Ihe Peter Obi kwuru maka onye na-azọrọ Labour Party ọkwa e gburu n'Imo steeti

Peter Obi

Ebe foto si, Peter Obi

Mgbe e biputara ya

Peter Obi bụ onye na-azọrọ otu Labour Party ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka 2023 ezipụtala ozi banyere Christopher Elehu bụ onye na-azọrọ patị ahụ ọkwa n'ụlọomeiwu Imo steeti ndị ojiegbe gburu n'isi ụtụtụ Fraịdee nke ụbọhị 16 ọnwa Disemba, 2022.

Ozi rụrụ aka na o doro ya aya na ndị gburu ya dere ya ede ma wakpoo ya.

Ma kwuo:

'E ji m obi m niile akatọsiike ogbugbu ọjọọ e gburu ya. Omume ndị dị etu a megidere nchekwa anyị, ọdịmma obodo anyị na nkwekọrịta udo anyị bụ ndị ndọrọ ndọrọ bịanyere aka na nso nso a'.

E kwuru na ndị wakporo be Elehu gbara egbe aghara aghara n'isi ụtụtụ Fraịdee a.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, E kwuru na ndị wakporo be Elehu gbara egbe aghara aghara n'isi ụtụtụ Fraịdee a.

Ndị ojiegbe wakporo be Christopher Elehu na Fraịdee gbuo ya ma mụnye ụlọ ya nkwa ọgba tum tum ya ọkụ.

Elehu na azọ ọkwa ịnọchiteanya mpaghara Onuimo n’ụlọomeiwu steeti ahụ na ntuliaka afọ 2023.

Mwakpo a mere n'obodo Umucheke nke dị na mpaghara Onuimo.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Michael Abattam gwara BBC Igbo na ya bụ mwakpo mere n’ezie dịka o kwuru

“Anyị amalitela nnyocha ima etu ihe a siri mee.”

Ndị bi nso ụlọ onye ndọrọndọrọ ọchịchị a kwuru na ya bụ ihe mere n’isi ụtụtụ Fraịde abụ ụbọchị 16 nke ọnwa Disemba 2022 ma kọwa na ndị omekome ahụ gbara egbe aghara aghara ruo ogologo awa.

E kwukwara na ndị ojiegbe nke amabeghi ndị ha bụ gakwara n’ụlọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ndị bi nso ebe ahụ mana enweghị ndị ha hụrụ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Ọtụtụ akụkọ apụtala etu e siri wakpo maọbụ gbuo ndị nkwado nakwa ndị na-azọ ọkwa n'aha Labour Party na nso nso a.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ akụkọ apụtala etu e siri wakpo maọbụ gbuo ndị nkwado nakwa ndị na-azọ ọkwa n'aha Labour Party na nso nso a.

O dobeghị anya ihe bụ ebumnobi ndị mere mwakpo a mana a kọwara na a hụrụ ozu Elehu ma hụkwa na egbukasiri ya mma n'aha.

Ndị obodo hụrụ ka be ya na-agba ọkụ dịka ọgba tum tum ya gbarịchara ọkụ oge ndị mmadụ gara ebe ahụ ka chi foro.

Dịka ntuliaka 2023 ji ọsọ abịa, a na-anụ akụkọ gbasara etu ndị ekperima na ndị agboro si awakpo ụfọdụ ndị nkwado nakwa ndị otu pati dị icheiche.

Nke a emeela ọtụtụ ji ajụsi ajụjụ ike banyere ọnọdụ ihe a na-eme.

N'ọdị nso a ụdị mwakpo a dịka akụkọ si gosi, emetụtala ndị nkwado Labour Party, ebe ndị otu Peoples Democratic Party enyekwala mkpesa maka ya.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

N’ụbọchị 28 nke ọnwa Nọvemba, 2022, ndị ojiegbe wakporo ụlọ otu nwaanyị aha ya bụ Victoria Chintex n'ụbọchị Mọnde, na Kaduna steeti, ma were egbe gbagbuo ya n’ime ụlọ ya.

Nwaanyị a bụ onyeisi ngalaba ụmụnwaanyị na Labour Party n'okpuru ọchịchị ya bụ Kaura na Kaduna steeti.

Amabeghi ndị bụ ndị ojiegbe ahụ nakwa ihe bụ ebumnobi ha, mana onyonyo pụtara n'ịntanetị gosiri ebe nwaanyị ahụ na-agbasa ozi maka Labour Patị.