Ihe anyị hụrụ mgbe anyị wakporo ogige ndị IPOB/ESN dị n'Ebonyi na Enugwu Steeti - Ndị agha

ngwa ọgụ

Ebe foto si, Nigerian Army/Twitter

Mgbe e biputara ya

Ndị agha nke 82 Division, ndị agha elu, ndị uweojii na ndị DSS etịkọọla aka ọnụ were wakpoo ogige ndị Ipob/ESN nke ha sị dị n'obodo Amagu nke Nkalaha dị n'okpuruọchịchị Ishielu nke Ebonyi Steeti n'ụbọchị mọnde.

Ọ bụ n'akwụkwọ ozi onụ na-ekwuchitere ndị agha bụ Onyema Nwachukwu depụtara ka ọ dị na ya.

ngwa ọgụ

Ebe foto si, Nigerian Army/Twitter

O kwuru na ha na ndị omekome a kwalịtara mgbọ nke mere ka ndị nchekwa gbuo ụfọdụ n'ime ha ebe ndị ọzọ gbara ọsọ.

Onyem,a kwuru na ihe ha napụtara n'aka ndị omekome a gụnyere mgbọ egbe, egbe pump action abụọ, egbe ọka abụọ, ihe ha chere bụ igbo, uwe ndị agha, uwe ndị uweojii, Ogbunigwe Grenade na ihe ndị ọzọ.

O kwukwara sị, " N'otu ụbọchị ahụ, ndị nchekwa na-eme ngagharị nchekwa n'obodo Agubeji nke dị n'Enugwu Steeti nwuchịrị otu nwoke aha ya bụ Martins Abogwu maka ebubo ya na ndị Ipob/ESN ịkpa nkata".

O kwuru na nwoke a sị na ọ bụ onyeisi na-ahụ maka nchekwa n'obodo ahụ gbaara ndị nchekwa ama nke mere ha jiri wakpoo ogige ndị omekome a ma chọpụta ozu abụọ nke optu onye bụ onye nchekwa obodo atọorọ ihe dịka otu ọnwa gara aga.

O kwuru na ndị ọrụ nchekwa kwụ chịm ịchekwa obodo ma rịọ ndị mmadụ ka ha nyere ndị nchekwa aka maka ibuso ndị omekome a agha,