Ndị ọrụ nchekwa ekeela nkwụcha na Kogi

Ndị ọrụ nchekwa anwụchiela n'isi ụlọọrụ Inec dị na Lokoja,isiobodo, Kogi steeti.
Ha ji akọrọngwa nchekwa n'uju were kee nkwucha ịhụ na ihe gara n'anya ya.

APC meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ na Beyelsa na Kogi dịka a ga-emegharị nke Dino Melaye na Smart Adeyemi.
Uche Akolisa, Chioma Obianinwa, Jessica Nwankwo and Chiagozie Nwonwu

Ndị ọrụ nchekwa anwụchiela n'isi ụlọọrụ Inec dị na Lokoja,isiobodo, Kogi steeti.
Ha ji akọrọngwa nchekwa n'uju were kee nkwucha ịhụ na ihe gara n'anya ya.

Inecc ekwuola na otu APC ka sonye na pati ga-adọ onye ga-abụ gọvanọ na Bayelsa ụbọchị satode.
N'ọsịsa ajụjụọnụ onye ntaakụkọ BBC jụrụ otu nime ọnụ na-ekwuru Inec bụ Aliyu Bello, o kwuru na "ọ bụ onye na-azọrọ APC ka ụlọikpe kwụsiri isonye na ntuliaka, ọ bụghị APC."
"Iwu kwuru na ọ bụ pati n'azọ, ọ bụghị mmadụ na-azọ."
Cheta n'ụlọikpe nọrọ ụbọchị Tọzde kwụsịrị David Lyon, onye APC họpụtara ka o fe ọkọlọtọ ha isonye na ntuliaka ahụ.

Ebe foto si, @Inecnigeria

Ebe foto si, Getty Images
Ụmụ Naijria akpụrụla nwunye onyeisiala Naijiria bụ Aisha Buhari na na Govanọ Kaduna bụ Nasir El-Rufai n'ọnụ maka ịrịọ ndị Kogi steeti ka ha gbaghara gọvanọ ha bụ Yahaya Bello maka iji iji ndị ọrụ bekee ụgwọọnwa.
Nwunye Buhari si ha nke mere eme ya bụrụ anwụnta tara ha n'abalị n'ọgbakọ achumnta vootu APC mere na Kogi ụbọchị Tọọzde.

Ebe foto si, Yahaya Bello/Facebook
O kwuru na Yahaya Bello akwụghị ụgwọ ọnwa n'oge bụ atụmatụ inyocha onye bụ onye butere ya.
Ya bụ okwu gbarụrụ ọtụtụ ndị mmadụ afọ ha were na-ekwupụta uche ha na sosha midia.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2

End of X post
Aka na-achị Kaduna steeti El-Rufai ariola ndị Kogi ka ha gbaghara gọvanọ ha bụ Yahaya Bello mmehie ya niile sị na ọ bụ ụmụaka na-enye Bello nsogbu.

Ebe foto si, David Lyon/Facebook
Ụlọikpe ukwu nọ na Yenagoa, Bayelsa akụpụla aha David Lyon bụ onye kwesịrị ịnọchite anya otu pati APC na ntuliaka gọvanọ a ga-eme na Satọdee,abalị iri na isii nke ọnwa a na steeti ahụ si na ntuliaka imeụlọ tụpụtara ya agbasoghị iwu pati ha.
Nke a na-eme otu onye pati APC a kpọrọ Heniken Lokpobiri gbara akwụkwọ n'ụlọikpe na-ekwu na ọ bụ ya meriri na ntuliaka imeụlọ nke pati ahụ na steeti ahụ maka ọkwa gọvanọ.
Cheta na n'izu gara aga, ụlọikpe kpụpụburu aha Biobarakuma Degi-Eremienye bụ osote Lyoion kwuo na ozi o nyere Inec maka agụmakwụkwọ ya bụ asị.
Obodo na-ede jiji na nkwado ntuliaka gọvanọ na Kogi na Bayelsa.
Ndị agboro wakporo ụlọọrụ otu pati SDP na Lokoja dị na Kogi, mebie ọtụtụ ihe.
Na Bayelsa, akụkọ ọgbaghara na-akpọtụkwa.
Mmadụ ruru atọ bụ ndị nwụrụ n'ọgbakọ achụmnta vootu nke PDP mere na Nembe dị na Bayelsa na nsonso.
Okwu dara na oke n'ọsọ ngwere n'ụzọ oge ndị agboro e chere na ha bụ ndị na-akwado APC wakporo ọgbakọ ahụ.

