You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Bayelsa-Kogi Governorship Elections: Yahaya Bello emeriela na Kogi

APC meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ na Beyelsa na Kogi dịka a ga-emegharị nke Dino Melaye na Smart Adeyemi.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa, Chioma Obianinwa, Jessica Nwankwo and Chiagozie Nwonwu

  1. Ọnụ ọgụgụ vootu gọvanọ si okpuru ọchịchị Omala, Kogi steeti

    Dịka Inec si gupụta etu vootu si kwụru n'okpuru ọchịchị Omala: APC 8473, PDP 14403, SDP 567

    Ọgbaghara butere nkagbụ vootu na okpuru ọchịchị ime obodo ahụ, nke metụtara "polling unit" ise. Ebe ometutara bụ Akpata, Ogbodu, okpatala na Odiaje.

  2. Ọnụ ọgụgụ vootu gọvanọ si okpuru ọchịchị Ijumu Kogi steeti

    Dịka Inec siri kwuo, lee etu ọkwụrụ n'Ijumu LGA: APC 11425 PDP 7587, SDP 223

    Onye nchịkọ vootu n'Ijumu kwuru na ọgbaghara kposara ntuliaka dịka amalitere ịgba egbe nke mere na ndị mmadụ gbara ọsọ.

    O kwukwara na akagbụrụ ntuliaka na ebe ụfọdụ maka ejighi akụrụmgwa "card reader" mee ntuliaka.

  3. Ọnụ ọgụgụ vootu gọvanọ si okpuru ọchịchị Agorijmagongo, Kogi steeti

    Dịka Inec si gụpụta etu a ka o si kwụrụ n'Agorijmagongo: APC 3679. PDP, 2145, SDP 244

  4. A kpọpụtawala mpụtara ntuliaka na Kogi steeti, Lee ya ebe a.

  5. Mpụtara sị na ntuliaka emegharịrị n'ogo ụlọomeiwu ukwu Kogi

    Mpụtara e sila n'okpuruọchịchị ruru ise bata maka ntuliaka emegharịrị n'ogo ụlọomeiwu ukwu nke Dino Melaye(PDP) na Smart AdeyemI(APC) zọrọ.

    A ka na-eche abụọ ka ewe kpọputa aha onye meriri n'etiti ha abụọ.

    Lee mpụtara ndị a ebe:

    Kabba/Bunu LGA

    APC: 15,037 PDP: 8,974

    Ijumu LGA

    APC: 11,627 PDP: 7647

    Kogi Koton-Karfe

    APC: 14,168 PDP: 9,786

    Mopa Muro

    APC: 4,874 PDP: 3,704

    Yagba East

    APC: 6,683 PDP: 7,745

  6. Inec achịkọtawala mpụtara ntuliaka na Kogi

    Ntụliaka abanyela ogo ọzọ dịka ndị ọrụ Inec na-ewekọta vootu ndị atụkọtara site n'okpuruọchịchị dị iche iche na steeti Kogi.

  7. Nnọọ nụ n'ụbọchị abụọ!

    Anyị ga-ewetara ụnụ mputara ntuliaka e mere na Kogi nakwa Bayelsa steeti n'ụbọchị satọde.

    Gwunye nu na websait anyị ịnweta akụkọ ka o si apụta na tebulu Independent National Electoral Commission(INEC)

  8. Chee aka ghọrọ anyị echi

    Akụkọ ka na-abịa!

    Ka chi fo!

  9. Anyị na-elebanye anya n'akụkọ tigbu-zogbuo mere- Inec

    Inec ekwuola na ha na-elebanye anya n'akụkọ tigbuo-zọgbuo jupụtara na ntuliaka e mere na Kogi na Bayelsa steeti taa bụ Satọde.

    Festus Okoye bụ ọnụ na-ekwuru Inec kwupụtara nke n'akwụkwọ mgbasaozi o binyere aka ya, kwuru na

    "N'agbanyeghị mbo niile anyị gbara na nkwa udo ndị ndọrọndọrọ ọchịchị kwere, tigbuo-zogbuo mere n'ọtụtụ ebe."

    Ọ gara n'ihu gbaa ama na e mechaala ntuliaka na ebe niile na steeti ahụ, ebe ngụkọ na nchịkọta mpụtara na-aga n'ihu.

  10. Ụzụ atụọla na Kogi maka ogbugbu mmadụ atọ

    Ụmụnwaanyị na-ebe akwa anyammiri dịka ndị uweojii adịgboroja dabatara n'Adankolo ebe a na-atụ vootu gbagbuo mmadụ atọ.

    Ha bukwara igbe vootu gbalaga.

    Nke a mere ka ndị uweojii na-eche ebe ahụ hapụrụ.

    Onye ntaakụkọ BBC nọ ebe ahụ enwughị ike iseta foto ihe na-aga ebe ahụ dịka ọbị ọkụ dị ndị mmadụ maka nnukwu ọdachị ahụ.

  11. Bayelsa: Atụm vootu ebidoghị n'oge n' ebe ụfọdụ

    N'ọnọdụ atụmvootu dị na 'Community Primary School Edepie Ward 5 unit 17, akọrọngwa atụmvootu abịaghị n'oge.

    Nke a mere ka a ghara bido atụmvootu n'oge.

