Ooni of Ife, Pete Edochie handshake: Ihe ndị chiri echichi Igbo na Yoruba na-ekwu

Ebe foto si, Nworah/Ooni /Edochie/Elebuibon
Ndị chiri echichi n'ala igbo nakwa ala Yoroba ekwuola na o nweghị ihe ọjọọ dị n'etu onye omee ihe ejije Nollywood bụ Pete Edochie si kelee Ooni nke Ife bụ Oba Adewusi Ogunwusi na nsonso a.
Ha kwuru na ihe bụ nsọ na mba bụ onela na mba ọzọ.
Ndọrịtaụka dapụtara na soshal midia dịka onyonyo gbara n'ịntanet gosiri ebe Pete Edochie nyere Ooni nke Ife bụ Oba Adeyeye Ogunwusi aka atọ dịka ha abụọ o zutere na mmemme.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Ya bụ onyonyo kpanyere ọkụ na soshal midia dịka ọtụtụ ndị ntorobia si Ọdịda Anyanwụ Naijiria bụ mpaghar ebe Ooni si katọrọ Edochie sị na "ọ bụ mkpari", ebe ndị ntorobia si Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa na-ekwu na ọ nweghị ihe mkparị ọbụla dị na ya kama na ọ bụ maka na ndị Igbo chiri echichi dịka Edochie anaghị esekpu ala ekele onye ọbụla karịa chi ha.
Mana ndị okenye chiri echichi n'agbụrụ abụọ ndị a kọwara BBC Igbo na o nweghị mkparị ọbụla nọ n'okwu a dịka ha abụọ si omenala abụọ dị iche iche.
Ọ bụghị omenala Igbo isekpu ala kelee eze- Ichie Nworah

Ebe foto si, Uche Nworah
Ichie Uche Nworah kwuru na "ndị Igbo anaghị amakpuru n'ala dịka ndị Yoroba si eme."
"Nkwanye ugwu Pete Edochie ga-akwanyere Ooni bụ na ọ nara ya aka atọ."
"Abụ m onye Enugwu Ukwu, m hụ Igwe be anyị, ihe m ga-ana ya bụ aka atọ, tuo ya 'Eze, eze, eze... Igwe..!"
"Anyị anaghị esekpu esekpu were ekele Igwe, ọ bụghị omenala Igbo."
"Anyị anaghị ehu ehu, anyị anaghị esekpu esekpu. Ọ bụ ndị Yoroba na-esekpuru ala maọbụ mee ihe ha na-akpọ 'dọbale'"
Nworah bụ onye bụ Eze Udo Enugwu Ukwu na Ụmụ Nri gara n'ihu rụtụ aka na obodo nile dị iche iche n'ala Igbo nwekwara etu ha si ekele eze ha.
"N'Ọnicha, Igwe ha anaghị ekwe mmadụ n'aka ma ọli, ị hụ ya itu ya aha, o fee gị nza."
Etu anyị sị eme na be anyị nwere ike ịbụ arụ na be ndị ọzọ - Araba nke ala Osogbo

Ebe foto si, Eleibuon
Otu onye chiri echichi omeala Yoroba bụ Ifayemi Elebuibon ji ilu Yourba kwuo na onweghị ihe ọjọọ dị n'aka Edochie kwere Ooni nke Ife si na " Etu a ka anyị sị eme na be anyị bụ arụ na be ndị ọzọ."
Ọ kọwara na obodo ọbụla n'ala Yoruba nwere etu e si ekele okenye, eze nakwa onye tọọrọ mmadụ.
Ọ sịrị, "Ndị ọba a na-edinala were kelee ha, ebe ụmụnwaanyị na-esekpu ekelee ha."
"Mana o nwere ndị o megidere ha idina ala kelee ọba iji maa atụ onyeisi arụsị Orisha, Araba bụ onyeisi ndị ụkọchukwu Ifa, ndị isiagha. Nke a abụghị mkparị."
Ha chọọ ikele ọba ,ha welie aka ha elu, o nwere ihe ha ga-ekwu, ọba kwekwa ha ekele."
A na-akwụ ọtọ ekele Eze?

Ebe foto si, Ooni of Ife/Yul Edochie-Facebook
Dịka ihe onyonyo ebe omee ihe ejije Nollywood a ma ama bụ Pete Edochie zutere Ooni nke Ife bụ Oba Adeyey Ogunwusi ma kwụrụ ọtọ kwee n'aka na-efegharị n'ịntanetị, ndọrịtaụka na-apụ ọkụ adaala n'soshal midia dịka ụfọdụ ndị mmadụ ọkachasị ndị si Ndịda Anyanwụ Naijria na-akatọ ihe a o mere.
Ụfọdụ ndị na-akatọ Edochie si n'akụkụ mpaghara ahụ sị na ọ bụ mkparị nye nnukwu Eze nwere agba dịka Ooni na mmadụ kwụ ọtọ kelee ya.
Otu onye ji akara 'BadmusA03502702' agbasa ozi na Twitter kwuru na e kwesịrị ịnapụ Ooni ocheeze ya maka inye ohere ịnata ụdị mkparị a n'aka Edochie.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Mana ụfọdụ ndị si Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa kwuru na o nweghị mkparị ọbụla nọ n'agwa Edochie kpara dịka ha kwuru na ụdị aka Edochie nyere ya (o nyere Oba Ogunwusi aka anọ) bụ etu onye chiri ọzọ si ekele onye echịchị ibe ya. Ụfọdụ ndị ọzọ kwuru na onye chiri ọzọ n'ala anaghị esekpu ala ekele onye ọbụla karịa chi ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

End of X post, 3
Ebe ụfọdụ dịka @Alaụsa_O na Twitter kwuru na o nweghị ihe ọjọọ dị n'ekele ahụ dịka dimkpa abụọ ahụ esighi otu agbụrụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4