Ike agwụla m, amaghị m etu m ga-esi malite ọzọ - Onye ọkụ gbapịara ahịa ya na Tejuosho

Ọkụ gbara n'ahịa Tejuosho
Mgbe e biputara ya

Ọtụtụ ndị mmadụ na-azụ ahịa n'ahịa Tejuosho dị na Yaba, Legọs steeti, nọ n'anyammiri n'ụtụtụ Wenezde a, dịka ọtụtụ ụlọahịa gbara ọkụ n'ebe ahụ n'abalị ụbọchị Tuzde.

Tejuosho bụ ahịa ebe a na-ere akwa na ihe e ji akwa akwa, nke bekee na-akpọ 'tailoring materials'.

Ọtụtụ ndị Igbo nwere ụlọahịa n'ahịa Tejuosho, ọtụtụ n'ime ha sokwa na ndị ụlọahịa ha gbapịara.

Mgbe BBC Igbo garuru n'ahịa ahụ n'ụtụtụ Wenezde, anyị hụrụ ka ndị mmadụ nọcha n'ime ogige ahịa ahụ nke ọkụ gbapịarala, na-achọ ma e nwere otu mkpụrụ ihe ha nwereike iwepụtanwu n'ụlọ ahịa ha.

Ọkụ gbara n'ahịa Tejuosho

Otu nwoke aha ya bụ Ibeze Nnaji kwuru na ya onwe ya enweghị ike ịkọwali etu ya bụ ọkụ si malite.

Nnaji kwuru na mgba ọkụ malitere, ihe mbụ ndị mmadụ mere wụ ịgbagodu ọsọ ndụ ha, tupu ha emechaa lọghachi chọwa etu a ga-esi menyụọ ya bụ ọkụ, mana oge agaala.

"Mụ onwe m, alaala m ụlọ oge ya bụ ọkụ malitere, mana oge a kpọrọ m n'ekwentị m gbara ọsọ rute mana onweghị ihe m nwere ike imenwu," Nnaji kwuru.

"Anọ m na-ele anya ka ụlọahịa m na-agba ọkụ, ihe niile m ji azụ ahịa m gbapịara ọkụ."

"Ana m ere nri n'ahịa a, mana onweghị kama otu mkpụrụ ih m wepụtanwuru, ma efere m ji ere nri, gaasị m ji esi nri, ihe niile, agaghị m akọchanwu ihe fulahụrụ m n'ọkụ a."

"Ka ọ dị ugbua, ike agwụla m, amaghịkwa m etu m ga-esi malite ọzọ. Anya ka m nọzi ele, ọ bụrụ na o nwere ndị o metụrụ n'obi inyere anyị aka, ọ ga-adịkwa mma."

Ibeze Nnaji
Nkọwa foto, Ibeze Nnaji sị na ihe niile o ji ere nri n'ahịa Tejuosho alaala n'iyi

Nnaji kwuru na ihe kacha wute ya bụ na "ọtụtụ ndị ekperima ji ohere ọkụ ọgbụgba ahụ na-ezu ngwaahịa ụmụ mmadụ".

Dịka ndị mmadụ na-achọ ụzọ ịzọpụta ngwaahịa ha, ka ha na-ebupụta ya ka ụfọdụ ndị ekperima nọ n'akụkụ na-ezukọrọ ya, ka Nnaji kwuru.

Adeseye Magaret bụ onyeisi ụlọọrụ mgbanyụ ọkụ na Legọs steeti kwuru na ndị ọrụ mgbanyụ gbatara ọsọ n'oge bịa menyụọ ọkụ ahụ, mana o kwughị ihe kpatara ya bụ ọkụ ji bido.