You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Bayelsa-Kogi Governorship Elections: Yahaya Bello emeriela na Kogi

APC meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ na Beyelsa na Kogi dịka a ga-emegharị nke Dino Melaye na Smart Adeyemi.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa, Chioma Obianinwa, Jessica Nwankwo and Chiagozie Nwonwu

  1. Ụmụnwaanyị Kogi anaghị achị

    A ga-akpọ nke a ịgụpụta 'list' e ji aga ahịa ka ọ bụ nke a na-edegara ndị ọchịchị.

    Ọ bụghị naanị na ụmụnwaanyị Kogi pụtara n'igwe ịtụ voootu, ha kwupụtara ihe ha na-achọ n'aka onye ga-ewere ọkwa gọvanọ.

    Chọpụta ihe na-akpa ụmụnwaanyị Kogi ugbua.

  2. Yahaya Bello atụọla vootu

    Ka a jụrụ ya ma ọ ga-anabata mpụtara ntuliaka oge ọ gara ịtụ vootu, Gọvanọ Yahaya Bello nke Kogi steeti gwara ndị ntaakụkọ oge na ọ bụ ya ga-enwe mmerị na ntuliaka.

  3. Goodluck Jonathan atụọla vootu

    Onye bụbu onyeisiala Naijiria bụ Goodluck Jonathan arịọla ndị Bayelsa na Kogi ka ha kwere ka udo chia na ntuliaka na-aga, iji were họpụta nezigbo ndị ndu.

    Ọ tụrụ arịrị na natụmvootu ebidoghị n' Elekere asatọ dịka o kwesịrị.

    gee ihe o kwuru n'uju:

  4. Musa Wada atụọla vootu

    Onye ji aha PDP azọ ọkwa gọvanọ na ntuliaka na-eme na Kogi ugbua bụ Musa Wada atụọla vootu ya.

  5. Agụ nwaanyị Natasha eseela ihu

    Natasha Akpọtị bụ onye ji aha Social Democratic Party (SDP) azọ ọkwa gọvanọ na ntụliaka a na-eme na Kogi ka nọ n'ime be ya maka ụjọ.

    Onye ntaakụkọ BBC nọ na be ya ugbua kwuru na ndị agboro gara tie onye nnọchịte anya pati ya ihe na wọọdụ ebe ọ kwesịrị ịga atụ vootu.

    N'ọnụ ya, "ndị otu m gwara m na-eji mgbaka nwere ọtụmọkpọ kụọ ndị otu m, mere ka ha daa enwetaghị onwe ha."

  6. APC boro PDP ebubo nrụrụaka ịzụ vootu

  7. PDP na onwe ha ebokwasịkwala APC nke ha, Ha na-ekwu na pati APC ji ndị uweojii amaja ndị mmadụ pụtara ịtụ vootu na Kogi steeti

    Ha kwukwara na enwere ebe ndị igwe e ji atụ vootu anaghị arụ ọrụ.

  8. Dino Melaye awụchiela!

    Nwoke ụwa kpụ n'ọnụ mgbe ọbụla ma bụrụkwa onye zọrọ ọkwa ịnọchite anya ndị Kogi West bụ Dino Melaye, apụtala ịtụ vootu nke ya.

    Cheta na o depụtara n'akara Twitter ya na ndị pati APC na-achọ ime nrụrụaka na ntụliaka a na-eme ugbua.

  9. Ụmụnwaanyị agbaghị 'last' na ntụliaka a

    Ihe anyị hụrụ bụ na ụmụnwaanyị pụtara n'igwe ịtụ vootu ha na ntụliaka na-eme na Kogi ugbua.

  10. Sọsọ ndị mmụọ na-aga n'ụzọ Bayelsa, Dịka a na-eche imalite ntuliaka na Bayelsa steeti, ụzọ niile dị na Yenegoa tọgbọ chakoo ugbua.

  11. Gọvanọ Yahaya Bello atụọla vootu

    Gọvanọ na-achị Kogi steeti na nwunye ya atụọla vootu na unit 11 Okene Eba Agasa na Ahache ward dị n 'Okene local government area.

  12. A na-eke ego n'Okene?

    Itụ vootu amalitela na wọọdụ nke mbụ dị na 'unity 033'.

    Onye ntaakụkọ BBC chọpụtara na ọ bụ sọsọ onye nnọchiteanya pati 'All progressives Congress' (APC) nọ na-enyocha ka ihe si aga.

    Ọ chọpụtara na a na-eke ego mana ọ maghị ego ole ọ bụ.

  13. Lee etu a ga-esi mee ntuliaka nke taa

    Ụlọọrụ Inec ewepụtala etu ntuliaka nke taa ga-esi aga na steeti abụọ a.

    Ha kọwara ihe ndị mmadụ ga-eme ma ha garuo ebe a na-eme ntuliaka na wọọdụ ha.

  14. A ka na-eche ndị ọrụ Inec

    Elekere asatọ akụọla agafeela mana a ka na-eche ndị ọrụ Inec n'ebe ụfọdụ a na-atụ vote na Lokoja.

  15. Gere akụkọ ka o si aga na mbaụwa taa n'otu nkeji

  16. Ụfọdụ ihe ị kwesiri ịma maka ntụliaka a

    Na Kogi Steeti, pati iri abụọ na atọ ga-eso zọọ ọkwa gọvanọ na ntuliaka 2019, mana ọ dịka ndị mmadụ na-ahụta naanị pati abụọ APC (Yahaya Bello) na PDP (Musa Wada) dịka ndị kachasị gbapụta ihe.

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu na Bayelsa dị 867,088 ebe 769,609 anatala kaadị vootu ha nke pụtara pasentị 83.35 dịka ụlọọrụ Inec si kwuo.

  17. Ụnụ asaala chi eeh!

    Egbe bere, ugo beere, nke si ibe ya ebena, gịnị ga-eme ya?

    Ọ bụ ilu a ka BBC Igbo ji anabata ụnụ n'ụtụtụ a dịka anyị ga ewetara ụnụ ka o si aga na ntuliaka Bayelsa nakwa Kogi steeti.

  18. Ndị bu egbe wakporo ebe Gọv Makinde na-enwe ọgbakọ

    Na Kogi steeti, tigbuo-zogbuo ka na-aga n'ihu dịka ndị bu egbe wakporo ụlọ oriri na nkwari ebe gọvanọ Oyo steeti bụ Seyi Makinde na ndị otu PDP na-enwekwe ọgbakọ.

    Kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Hakeem Busari gwara BBC na ha nwetara ozi na ahụ mana oge ha gara ebe ahụ ileta ihe mere ọ bụụ na ọ bụ ụgha.

  19. Inec,ndi uweojii Bayelsa adịla njikere maka echi

    Akọrọngwa a ga-eji rụọ ọrụ ntuliaka erutela ụlọakụ etiti nke dị na Yenagoa na Bayelsa steeti ebe e si na-ekesa ya.

    Ndị ọrụ ngo Inec agawala mpaghara dị iche iche na Bayelsa steeti.

  20. Inec ebidola ikesa akọrọngwa ntuliaka na Kogi

    Ka ọdị ugbua, Inec ebidola ike akọọngwa a ga-eji mee ntuliaka echi bụ Satodee.

    A na-atụ anya na otu nde mmadụ na ụwa ga-eso tụọ vootu ahụ.