Ebe foto si, @NatashaAkpoti

Ebe foto si, @inecnigeria
Onyeisioche ngalaba na-ahazi ntuliaka Naijiria bụ Inec n'aha ịchafụ bụ Yakubu Mahmood ekwuola na ụlọrụ ha adịla njikere ntuliaka gọvanọ na Bayelsa na Kogi steeti.
Yakubu onye kwuru nke na ọgbakọ ya na ndị ntuliaka gbasara na Lokoja ụbọchị Tuzde kwuru na Inec emela ihe 12 n'ime 14 atụmatụ nkwado ntuliaka.
"Ihe abụọ bụ ihe ka fọrọ. Nke mbu bụ na ọsọ achụmnta vootu ga-akwụsị n'ime abalị Tọọzde. Nke abụọntuliaka n'onwe ya nke bụ ụbọchị Satọde."
Na Kogi steeti ọ bụ Gọvanọ steeti ahụ bụ Yahaya Bello ga-efe ọkọloto APC; ebe Musa Atayi Wada na-efe nke ndị PDP.
Bello bụ onye a họpụtara dịka gọvanọ Kogi kemgbe afọ 2015 ka Abubakar Audu bụ onye meriri na ntuliaka ahụ nwụrụ tupu a kpọta onye meriri na ntuliaka e mere.
Wada bụ onye inginia a ma ama rụọla ọrụ na ngalaba gọọmenti n'ahụ maka ihe na-eme n'ikperemmiri(Nigeria Port Authority)
Ndị ọzọ so n'asọmpị a bụ ;Ibrahim Jibril Sheik, nke APGA, Jimoh Amodu Yusuf nke MAJA wdg.

Ebe foto si, Alhaji Yahaya Bello/Musa Wada/Facebook

Ebe foto si, David Lyon/ Diri Douye Facebook
Senetọ Diri bụ onye meriri Timi Alaibe nke ruburu na NDDC na ntuliaka imeụlọ pati ha mere ga-efere ndị PDP ọkọlọtọ, ebe Lyon David Pereworimini ga-efe ọkọlọtọ APC.
Ndị ọzọ gụnyere Daniel Tonworo Bennwari nke APGA,Alexander Peretu Beke-Areredo nke PPA wdg.
Inec wepụtara aha mmadụ si patị 60 gụnyere PDP na APC dịka ndị tozuru isonye na ntuliaka gọvanọ na Bayelsa.
Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja akụpụlaaha Senetọ Biobarakuma Degi--Eremienyo bụ onye na-azọ ọkwa osote gọvanọ n'aha APC.
Jọstịs Inyang Ekwo kwuru na Degi--Eremienyo nyere ozi ụgha maka agụmakwụkwọ ya dịka aha dị n'asambodo praịmarị nakwa nke mahadum ya dị iche.
Mana Degi-Eremienyo asaala okwu ma kwuoo na mkpebi ahụ bụ ihe na-atọ ọchị.
Ọ gara n'ihu kwuo na ya ga-agbagharị akwsụkwọ ahụ n'ụlọikpe mkpegharị.
"Mkpebi a na-atọ ọchị n'ihi na e nwere m opekata mpe asambodo agụmakwụkwọ a chọrọ maka ọkwa." Asambodo dịkwa n'aka ụlọikpe."

Ebe foto si, Lyon/Degi 2019 Campaign Organization

Ebe foto si, @inecnigeria
N'ehihie taa bụ Tuzde ka ndị nnochite pati di iche iche ga-esonye na ntuliaka gọvanọ Kogi binye aka n'akwụkwọ nkwekọrịta na ha ga-akwado udo na ntuliaka na-abịa na steeti ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Bute ute tọọ ebe a dịka anyị ga na-adọbitere ụnụ nke na-eme dịka o si gbasa ntuliaka gọvanọ Bayelsa na Gogi nke gaeme n' abalị 16 nke ọnwa Novemba.