ya.

  16. Arsenal na Southampton ga-ezute na elekere isii nke mgbede

    Arsenal

    Ebe foto si, Getty Images

    N'egwuregwu Arsenal na Southampton ga ezute ebe Liverpool na Totternham ga-ama ọkaibe na egwuregwu Premier League taa bụ Wenezde.

    Nke ndị Arsenal na Southampton ga-abụ na-elekere isii nke mgbede ebe ndị Liverpool na Tottenham ga-ezute na elekere asatọ nke abalị.

    Ọtụtụ ndị otu egwubọọlụ ndị ọzọ ga-agbakwa na mgbede taa.

  17. Gọọmentị mba Jamani akpọchiela be ha ọzọ maka egwu coronavirus

    N'ofesi, mba Jamanị akpọchiela be ha nke tara akpụ maka igbochi mfesa coronavirus nke abụọ ruo ụbọchị iri nke ọnwa Jenuwarị afọ 2021.

    Ụnyaahụ bụ Tuzde na mba ahụ mmadụ narị ise (500) nwụrụ ebe mmadụ puku iri na anọ na narị anọ na iri atọ na abụọ (14,432) butere ya bụ nje.

    Coronavirus na Jamani

    Ebe foto si, Reuters

  18. Gọọmentị emechiela ụlọakwụkwọ niile na Kano steeti maka egwu coronavirus

    Gọọmentị Kano steeti emechiela ụlọakwụkwọ niile dị na steeti ahụ maka egwu coronavirus.

    Kọmishọna agụmakwụkwọ na steeti ahụ bụ Sanusi Kiru na-arịọ nne na nna ka ha were ọsọ were iji bịa kpọrọ ụmụ ha na-aga akwụkwọ na steeti ahụ ọsọsọ taa bụ Wenezde.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  19. Ndị ọrụ NCC enyela iwu ka ndị ụlọọrụ ekwentị kpochie sim kadị enweghị NIN

    NCC

    Ebe foto si, NCC

    Ụlọọrụ Nigerian Communication Commission (NCC) agwala ndị ụlọọrụ ekwentị niile ka ha kpochie sim kadị niile ndị nwe ha ejighị akara njirimara Bekee kpọrọ National Identity Number were debe n'akwụkwọ ha.

    Bashir Ahmed bụ onye enyeaka onyeisiala Muhammadu Buhari maka ụzọọgbara ọhụ mgbasa ozi bụ onye dere nke a n'akara Twitter ya ụnyaahụ bụ Tuzde.

  20. Ụmụ nne m unu asaala chi e! Ụbọchị taa ga-amara anyị mma. Ndụ mmiri ndụ azụ.