Poco Lee: Ụlọikpe mba Britain eyigharịala ikpe ya ruo ọnwa Febụwarị 2027

Ebe foto si, Poco Lee/Instagram
Ụlọikpe Snaresbrook Crown Court dị na Lọndọn eyigharịala ikpe onye ọgba egwu Naịjirịa a ma ama, bụ Iweh Odinaka Pascal onye a maara dika Poco Lee n'ihi enwetaghị akwụkwọ ebubo a ga-agụrụ ya n'ụlọikpe tupu ọ malite ịzara ọnụ ya.
Ọkaikpe Sandy Canavan tinyeziri ụbọchị 8 nke ọnwa Febụwarị 2027 dịka ụbọchị ọhụrụ Nwaamadi a ga-anụrụ ikpe na ebubo ndị e boro ya bụ nke a na-atụ anya na ọ ga-azara ọnụ tupu ikpe ya amalite n'ezie.
Ọkaikpe Canavan kwukwara na a ga-amalite ikpe ya n'ụlọikpe n'ezie maka ebubo dị iche iche gụnyere idina nwaanyị n'ike n'ụbọchị 8 nke ọnwa Maachị 2027.
Ka ọ dị ugbu a, ụlọikpe enyela Poco Lee ntọhapụ beelu ma na BBC chọpụtakwara na ọgba egwu ahụ enwetabeghị nkwado ịhapụ mba United Kingdom dịka ọkaikpe nyere iwu na ọ ga-anọ na mba ahụ ruo na ikpe ya amalite.
Mbọ niile ụlọmgbasa ozi BBC News gbara ka ọkaiwu na-ahụ maka ikpe ahụ bụ Ronan McCann gwa ndị ntaakụkọ okwu banyere ikpe ahụ amịtaghị mkpụrụ.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Poco Lee: Ihe anyị ma maka ikpe ya na-aga n'ihu na Britain

Ebe foto si, Dave Pedley/Getty Images for SXSW
Poco Lee bụ ọgba egwu a ma ama ezigbo aha ya bụ Iweh Pascal Odinaka, ga-amalite ịzara ọnụ ya n'ụlọikpe maka ebubo dị icheiche e boro ya na mba Briten.
Cheta na ụlọikpe Snaresbrook Crown Court dị mba Briten adịla na mbụ ziga ya n'ụlọmkpọrọ nchere oge na mba ahụ ma kwuo na ọ bụ eziokwu na Poco Lee ga-ebido ịzara ọnụ ya n'ụbọchị 15 nke ọnwa Septemba 2026 maka ebubo ndị ahụ e boro ya.
Mana onyonyo na-efegharị n'ịntanetị kemgbe abalị gara aga gosiri ebe Poco Lee na otiegwu a ma ama bụ Burnaboy na-enwe aṅụrị maka ntọhapụ ya dịka ụlọikpe nyere ya ntọhapụ beelu n'ụbọchị 11 Septemba 2026.
Gịnị bụ ebubo e boro Poco Lee e ji akpụpụ ya ụlọikpe?

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ kwuru na a na-ebo Poco Lee (Iweh Odinaka) ebubo ise nke gụnyere ebubo idila nwaanyị n'ike.
Cheta na nke a bụ naanị ebubo ka ọ bụ ugbua; ọ pụtaghị na ikpe amaala ya.
Ka ọ dị ugbua, Poco Lee gọnahụrụ ebubo ndị ahụ ma kwusie ike na aka ya dị ọcha.
Ikpe Poco Lee sochiri njem ọ gara n'UK maka ọgbakọ egwu otiegwu bụ 'Davido' na ndị enyi ya nke emere na Crystal Palace Bowl dị na Lọndọn n'ụbọchị 14 nke ọnwa Ọgọst, afọ 2026.
Onye bụkwanụ Poco Lee?
Ezigbo aha Poco Lee bụ Iweh Pascal Odinaka dịka m si kwuo na mbụ.
A mụrụ ya na 21 Ọktọba 1996. Ọ bụ onye Orlu dị n'Imo steeti, mana o tolitere n'okpuruọchịchị Ojo dị na Legọs steeti.
A malitere ịnụ aha ya n'ihe dịka afọ 2018 mgbe ihe onyonyo ebe ọ na-agba egwu 'Zanku/ Legwork' fesara n'akara soshal midịa.
Onye na-eti egwu bụ Zlatan Ibile mechara hụ onyonyo ahụ ma soro ya rụọ ọrụ, nke nyere Poco Lee ohere ịbanye n'etiti ndị a ma ama n'ụlọọrụ egwu Naịjirịa.
Kemgbe ahụ, Poco Lee esorola ọtụtụ ndị egwu a ma ama rụọ ọrụ, gụnyere Davido, Wizkid, Burna Boy, Tiwa Savage na Naira Marley.
Buru oche nọnyere anyị dịka BBC Igbo ga-enwetere gị etu ikpe ya si gaa n'oge na-adịghị anya.



























