Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ụzụ atụọla na Kogi maka ogbugbu mmadụ atọ
Aha onyonyo, Kogi Election: Ụzụ akwa na-atụ na Kogi maka ogbugbu mmadụ atọ
Ụmụnwaanyị na-ebe akwa anyammiri dịka ndị uweojii adịgboroja dabatara n'Adankolo ebe a na-atụ vootu gbagbuo mmadụ atọ.
Ha bukwara igbe vootu gbalaga.
Nke a mere ka ndị uweojii na-eche ebe ahụ hapụrụ.
Onye ntaakụkọ BBC nọ ebe ahụ enwughị ike iseta foto ihe na-aga ebe ahụ dịka ọbị ọkụ dị ndị mmadụ maka nnukwu ọdachị ahụ.
Bayelsa: Atụm vootu ebidoghị n'oge n' ebe ụfọdụ
N'ọnọdụ atụmvootu dị na 'Community Primary School Edepie Ward 5 unit 17, akọrọngwa atụmvootu abịaghị n'oge.
Nke a mere ka a ghara bido atụmvootu n'oge.
Nkọwa foto, Ntuliaka bidoro n' Unit 5 Ward 8' Imiringi dị n'okpuru ọchịchị Ogbia n'oge
Ndị ọrụ ngo Inec gwara BBC na ọ bụ n'ihe egbe a na-agba mere ha ji cheretụ ka ihe jụọ oyii nke mere ka ha bido ihe dịka elekere iri na otu.
Onyeisi nkuzi na mgbasaozi Inec na Bayelsa bụ Wilfred Ifogah kọwara na atụmvootu kwesịrị ibido n'Elekere asatọ rue Elekere abụọ n'agbanyeghị oge ha bidoro, mana ọ bụụ na o nwere ndị mmadụ kwụ n'ahịrị n'Elekere abụọ, a ga-enye ha ohere ịtụ vootu.
Nkọwa foto, Ndị ọrụ ngo Inec na-eche ka ekenye ha ihe ọrụ na RAC Centre dị na 'Community Secondary School, Otuoken'ebe Elekere 10:08am, nke ụtụtụ
Nkọwa foto, Atụmvootu bidoro n'Elekere 11:05 ụtụtụ na 'Ward 13, unit 39' Otuoke bụ onye bụbu onyeisiala Naijiria bụ ọnọdụ atụmvootu Goodluck Jonathan
, Govanọ Dickson atụọla vootu ya
Aka na-achị Bayelsa steeti bụ Seriake Dickson a tụọla vootu ya na wọọdụ ya bụ Toru Orua dị na okpuru ọchịchị Sagbama LGA. Photo credit Bayelsa State Government House Press
Ebe foto si, Bayelsa State Government House Press
Nkọwa foto, Seriake Dickson, gọvanọ Bayelsa nọ n'agba nke abụọ ọchịchị ya na steeti ahụ
A tọrọ ndị ọrụ anyị na Dekina - Kọmịshọna Inec Kogi
Onyeisi Inec na Kogi steeti bụ Prof. Iorliam Apam ekwuola n'ezie na e nwere ebe a napụchara igbe vootu a tụụ atụ.
Ọ gbara ama na a tọrọ ndị ọrụ Inec e zigara okpuru ọchịchị Dekina, mechaa tọhapụ ha mana a nara ha akọrọngwa ntuliaka
Nkọwa foto, Ndị ọrụ Inec na-agụkọ vootu a tụrụ
Ndị agboro akpaala ike na Madobo, Fentolu,Lokoja Club na Adankolo
Aha onyonyo, Kogi Guber Election: Ndị agboro kụsara vootu a tụrụ na Madabo
N'ọnọdụ atụm vootu dị na Madabo, Lokoja, ndị agboro wụchiri buru igbe vootu a tụrụ atụ kpụsasịa.
Ndị agboro bu ụgbọala 'Hilux wuchiri ọgbọ atụm vootu dị na 'Fentolu' were egbe na anwụrụ anyammiri chụsasịa ndị mmadụ.
Oke n'ọsọ, ngwere n'ụzọ. Ndị uweojii n'onwe ha gbara ọsọ ndụ, ka o suru.
Ọzọ dịka ya mere na 'Lokoja Club' ebe ụgbọala Hilux dị asaa nke ndị uweojii wuchuru n'ime ya bidoro wụwa mgbọ.
Ọsọ bara ndị niile nọ nso ebe ahụ ụkwụ.
Na ọnọdụ atụm voot dị n' 'Adankolo Primary school' ndị amaghị ndị ha bụ wakporo bụkọọ akọrọngwa e ji atụ vootu, dịka ndị ntakụkọ nọ ebe akụ siri kọwaa.
Nkọwa foto, Ebe ndị agboro kpara ike na Kogi
Izu vootu, wuruwuru karịrị na ntuliaka Kogi- CDD
Otu na abụghị nke gọọmenti a kpọrọ 'Centre for Democracy and Development' (CDD) etiela mkpu maka ihe ha kpọrọ 'oke wuruwuru; ịnapụ igbe vootu n'ike, tigbuo-zọgbuo mere n'ọtụtụ ọnọdụ atụm vootu.
CDD kwupụtara nke a oge ha na-agwa ndị ntaakụkọ okwu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 2
Bayelsa: Ihe na-aga nke ọma n'Ogbia mana...
Nwachukwu Orji, onyeisi Inec n' Anambra steeti ma bụrụkwa onye ọrụ Inec na-elekọta ọkpuru ọchịchị Ogbia gwara BBC na atụmvootu na-aga ọfụma n'okpuru ọchịchị ahụ mana na mpaghara obodo Ologi, ndị obodo jụrụ ka e me ntuliaka, ha kpokọtara akọrọngwa ntuliaka gbaa ya ọkụ ka a ghara ime ntuliaka ebe ahụ..
Natasha mechara tụọ vootu
Anyị wetara ụnụ akụkọ na Natasha Akpoti bụ bụ onye ji aha Social Democratic Party (SDP) azọ ọkwa gọvanọ na ntụliaka a na-eme na Kogi gosiri ụjọ ya isonye tụọ vootu.
Mana ugbua, ọ tụọla vootu.
Ebe foto si, bbc
Ebe foto si, bbc
Tigbuo-zogbuo adapụtala n'ọnọdụ atụmvootu Dino
Ọgbaghara dapụtara n'ọnọdụ atumvootu Senetọ Dino Melaye bụ Ayetoro ward 1 unit 004 ka o ruchaghị ọkara awa o jiri tụchaa vootu. .
Ndị agboro bu ụgbọala atọ; Hilux abụọ na otu Honda Civic dabatara,bidoro gbawa egbe aghara aghara.
Ha buru igbe vootu gbalaga,ebe ụmụ ntorobia obodo ahụ bidoro chụwa ha ọsọ mana ha enwetanwughị ha.
Egbe tụrụ otu onye a kpọrọ 'Dami' n'ụkwụ e bugaa ya ụlọọgwụ.
Ebe foto si, Gold Rahman
Akụkọ ka na-abịa.
Ihe ndapụta ebe ị na-atụ vootu na Kogi steeti, kpọọ akara ekwentị ndị a
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu n'elu soshal midia
Ndị Naịjirịa tinyere ọnụ n'okwu ntuliaka a na-eme na Kogi steeti site n'iji #KogiDecides2019