"Esi m n'akụkọ ifo mụta ka e si arụpụta ihe onyonyo" - Izu Ojukwu

Mgbe e biputara ya

Izu Ojukwu bụ nnukwu mmanwụ na-emepụta ihe onyonyo gbara abụba bụ nke ọtụtụ n'ime ha ritegoro nturu ugo dị iche iche nke gụnyere AMVCA nke e mere n'afọ a.

Izu Ojukwu bụ onye obodo Otolo dị na Nnewi, Anambra steeti.

Ọ bụ Izu mere ihe ejije dịka Moment of Bitterness, Across the Niger, Images of Another Day, Sitanda, White Water, 76, Amina na ndị ọzọ.

Ọtụtụ ihe onyonyo ya eritela nturu ugo.

Ọ sị na ihe nkiri mbụ ya mere bụ n'afọ 1992, Ikabodu.

Ọ sịkwa na ya malitere ime ihe ejije ite ụmụaka na-eme ya na mgbe nne ha na-akọrọ ha akụkọ ifo.

Ojukwu sị na ọ bụ ya bụ akụkọ ifo a na-akọrọ ha nyere ya ohere ịji ụmụ nne ya na-eme ihe ijije nke mere ka uche ya dịwa na ya bụ ọrụ.

Ebe ahụ ka ọ malitere ịgbazị mbọ ka ọ banye ọrụ ejije.

Izu bụ onye ọrụ ejije eji ịme fim mara. E jighị ịme 'home movie' mara ya maka, dị ka ọ gwara BBC Igbo "ha na-akọ m ọnụ sị na ị kpọọ Izu Ojukwu n'ọrụ, gaa chịta ute ị ga-eji arahụ".

Ọ sị na ọtụtụ ndị na-akọ ya ọnụ ahụ anọghịzị n'ọrụ ejije Nollywood ugbua.

Izu sị na ọ na-ewute ya na ndị Igbo rụchara ọrụ ndị ọzọ buru ya rie.

Ọ sị na uru ndị ọzọ na-eri na ọrụ ejije taa bụ ndị Igbo malitere ya.

Izu kwukwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ ga-amasị gị ma ị kiricha ihe onyonyo a.