Unknown gunmen: Nkwado ndị a na-enweta n'ọwụwa anyanwụ aghọrọla akpọmasị?

Mgbe ndị mmadụ ka na-eweliri ndị omekome aka

Ebe foto si, Screenshot/Other

Nkọwa foto, Mgbe ndị 'ụnknown gunmen' na-agafe obodo dị nso n'Ihiala, ndị mmadụ na-eweliri ha aka elu iji gosi nkwado n'afọ 2022.
Mgbe e biputara ya

Akụkọ si n'aka ndị uweojii pụta n'ụbọchị ụka na-ekwu maka etu ha si gbuo ndị omekome na-achọ iwakpo ụlọorụ ha dị n'Anambra steeti.

Dịka akụkọ a si pụta, ndị mmadụ dị icheiche apụtala ikele ndị uweojii maka etu ha si lụsa ndị ahụ ọgụ ma merie ha.

Ọ kachasị ndị bi n'ala Igbo pụtara na-ekwu ka "chukwu gozie ndị ụweojii".

Ọ bụ n'ihi na mbụ ndị a malitere ịwakpo ndị uweojii nakwa ndị ọrụ nchekwa dị icheiche, ọtụtụ ndị pụtara ịkwado ha na soshal midia.

Onyeisi ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu nwere mgbe ọ kpọro ha "unknown angels" n'ime otu ozi ọ gbasara mgbe ndị ahụ malitere ịwakpo ụlọorụ nakwa ngwa ọrụ ndị ọrụ nchekwa.

Nke a mere ka BBC Igbo malite ịjụ ajụjụ banyere etu omume ndị mmadụ n'ebe otu akpọrọ 'unknown gunmen' si gbanwe.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu

Ebe foto si, BBC Igbo/Screenshot

Ihe ndị mmadụ na-ekwu

Ebe foto si, BBC Igbo/Screenshot

Ihe ndị mmadụ na-ekwu

Ebe foto si, BBC Igbo/Screenshot

"Ike ịnọ n'ụlọ agwụla ndị mmadụ"

Ụgbọala a gbara ọkụ maka sit at home n'afọ 2021

Ebe foto si, BBC Igbo Facebook

Nkọwa foto, Ụgbọala a gbara ọkụ maka sit at home n'afọ 2021.

Iji ghọta akụkọ a ọfụma, anyị kpokuru mmadụ abụọ ndị ọnụ na-eru n'okwu ka tinye uche n'okwu a.

Paul Achalla bụ onye ọkaiwu ma bụrụkwa onye nọbu n'otu Ipob bụ otu onye tinyere ọnụ n'okwu a.

N'uche ya, okwu gbasara ya bụ ihe dị n'ụzọ abụọ.

Ọ kọwara na otu ahụ kpọkọrọ onwe ha mgbe ndị uweojii na-akpa agwa ọjọọ n'oke ogbugbu ndị mmadụ nke butere ngagharị iwe 'End SARS' nke afọ 2020.

"Nke a mere ka ndị mmadụ malite ikwado ha dịka ha na ndị uweojii na-anụ" ka Achalla kọwara.

"Mana mgbe ha malitere ịgba ụlọ obibi, ụlọ ahịa nakwa ụgbọala ndị mmadụ nkịtị ọ gbagbojuo ndị mmadụ anya" ka o kọwara.

O kwuru na ihe ndị ahụ adịghị mma n'ihi na ọ dị ka onye tụrụ okwute n'ime ahịa amaghị onye ọ ga-ada n'isi ya.

N'okwu gbasara Simon Ekpa, o kwuru na ọ bụghị ụzọ ziri ezi ka Ekpa ji azọ mmnwereonwe nke ya.

Ọ sịkwa na etu Ekpa si azọ nke ya na-enye ndị na-azọ mmnwereonwe ha ajọ aha.

"E mere ntuliaka emeghi ntuliaka, ọ gbasaghị onye na-azọ mmwereonwe" ka o kwuru.

Ndọrọndọrọ ọchịchị e so n'okwu a?

Igwe Nnewi na-agọzi Peter Obi

Ebe foto si, BBC Igbo Facebook

Onye ọzọ ọnụ na-eru okwu BBC Igbo kpọrọ bụ Chris Okereke kwuru na ọ bụ okwu ndọrọndọrọ butere ntụgharị obi n'etiti ndị bi n'ọwụwa anyanwụ.

"Ugbua a bụ mbụ onye Igbo nwere agba na-apụta ịzọ ọkwa onyeisiala, ihe dị ndị mmadụ mkpa bụ ịma etu a ga-esi mee ka ọ banye n'ọchịchị" ka o kwuru.

O kwuru na echiche ndị mmadụ agawala ihu ebe Simon Ekpa na ndị otu ya na-ekwu ihe ndị enweghi isi.

"Ihe zọrọ Ekpa bụ na ọ notoro aka na-ebute ọgbaghara, ọ nọghi nso na Naịjirịa eme nke a" bụ ihe o kwuru.

Ihe ọzọ Okereke tụrụ aka bụ na ike agwụla ndị mmadụ dịka Paul Achallah si ekwu.

Ọ sị na mgbe ndị ahụ malitere igbu ndị nkịtị agba ụlọ ha ọkụ akwụsị ndị mmadụ ọrụ, ndị mmadụ e si n'ikwado ha pụọ n'ihi na ha aghọtaghizi ihe ndị ahụ na-eme.

Na mbido...

Cheta na oke ogbugbu mmadụ arị erị elu kemgbe ọnwa Jenụwarị afọ 2021.

Nke a na-eso nhiwe otu na-achọ nnwereonwe Biafra a kpọrọ Ipob hiwere alaka ọgụ ha a kpọrọ Eastern Security Network n'ọnwa Disemba afọ 2020.

Ha kwuru na ESN bụ maka ihe ha kpọrọ "ibu agha megide ndị ọchịehi" ha kwuru ma egbusisi ndị mmadụ, na-awakpo ụmụnwaanyị n'Ọwụwa Anyanwụ.

Kemgbe ahụ, e gbuola ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị uweojii, ndị ọrụ nchekwa nakwa ndị Igbo welitere isi.

Ndị ọrụ nchekwa na-ebo ndị Ipob na alaka ọgụ ha bụ ESN ebubo aka ha ịdị na tigbuo-zọgbu na-akpọtụ n'Ọwụịwa Anyanwụ.

Mana Ipob aghọọla ugboro ugboro na aka ha dị ọcha.