Kedụ nke bụ eziokwu n'ebubo na Ooni nke Ife kwere nwaanyị nkwa ọlụlụ, napụ ya 180,000 dọla n'ụzọ aghụghọ?

Eze Ife bụ Adeyeye Enitan Ogunnusi

Ebe foto si, Adeyeye Enitan Ogunnusi /Facebook

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Obieze Ooni nke Ife ekwuola na akụkọ na Eze Ife bụ Ọoni Adeyeye Enitan Ogunnusi gwuru otu nwaanyị chandum akatamkpo ego ma kwe ya nkwa ọlụlụ bụ okpotokpo asị.

Ebubo fegharịrị na soshal midia na nsonso a dịka otu onye nọ n'ọbaozi X kpọrọ onwe ya ' '99% OPPRESSED' 'boro ebubo fegharịri na soshal midia na Ọoni nke Ife napụrụ otu dọkịta nọ Amerịka bụ Dkta Oladoyin Fagbule, ego dị dọla otu narị na iri asatọ (180,000 USD).

Mana ọnụ na-ekwuru Obieze bụ Otunba Moses Olafare kwuru n'akwụkwọozi o binyere aka ma wepụta na "Obieze Ooni nke Ife amaghị ihe ọbụla maka otu onye a kpọrọ Nwaada Fagbule a sị nna anyị bụ Arole Oduduwa Olofin Adimula, Ooni Adeyeye Enitan Ogunwusi, CFR, gwuru chandum ego dị dọla180,000."

"Ooni nke Ife amaghị Oriakụ Fagbule, nke ya na ya na-akparịta ụka ma ya fọdụ ikwe ya nkwa ọlụlụ."

Olafare gara n'ihu n'ozi ahụ kwuo na Ooni Adeyeye enweghị akara na Facebook o ji aka ya ahazi.

O nyekwara ndụmọdụ ka o wegara ndị uweojii mkpesa kama ịbịa n'ọbaozi soshal midia eko okwu na ụka.

Ka ọdị ugbua, dịka akụkọ a na-akpọtụ, nwa amadị ahụ ka na-ewepụta ihe ọ kpọrọ ihe akaebe na ya bụ ebubo bụ eziokwu.

Ebe o kwu si bido

N'abalị 16 nke ọnwa Julai, afọ 2024, otu onye kpọrọ onwe ya '99% OPPRESSED' boro ebubo na otu nwaanyị, onye dọkịta bụ nwafọ Osun steeti bi Amerịka bụ Fagbule chọrọ ịrụ ụlọọgwụ n'obodo ya iji nyere ndị mmadụ aka.

O kwuru na ya kpọtụụrụ Adeyeye Enitan Ogunnusi n'akara ọbaozi ya na Facebook ya na ya kpaa etu ọ ga-esi nyere ya aka ịmata ụmụamaala ife bụ ndị ọ chọrọ inye enyemaka nlekọta ahụike.

99% OPPRESSED wepụtakwatara akwụkwọ ozi a sị Ooni degara nwaanyị ahụ kwe ya nkwa ịlụ ya n'ọnwa Juun afọ 2023.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post