Etu ngagharịiwe si aga na Surulere Legọs Steeti
Ọtụtụ ndị mmadụ pụtara ka ha mee ngagharịiwe na Surulere Legọs Steeti, mana ndị uweojii ekweghi ha kpaa ezigbo ike.
Ha nwụchiri ọtụtụ n'ime ha.
You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ mwakpo ndị Nigeria na mba South Africa ka abụ okwu a kpụ n'ọnụ abalị nke abụọ ụmụ Naijiria bọchara ọbọ n'ụlọrụ ndị South Africa.
Chukwunaeme Obiejesi, Chigozie Ohaka and Uche Akolisa
Ọtụtụ ndị mmadụ pụtara ka ha mee ngagharịiwe na Surulere Legọs Steeti, mana ndị uweojii ekweghi ha kpaa ezigbo ike.
Ha nwụchiri ọtụtụ n'ime ha.
Ndị na-eme ngagharịiwe wakporo ọdọ ahịa PEP dị na Surulere, Legọs Steeti.
Ha kwatusịrị ma zuo ọtụtụ ngwaahịa dị n'ime ọdọ ahịa ahụ, tupu ndị uweojii abịa nwụchie ụfọdụ n'ime ha.
Akụkọ si Abuja na-ekwu na ndị uweojii nọ ebe ahụ agbaala ndị na-eme ngagharịiwe na Lugbe anwụrụ anyammiri.
Ha kwuru na ndị a chọrọ ịgba ọdọ ahịa Shoprite dị n'akụkụ ahu ọkụ.
Onyeisi ndị uweojii na mpaghara Gauteng bụ Lungelo Dlamini ekwuola na ọ bụ akụkọ ụgha na-akpanye ọkụ n'okwu mwakpo na-eme na mba ahụ.
Mana o kwuru na ya na ndị otu ya na-arịọ ka ndị mmadụ leghara akụkọ ụgha na-efegharị n'elu soshal mịdịa anya.
Dlamini kwuru na ha anwụchiela mmadụ ruru narị abụọ ,iri asatọ na itoolu aka ha dị na mkpa mkpa a.
Mịnịsta na-ahụ maka ụlọọrụ onyeisiala mba South Afịrịka bụ Jackson Mthembu ekwuola na ebe niile e derela jụụ gbasara mwakpo na-eme na mba ahụ.
O kwukwara na ndị uweojii nọkwa na anwụchị ndị na-akpa mkpa mkpa a.
N'ime ụbọchị ole gara aga, ndị ngagharịiwe malitere ọgbaaghara na Johannesburg bụ isi obodo azụmaahịa mba Saụt Afrịka, mebisie ụgbọala ma na-ezụ ngwaahịa nke ndị mbịambịa nwe.
Ndị ọrụ gọọmentị mba Saụt Afịrịka na-ekwu na ọ bụ ndị ohi na ọ bụghị mwakpo ịkpaoke agbụrụ.
Agbanyeghi nke a, gọọmentị Naịjirịa akpọọla onye na-anọchite anya Saụt Afrịka na Naịjirịa, kwuo na ọ bụ azụmaahịa ụmụafọ Naịjirịa ka ha na-awakpo. Kedụ etu mwakpo ndị mbịarambịa si malite nakwa etu o si akawanwe njọọ?
Akụkọ na ihe onyonyo na-eru anyị aka na-egosi na e mechiela ọdọ ahịa Shoprite dị n'Abuja na Ikeja.
Ebe ndị uweojii gbara ha okirikiri maka nchekwa.
Ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa a ma ama akatọọla ọgbaaghara a na-eme na Saụt Afrịka.
Gọọmentị etiti Naịjirịa akpọkuola ndị Naịjirịa ka ha ghara ịwakpo ọdọ ahịa ndị mba Saụt Afịrịka n'ihi ịbọ ọbo mwakpo na-eme na mba ahụ.
Minista na-ahụ maka mgbasaozi na omenala bụ Laị Mohamed kwuru nke a ka ọ na-etinye ọnụ na akụkọ na ụfọdụ ndị Naịjirịa amalitela ịbọ ọbọ.
Onyeisi otu jịkọtara mba Afrịka (AU) bụ Moussa Faki Mahamat akatọọla etu ndị Saụt Afrịka si awakpo ndị mba ọzọ.
Mahamat kwuru na obi dị ya ụtọ etu ndị uweojii mba Saụt Afịrịka si nwuchie ụfọdụ ndị ha na-eche na aka ha dị na mwakpo a.
Ọ gakwara n'ihu na-arịọ ka ndị gọọmenti ihe a metụtara ndị nke ha gba mbọ hụ na ha nwetere ha ikpe nkụmọtọ ma chekwa ndụ ha na akụ na ụba ha.
Tiwa Savage bụ oti egwu ama ama na Naịjirịa ekwuola na ọ gaghị aga iti egwu ọ kabuuru iti na Johannesburg, Saụt Afrika maka agwa ọjọọ ndị mba ahụ na-akpasa ndị Nịajirịa. O depụtara nke a n'elu akara Twitter ya.
Ihe a bidoro dịka ngagharịiwe nke gara na-enweghị nsogbu ọbụla na Shoprite, Ikeja, Legọs, ghọrọ tigbuo-zogbuo mgbe ihe yiri ya mere na Shoprite dị n'Ọsapa/Jakande, Legọs ụbọchị Tuzde.
Ndị ntorobia banyere n'ime Shoprite dị na Jakande were iwe na-akwatu ngwaahịa nọ n'ogogo ebe ahụ, ebe ndị ntorobịa ji okwute na mma obejiri wakporo ụlọahịa ahụ na-ekwu na ha na-achọ ụmụ Saụt Afrịka ka ha megwara ihe e mere ndị Naịjirịa na mba ha.
Ụnụ asaala chị eeh! Anyị na-ewetere ụnụ ọtụtụ ihe na-apụta gbasara mwakpo ikpaoke agbụrụ na-eme na South Afịrịka ugbua.