    Ndị ọrụ ngo Inec gwara BBC na ọ bụ n'ihe egbe a na-agba mere ha ji cheretụ ka ihe jụọ oyii nke mere ka ha bido ihe dịka elekere iri na otu.

    Onyeisi nkuzi na mgbasaozi Inec na Bayelsa bụ Wilfred Ifogah kọwara na atụmvootu kwesịrị ibido n'Elekere asatọ rue Elekere abụọ n'agbanyeghị oge ha bidoro, mana ọ bụụ na o nwere ndị mmadụ kwụ n'ahịrị n'Elekere abụọ, a ga-enye ha ohere ịtụ vootu.

  12. , Govanọ Dickson atụọla vootu ya

    Aka na-achị Bayelsa steeti bụ Seriake Dickson a tụọla vootu ya na wọọdụ ya bụ Toru Orua dị na okpuru ọchịchị Sagbama LGA. Photo credit Bayelsa State Government House Press

  13. A tọrọ ndị ọrụ anyị na Dekina - Kọmịshọna Inec Kogi

    Onyeisi Inec na Kogi steeti bụ Prof. Iorliam Apam ekwuola n'ezie na e nwere ebe a napụchara igbe vootu a tụụ atụ.

    Ọ gbara ama na a tọrọ ndị ọrụ Inec e zigara okpuru ọchịchị Dekina, mechaa tọhapụ ha mana a nara ha akọrọngwa ntuliaka

  14. Ndị agboro akpaala ike na Madobo, Fentolu,Lokoja Club na Adankolo

    N'ọnọdụ atụm vootu dị na Madabo, Lokoja, ndị agboro wụchiri buru igbe vootu a tụrụ atụ kpụsasịa.

    Ndị agboro bu ụgbọala 'Hilux wuchiri ọgbọ atụm vootu dị na 'Fentolu' were egbe na anwụrụ anyammiri chụsasịa ndị mmadụ.

    Oke n'ọsọ, ngwere n'ụzọ. Ndị uweojii n'onwe ha gbara ọsọ ndụ, ka o suru.

    Ọzọ dịka ya mere na 'Lokoja Club' ebe ụgbọala Hilux dị asaa nke ndị uweojii wuchuru n'ime ya bidoro wụwa mgbọ.

    Ọsọ bara ndị niile nọ nso ebe ahụ ụkwụ.

    Na ọnọdụ atụm voot dị n' 'Adankolo Primary school' ndị amaghị ndị ha bụ wakporo bụkọọ akọrọngwa e ji atụ vootu, dịka ndị ntakụkọ nọ ebe akụ siri kọwaa.

  15. Izu vootu, wuruwuru karịrị na ntuliaka Kogi- CDD

    Otu na abụghị nke gọọmenti a kpọrọ 'Centre for Democracy and Development' (CDD) etiela mkpu maka ihe ha kpọrọ 'oke wuruwuru; ịnapụ igbe vootu n'ike, tigbuo-zọgbuo mere n'ọtụtụ ọnọdụ atụm vootu.

    CDD kwupụtara nke a oge ha na-agwa ndị ntaakụkọ okwu.

  16. Bayelsa: Ihe na-aga nke ọma n'Ogbia mana...

    Nwachukwu Orji, onyeisi Inec n' Anambra steeti ma bụrụkwa onye ọrụ Inec na-elekọta ọkpuru ọchịchị Ogbia gwara BBC na atụmvootu na-aga ọfụma n'okpuru ọchịchị ahụ mana na mpaghara obodo Ologi, ndị obodo jụrụ ka e me ntuliaka, ha kpokọtara akọrọngwa ntuliaka gbaa ya ọkụ ka a ghara ime ntuliaka ebe ahụ..

  17. Natasha mechara tụọ vootu

    Anyị wetara ụnụ akụkọ na Natasha Akpoti bụ bụ onye ji aha Social Democratic Party (SDP) azọ ọkwa gọvanọ na ntụliaka a na-eme na Kogi gosiri ụjọ ya isonye tụọ vootu.

    Mana ugbua, ọ tụọla vootu.

  18. Tigbuo-zogbuo adapụtala n'ọnọdụ atụmvootu Dino

    Ọgbaghara dapụtara n'ọnọdụ atumvootu Senetọ Dino Melaye bụ Ayetoro ward 1 unit 004 ka o ruchaghị ọkara awa o jiri tụchaa vootu. .

    Ndị agboro bu ụgbọala atọ; Hilux abụọ na otu Honda Civic dabatara,bidoro gbawa egbe aghara aghara.

    Ha buru igbe vootu gbalaga,ebe ụmụ ntorobia obodo ahụ bidoro chụwa ha ọsọ mana ha enwetanwughị ha.

    Egbe tụrụ otu onye a kpọrọ 'Dami' n'ụkwụ e bugaa ya ụlọọgwụ.

    Akụkọ ka na-abịa.

  19. Ihe ndapụta ebe ị na-atụ vootu na Kogi steeti, kpọọ akara ekwentị ndị a

  20. Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu n'elu soshal midia

    Ndị Naịjirịa tinyere ọnụ n'okwu ntuliaka a na-eme na Kogi steeti site n'iji #KogiDecides2019

    Lee ihe ụfọdụ n'ime ha na-ekwu: