Xenophobic Attack: Anyị na-ekwusi ya ike, o zuola bụ na o zuola- Gọọmenti Naijiria

Akụkọ mwakpo ndị Nigeria na mba South Africa ka abụ okwu a kpụ n'ọnụ abalị nke abụọ ụmụ Naijiria bọchara ọbọ n'ụlọrụ ndị South Africa.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chukwunaeme Obiejesi, Chigozie Ohaka and Uche Akolisa

  1. Xenophobic attacks : Anyị na-ekwusi ya ike, o zuola bụ na o zuola- Gọọmenti Naijiria

    Geofrey Onyeama

    Ebe foto si, Aso Rock Villa/Facebook

    Goomenti etiti ekwuola kwụsị ike na ha agaghị anabata ọzọ agwa Saụt Afrịka na-akpasa ụmụ Naijiria dịka o siri gbasa ọgbaghara 'xenophobia.'

    Mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme na mba dị ọzọ bụ Geofrey Onyeama bụ onye kwupụtara nke a n' ozi ọ gbasara n'igwe okwu Facebook nke Asọ Rọck Villa, sị na " O zuola bụ na o zuola."

    'O nweghị onye Naijiria e gburu'

    Onyeama gara n'ihu kwuo sị na dịka ozi si n'aka ndị ọchịchị mba Saụt Afrịka, o nweghị onye Naijiria nwụrụ na ọgbaghara xenophia mere na mba ahụ nsonso.

    O kwukwara na gọvernment Naijiria na nke mba Saụt Afrịka na-akpa nkata maka idozi okwu ahụ

    Ọ dọrọ ụmụ Naijria aka na ndị ka ha kwụsị imebi ụlọahịa na ngwa ahịa ndị Saut Afrịka dị na Naijria dịka Shoprite na MTN.

    Na nkọwa ya, Onyeama kwuru na ụlọọrụ ndị a nwere ụlọọrụ Naijiria sị na aka ha eri.

    Ihe Naijiria chọburu n'aka Saụt Afrịka

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Cheta na gọọmenti Naijira kwuburi na ihe ha chọrọ n'aka mba Saut Afrịka maka mwakpo 'xenophobia gụnyere:

    1. Ka ha kwụọ ndị o metụtara maọbụ ezinaụlọ ha ego iti aka n'obi

    2. Nye ha ikpemkwụmọtọ site kpụpụ ndị kpara mkpamkpa ahụ ụlọikpe kpe ka e kpee ha ikpe

    3. Katọọ agwa ndị ọrụ nchekwa mba Saụt Afrịka maka ịgba nkịtị ihe na-emebi

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  2. 'O nweghị ebe anyi na-aga ebe niile ajụọla oyi' - Ụfọdu ụmụ Igbo nọ Saụt Afrịka

    BBC gbara ụfọdụ ụmụafọ Igbo bi na Saụt Afrịka ajụjụ ọnụ maka nkpọlata nke gọọmenti etiti na ụlọọrụ Airpeace na-akwadoro ha site n'iwepụta ụgbọelu ga-ebulata ndị chọrọ ịlọta.

    Aha onyonyo, South Africa Killing: Onweghi ebe anyi na-aga ebe niile ajụọla oyi
  3. Ụgbọelu mba Tanzania akagbuola ịga Saụt Afrịka

    Ụlọọrụ ụgbọelu nke mba Tanzania a kpọrọ Air Tanzania, amachiela ụgbọelu ha niile ifeba na Saụt Afrịka n'ihi mwakpo xenophobia.

    Nke a na-eme dịka mba Saụt Afrịka tọhapụrụ otu ụgbọelu "Air Tanzania" ha nwụchiburu.

    Onye ntaakụkọ BBC bụ Peter Okwoche depụtara nke a na akara Twitter ya n'ehihie Tọọzde.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  4. Mba Madagaska esepụla onwe ha n'asọmụmpi egwu bọọlụ ha na mba Saụt Afrịka

    Otu egwu bọọlụ nke Saut Afrịka bụ Bafana Bafana ekwuola na asọmụmpị ha na ndị mba Madagaska agaghị enwe isi ọzọ.

    Ndị Bafana Bafana hibere asọmpị ha na Madagaska dịka nke ha na ndị mba Zambia nyụru okụ mgbe Zambia wepuru onwe ha maka okeagbụrụ a na-akpa na Saụt Afrịka

    Ka ọ dị ugbua, Madagaska sepụru onwe na ya bụ asọmụmpị

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  5. Ndị Naijiria gara WEF kwesịrị ịga Germany iri ji ọhụrụ - Fani-Kayode

    Femi Fani-Kayode

    Ebe foto si, @RealFFK

    Onye bụbụ Mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Femi Fani-Kayode etoola gọọmenti etiti maka igba abụbụ hapụ ịga ọgbakọ 'World Economic Forum.'

    Fani Kayode, onye kwụpụtara obi ụtọ ya maka nzopụ ụkwụ gọọmenti etiti n'okwu kwuru na ndị Naijria kpọrọ ekwo nkụ gaa mba Saụt Afrịka kwesịrị ka eziga ha Nuremberg, Germany maka mmemme iri iji ọhụrụ.

    N'uche ya, ndị mere nke a n'akwaụmụ Naijiria akwafuru ọbara ha na Saụt Afrịka emo.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  6. Ngagharịiwe amalitela na obodo Kinshasa

    Ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe n'obodo Kịnshasha

    Ndị mba Congo amalitela ngagharịiwe n'isiobodo ha bụ Kịnshasa iji gosipụta obi ọjọọ ha nwere gbasara ọgbaaghara dị na mba Saụt Afrịka.

    Ha bucha akwụkwọ e dere ihe dị iche iche dịka "anyị niile bụcha ndị Afrịka", "Anyị agaghị akwado xenophobia" dgz.

    Ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe n'obodo Kịnshasha
  7. Jim Ovia eserela isi ya na WEF

    Jim Ovia

    Ebe foto si, @jimoviafoundatn

    Jim Ovia, onyeisioche Zenith Bank Group, eserela aka na ụkwụ ya n'ọgbakọ 'World Economic Forum' nke na-aga n'ihu ugbua na Saụt Afrịka.

    Ovia so na ndị isioche WEF nke afọ a mana o sepụrụ ụkwụ n'abalị nke abụọ nke ọgbakọ ahụ bidoro ụbọchị Tuzde sị na ọ bu iji gosi obi adịghị mma maka ihe ndị Saut Afrịka mere ụmụ Naijiria bi n'ala ha.

    Nzọpụ ụkwụ Ovia na-abịa dịka ụmụ Naijiria katọrọ ndị Naijiria nwere agba dịka Oby Ezekwesili, Kayode Fayemi, Sanusi Lamido Sanusi nakwa El-Rufai maka ịga Saụt Afrịka dịka okwu ọgbụgbụ ndị Naijiria na mba ahụ na-akpọtụ.

    Nke bụ na agbanyeghị na ọ bụghị WEF bugara ụfọdụ n'ime ha Saụt Afrịka dịka ha siri kọwaa.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  8. El-Rufai na Sanusi agara Saụt Afrịka?

    Dịka ndị mmadụ kpụ Ezekwesili n'ọnụ maka njem ya na Saụt Afịrịka, ndị ọzọ na-ekwukwa maka gọvanọ Kaduna bụ Nasir El-Rufai, Eze Sanusi na Kayode Fayemi bụ gọvanọ Ekiti.

    Ha na-ekwu na El-Rufai, Sanusi nakwa Fayem kwesịrị ịgba abụbụ hapụ ịga Saut Afrịka dịka gọọmentị etiti siri mee.

    Mana, onye ntaakụkọ ama ama bụ Kadaria Ahmed kọwara na ọbụghị ọgbakọ nke ngalaba "World Economic Forum" (WEF) ka ha gara.

    El Rufai na ndị ọzọ ha na ya so n'ọgbakọ 'African World'.

    Ebe foto si, @africainworld

    Nkọwa foto, El Rufai n'ọgbakọ 'African World' na Saụt Afrịka
    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Fayemi na ndị ọzọ ha na ya so n'ọgbakọ 'AfricainWorld'.

    Ebe foto si, @africainworld

    Nkọwa foto, Kayode Fayemi n'ọgbakọ 'AfricainWorld' na Saụt Afrịka
    Eze Sanusi n'ọgbakọ 'AfricainWorld'.

    Ebe foto si, @africainworld

    Nkọwa foto, Eze Sanusi n'ọgbakọ 'AfricainWorld' na Saụt Afrịka

    Cheta na Bashir Ahmad, onye nnyemaka pụrụ iche nke onyeisiala Muhammadu Buhari katọburu Oby Ezekwesili maka ịga WEF.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  9. Air Peace wepụtara ụgbụọelụ maka nlọta

    Dịka ịkpaoke agbụrụ nke Saụt Afrịka na-aga n'ihu, Ụlọọrụ ụgbọelụ Airpeace ekwụọla na ha ga-eweputa ụgbọelụ maka ndị Naịjirịa niile chọrọ ịlọta. N'akwụkwọ o degara Minista na ahụ maka mekọrịta ndị mba ọzọ bụ Geoffrey Onyema, onyeisi ọrụ Airpeace bụ Oluwatoyin Olajide kwụrụ na agaghị agba nkiti ka ya bụ ewụ mụọ n'ọgbụ.

    Ndị gbara ama a bụ ngalaba na-ahụ maka mmekọ Naịjirịa na mba ndị ọzọ n'akara Twitter ha.

    Ha gosikwara usoro a ga-eji mee ya bụ ihe.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Ụgbọelu Air Peace di ọdọ Ụgbọelu MMIA

    Ebe foto si, @flyairpeace

  10. Igbo ndị ọma, ụnụ asaala chi?, Anyị ka na-ewetere ụnụ akụkọ maka ọgbaaghara metụtara oke agbụrụ na Saụt Afịrịka. Lekwa etu o si kwụru taa.

  11. Ka chi foo, Ụmụ Igbo ndị ọma

    Igbo bụ Igbo, ebe ka anyị ga-apịachi nke taa.

    Ụbọchị nta, a chụọ n'owere nchi.

  12. Ndị uweojii anwụchiela mmadụ 125 maka izu ahịa n'ọdọahịa ndị Saụt Afrịka

    Adamu Mohammed

    Ebe foto si, NPF

    Ndị uweojii Naijiria kwuru na ha anwụchiela mmadụ 125 maka ịda ngwahịa ndịụ Saụt Afrịka ụbụ ma napụtakwa ụfọdụ ihe ndị ba buuru.

    Nke a na-eme dịka onyeisi ndị uweojii bụ Adamu Mohammed nyere ndị ọrụ ya iwu ka ha chekwaa ụlọahịa, ụlọọrụ nakwa ụlọ nnọchiteanya mba ndị ọzọ dị na Naijiria.

    O kwukwara na e mereụrụ ndị uweojii atọ ahụ ma gbakwa otu ụgbọala ndị uweojii ọkụ na mere na Legọs n'ablị atọ nke ọnwa sseptambe o ge ndị mmadụ ji iwe wakpọ ọdọahịa Shoprite dị na mpaghara Lekki dị na Legọs.

  13. Ụmụ Naijiria ji ogbo na ncha saa Ezekwesili ahụ maka ịga WEF

    Oby Ezekwesili

    Ebe foto si, @oby_ezeks

    Ụmụ Naijiria ezisala onye bụbụ Mịnịsta na-ahụ maka agụmakwụkọ bụ Oby Ezekwesili maka isonye na ọgbakọ nkwalite akụnaụba ụwa a kpọrọ World Economic Forum.'

    Ha na-ekwu na Ezekwesili kara ahapụ isonye na ọgbakọ ahụ malitere na Cape Town ụbọchị Wenezde iji gosi mgbarụ ihu n'ogbugbu ụmụ Naijiria na mmebi ngwaahịa na Saụt Afrịka.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Skip X post, 3

    End of X post, 3

    Skip X post, 4

    End of X post, 4

    Mana Ezekwesili kwuru na ihe ya jiri gaa ebe ahụ bụ ikwugide ajọ akparamaagwa ndị Saut Afrịka na-akpasa ndị mba ọzọ.

    Skip X post, 5
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 5

  14. 'Anyị na ndị isi ọchịchị Saụt Afrịka na-akpa'

    Gọọmentị etiti ekwuola na ha na ụlọ nnọchiteanya Naijiria na Pretoria nakwa Jonnesburg Saụt Afrịka na mịnịstrị na-ahụ maka ihe na-eme na mba ọzọ na-akapa nkata etu ha ga-esi kwụsị tigbuo-zọgbuo megide ụmụ Naijiria na mba Saụt Afrịka.

    Nke a na-eme dịka gọọmentị etiti katọọ ogbugbu ụmụ Naijria nakwa ihe enwe enwe ha na mba Saụt Afrịka.

    N'akwụkwọ ozi nke ọnụ na-ekwuru mịnịstrị na-ahụ maka ihe na-eme na mba ọzọ bụ Ferdinand Nwonye binyere aka, gọọmentị dọrọ ụmụ Naijiria aka na ntị ka ha gbara ịga ebe ọgbaghara ahụ ka na-ekpo ọkụ na Saụt Afrịka ọsọ.

    Akwụkwọ ozi Mịnịstrị na-ahụ maka ihe na-eme na mba ọzọ

    Ebe foto si, Nigeria Foreign Affairs Ministry

  15. Iwe ndị Saụt Afrịka ejidela ndị Zambia

    Obị ndị Zambịa na-asụ kwụtụ kwụtụ ka ofe dị ọkụ dịkaha bidoro ịwakpo ụlọọrụ na ụlọaka ndị Saụt Afrịka dị n'ala ha.

    Ụfọdụ ndị Zambịa mere ngagharịiwe gaa n'isi ụlọrụ mba Saụt Afrịka dị na Lusaka.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Ụfọdụ n'ime ha wakpokwara ụlọ ahịan'ụlọọrụ ndị Saụt Afrịka.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  16. Otu egwuregwu bọọlụ Zambia akagbuola asọmpị ha na Saụt Afrịka

    Otu egwuregwu bọọlụ Zambia akagbuola asọmpị enyi na enyi ha na otu egwuregwu bọọlụ Bafana Bafana nke Saụt Afrịka kwesiri ịgba n'etiti ọnwa Septemba.

    Chipolopolo bụ aha otu egwuregwu bọọlụ ndị Zambia kwuru na ha kagburu ya bụ asọmpị maka mwakpo ikpa oke agbụrụ na-eme na mba ahụ.

    Bafana Bafana na otu egwuregwu Madagascar ga-agbazị ya bụ asọmpị n'ụbọchị asaa nke ọnwa Sepụtemba n'ọgbọ egwuregwu Orlando.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  17. Naijiria esepụla ụkwụ na 'World Economic Forum'

    'World Economic Forum'

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ọgbakọ 'World Economic Forum' na-aga n'ihu na Cape Town dị na Saut Afrịka

    Gọọmenti Naijiria esepụla ụkwụ na ọgbakọ maka akụnaụba ụwa nke a kpọrọ ' World Economic Summit' na bekee nke na-aga n'ihu na Cape Town, Saut Afrịka ugbua.

    Mana dịka onye nnyemaka onyeisiala na soshal midia bụ Bashir Ahmad siri kwupụta n'akara Twitter ya, "ụfọdụ ndị Naijiria gụnyere onye bụbụ mịnịsta ka nọ n'ọgbakọ a n'onwe ha."

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  18. Gọọmenti etiti na-adọ ndị mmadụ aka na ntị

    Mịnịstrị na-ahụ maka ihe gbasara mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ adọọla ụmụ Najirịa aka na ntị maka ịga njem n'ebe ọgbaghara karịrị na mba South Afịrịka.

    O kwuru na ọ ga-adị mma ka ha kwụsịlata ime njem rue mgbe nsogbu 'xenophobia' ga-ebelata.

    sA

    Ebe foto si, AFP

  19. Ihe onyonyo ndị ọzọ si na ngagharịiwe e mere na Lagos na Abuja wee pụta

    Dịka anyị na-anata akụkọ maka ngagharaiwe ụmụ Najirịa na-eme maka igosi iwe ha nye mwakpo ikpa oke agbụrụ na-eme na South Africa, lekwa ụfọdụ foto sikwa na ya pụta.

    Uweojii
    Uweojii
    Uweojii
  20. Onyeisiala Buhari, osote ya Yemi Osinbajo na Mịnịsta Onyeama na-enwe mkparịtaụka

    Dịka ọ dị ugbua, Onyeisiala Mohammadu Buhari, osote ya bụ Yemi Osinbajo na mịnịsta na-ahụ maka mba ndị ọzọ bụ Geoffrey Onyeama na-enwe nzukọ banyere ọgbaaghara na-eme n'etiti Naịjirịa na Saụt Afrịka.

    Onyeisiala kwuru na gọọmentị etiti dị njikere ichekwa ndụ ndị Naịjirịa nọ na Saụt Afrịka.

    Buhari

    Ebe foto si, Bashir Ahmad/Twitter

    Nkọwa foto, Nzuko onyeisiala Buhari