Buhari eduola Olukayode Ariwoola n'iyi ọrụ dịka ọkaikpe ukwu Naịjirịa

Buhari na-edu Ariwoola

Ebe foto si, Presidency

Nkọwa foto, Buhari duru Ariwoola n'iyi ọrụ n'Aso Rock taa bụ Mọnde.
Mgbe e biputara ya

Onyeisiala Muhammadu Buhari eduola Olukayode Ariwoola n'iyi ọrụ dịka ọkaikpe ukwu nke Naịjirịa, taa bụ Mọnde, ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa Jun 2022.

Ariwoola bụ onye na-esote Muhammad ma a gụwa ndị bu ụzọ bụrụ ọkaikpe n'ụlọikpe kachasị nke Naịjirịa.

Nke a na-abịa dịka ọkaikpe Tanko Muhammad bụbu ọkaikpe ukwu Naịjirịa gbara arụkwaghị m.

Buhari nyekwara ọkaikpe Muhammad nzere 'Commander of the Order of the Niger, (OON), iji kelee ya maka ọrụ ya.

Onye bụ Ọkaikpe Ariwoola

 Olukayode Ariwoola
Nkọwa foto, Ọkaikpe Olukayode Ariwoola
  • A mụrụ Ariwoola n'ọnwa Ọgọst nke afọ 1958, nke pụtara na ọ dị afọ iri isii na anọ ugbua.
  • Ọ bụ onye Oyo Steeti.
  • Ọ bụbu ọkaiwu n'ụlọikpe ukwu nke Oyo steeti na 1992 ru0 2005
  • Na 2005 ka e buliri ya n'ọkwa dịka ọkaikpe nke ụlọikpe mkpesa n'afọ 2005
  • Ọ malitere ọrụ dịka ọkaikpe nke ụlọikpe kachasị na Naịjirịa n'afọ 2011.
  • Ariwoola ga-abụ ọkaikpe ukwu nke nchereoge, ruo oge otu 'National Judicial Council' ga-enyocha ma kwadoo nhọpụta ya
Tanko Muhammad

Ebe foto si, Nigerian Presidency

Nkọwa foto, Tanko Muhammad malitere ọrụ dịka ọkaikpe ukwu Naịjirịa n'ọnwa Julaị adọ 2019.

Akụkọ na-apụta ugbua na-ekwu na Ọkaikpe ukwu Naịjirịa bụ Tanko Muhammad etinyela akwụkwọ arụkwaghịm.

Otu onye enyemaka ya gwara BBC Hausa na Ọkaikpe Muhammad tinyere akwụkwọ arụkwaghịm n'eziokwu.

Amabeghị kpọmkwem ihe mere Tanko ji kpebie ịkwụsị ọrụ ugbua; oge ya maka ịla ezumike nka gaara akụrụ ọnụ n'ọnwa Disemba afọ 2023.

Mana akụkọ na-ekwu na o nwereike ịbụ nghọtahie dị n'etiti Tanko Muhammad na ndị ọkaikpe ukwu ibe ya kpatara nke a.

Cheta na ndị ọkaikpe iri na anọ na-arụ ọrụ n'ụlọikpe kachasị na Naịjirịa degaara Onyeisiala Muhammadu buhari akwụkwọ n'ọdị nso a iji mee mkpesa ma kwuo na Tanko Muhammad anaghị arụ ọrụ ya nke ọma.

N'aka nke ọzọ, ndị ntaakụkọ Channels TV na-ekwu na ihe mere Tanko Muhammad ji tinye akwụkwọ arụkwaghịm bụ n'ihi na ahụ esichaghị ya ike.

BBC ka na-agba mbọ inwetacha akụkọ a nke ọma.

Tanko Muhammad malitere ọrụ dịka ọkaikpe ukwu Naịjirịa n'ọnwa Julaị afọ 2019, oge Walter Onnoghen gbara arụkwaghịm n'ọrụ ahụ.

Onnoghen tinyere akwụkwọ arụkwaghịm dịka onyeisiala Buhari boro ya ebubo nrụrụaka.