Xenophobic attacks : Anyị na-ekwusi ya ike, o zuola bụ na o zuola- Gọọmenti Naijiria
Goomenti etiti ekwuola kwụsị ike na ha agaghị anabata ọzọ agwa Saụt Afrịka na-akpasa ụmụ Naijiria dịka o siri gbasa ọgbaghara 'xenophobia.'
Mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme na mba dị ọzọ bụ Geofrey Onyeama bụ onye kwupụtara nke a n' ozi ọ gbasara n'igwe okwu Facebook nke Asọ Rọck Villa, sị na " O zuola bụ na o zuola."
'O nweghị onye Naijiria e gburu'
Onyeama gara n'ihu kwuo sị na dịka ozi si n'aka ndị ọchịchị mba Saụt Afrịka, o nweghị onye Naijiria nwụrụ na ọgbaghara xenophia mere na mba ahụ nsonso.
O kwukwara na gọvernment Naijiria na nke mba Saụt Afrịka na-akpa nkata maka idozi okwu ahụ
Ọ dọrọ ụmụ Naijria aka na ndị ka ha kwụsị imebi ụlọahịa na ngwa ahịa ndị Saut Afrịka dị na Naijria dịka Shoprite na MTN.
Na nkọwa ya, Onyeama kwuru na ụlọọrụ ndị a nwere ụlọọrụ Naijiria sị na aka ha eri.
Ihe Naijiria chọburu n'aka Saụt Afrịka
Cheta na gọọmenti Naijira kwuburi na ihe ha chọrọ n'aka mba Saut Afrịka maka mwakpo 'xenophobia gụnyere:
1. Ka ha kwụọ ndị o metụtara maọbụ ezinaụlọ ha ego iti aka n'obi
2. Nye ha ikpemkwụmọtọ site kpụpụ ndị kpara mkpamkpa ahụ ụlọikpe kpe ka e kpee ha ikpe
3. Katọọ agwa ndị ọrụ nchekwa mba Saụt Afrịka maka ịgba nkịtị ihe na-emebi