You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nkọwa onye nkụzi m mere m ji nabata ịza Black Sheep - Tuff King
- Onye dere ya, Michael Ngene na Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist na Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
Otiegwu King David Israel e ji Tuff King mara, akọwala ihe mere e ji akpọ ya Black Sheep dịka nwatakịrị nakwa etu o si chọpụta ihe aha ahụ pụtara.
Nwaamadị ahụ bụ onye Anambra steeti, kwuru na dịka nwatakịrị, ọ na-egwu oke egwu, ọ bụ nke a mere ka e ji malite ịkpọ ya Black Sheep.
"Oge ọbụla a na-akpọ m Black Sheep, amaghị ihe ọ pụtara", ka o kwuru.
Ọ gwara na ọ bụ ụbọchị onye nkụzi kọwara ihe black sheep pụtara, ka o ji kpebie, nabata ma malite ịhụ aha n'anya.
Tuff King mere ka o doo anya na njem egwu ya malitere dịka nwatakịrị.
N’okwu ya, “Ọ bụ egwu ka m ji akọwa onwe m dịka nwatakịrị”.
O kwuru na nne na nna ya chọrọ ka o bụrụ injinịa mana obi ya niile chọrọ ịbụ onye na-etiegwu.
Tuff King kwuru na nne na nna ya kwuru nyere ya nkwado zuruoke dịka ọ malitere iti egwu. O gwara anyị na e nwere oge nne na nna ya kwụsịrị ya iti egwu mana ka obere oge gara, ha malitekwara inye ya nkwado ọzọ.
Banyere ịhụnanya o nwere n'eguw, Tuff King kwuru na ihe mere o ji hụ egwu n'anya bụ bụ maka na egwu bụ ihe na-enye ya obi aṅụrị.
O kọwakwara na onye ọbụla na-eme egwu ọfụma dịka Nipsey Hussle na Burna Boy bụ mmadụ abụọ egwu ha na-amasị ya.
Tuff King kwuru maka mmekọ ya na Phyno nakwa mmekọ ya na ndị ọzọ na-eti egwu.
Banyere akụkọ banyere ndị na-eti egwu na-aṅụrịkarị ọgwụike, o kwuru ihe bụ uche ya banyere ya nakwa uru dị n'iti egwu.