Agbamume Genevieve Nnaji nyere m ụbọchị mbụ m mere ejije kpaliri mmụọ m ime nke ọma – Blessing Onwukwe

Agbamume Genevieve Nnaji nyere m ụbọchị mbụ m mere ejije kpaliri mmụọ m ime nke ọma – Blessing Onwukwe
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Orji Nnachi
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
  • Mgbe e biputara ya

Blessing Onwukwe a maara ugbua dịka 'Mama Monica' akọwaala etu o siri malite njem dịka onye na-eme ejije, nakwa etu Genevieve Nnaji siri kpalite mmụọ ya n'ụbọchị mbụ ha zutere.

Onwukwe, nwaafọ Asa dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Ụkwa West n'Abịa Steeti kpughere nke a oge ya na BBC news Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche iji kọwaa etu o si bụrụ onye na-eme ejije a ma ama ugbua.

Ọ sịrị na ya bịara Legọs Steeti n'afọ 2008 ma kpee ezigbo ekpere iji mata uche Chineke gbasara ọchịchọ obi ya ịbanye Nollywood.

"Abịara m Legọs Steeti n'afọ 2008, o nweghị ihe ọbụla m rụrụ, naanị ihe m rụrụ bụ ikpe ekpere, maka na achọrọ m ịnụ "ee gawa, ọ ga-adịrị gị na mma" tupu m malite, maka na anaghị m achọ ime ihe m na-amaghị isi ya".

"Chineke zara m, sị m gawa na ọ ga-adịrị m mma. Etetara m ụra n'ụtụtụ, kpọọ Emem Isong n'ekwentị, ka Chineke zachara m ekpere mana o chetaghị onye m bụ kama ọ gwara m na ya chọrọ ịhazi nnwale maka ndị ga-emere ya ejije n'Adebola Street dị na Surulere [na Legọs Steeti]".

"Agara m nnwale ahụ, dee aha m n'akwụkwọ. A kpọrọ m ka m bịa gosi ihe m jiri bịa, m pụta gụọ ihe dị m n'isi. Ọ mataghị onye m bụ. M gụcha ya pụọ. Ha asị anyị chere ka a kpọọ ndị a ga-ahọrọ. Ọ bụ aha m ka e buru ụzọ kpọọ n'ụbọchị ahụ."

Blessing Onwukwe kwuru na mgbe ha malitere ime ejije ahụ a kpọrọ "Bursting Out" n'afọ 2009 ka ya zutere Genevieve Nnaji, maka na ọ bụ otu n'ime ndị so n'ejije ahụ.

"Ọ bụ mụ na Genevieve Nnaji na Majid Michel soro mee ejije ahụ. Enwetara m ọtụtụ agbamume site n'aka Genevieve n'ụbọchị ahụ n'ihi na ụsụsọ na-agba m n'ụbọchị ahụ dịka ọ na-agba m ugbua".

"Desmond [Elliot] bụ onye ntuziaka jụrụ ihe mere ụsụsọ ji na-agba m, m sị ya na ọ bụ maka na mụ na Genevieve na Majid na-emekọ ejije. Genevieve atụgharịa jụọ ma ihe ahụ ọ bụ ejije mbụ m na-eme, m sị ya ee na ọ bụ nnwale mbụ nakwa ejije mbụ m na-eme. Ọ gwa m na m na-eme nke ọma, na m ga-agate aka."

Blessing Onwukwe kọwara na agwa ọ kpara n'ejije "Monica" were ogologo oge tupu ọ pụọ ya n'ahụ.

"Oge m gụchara akụkọ Monica, ebere m akwa, hichaa anya ma jụọ onwe m etu m ga-esi mee ka ndị mmadụ ghọta agwa ahụ, ma mwee ụdị mmetụta m nwere. Ya mere, aghọrọ m Mama Monica tupu m banye ime ejije ahụ. Maka na Mama Monica achọghị ịma onye ụgbọ gburu, naanị ihe na-echu ya ụra bụ ihe ọ chọrọ".

"O were m ọtụtụ ụbọchị iji wepụta onwe m n'agwa ahụ. Emechara m kwụsị ikwu okwu tupu m kpasa mmadụ agwa Mama Monica," ka ọ kọwara.

A mụrụ Blessing Onwukwe na Pọtakọt dị na Riva Steeti mana ọ gara mahadum na University of Uyo dị n'Akwa Ibom Steeti, ebe ọ gụrụ ihe ọmụmụ Industrial Physics.