Bullet-proof charms: Odeshi ọ na-arụ ọrụ n'ezie?

Ebe foto si, AFP
Dịka akụkọ na-efegharị na otu nwoke aghọọla ozu ebe ọ gara ịgwọ ọgwụ odeshi, ajụjụ ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ bụ ma ya bụ ọgwụ ọ na-adị ire n'ezie?
Otu dibịa a kpọrọ Emmanuel Odo gbara afọ 23, gbagburu Benedict Odunze bụ onye bịara ka ọ gwọrọ ya ọgwụ odeshi oge ọ na-anwale ma ọgwụ ahụ ọ ga-arụ ọrụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti Enugu steeti ebe ihe a mere bụ Daniel Ndukwe kwuru na Odo kwetara na o mere ya bụ ihe n'ezie n’okwu arụsị ya dị n’obodo Umuaram Ikem, n’Isi-Uzo, Enugwu steeti na nsonso a.
Ndukwe kwukwara na ndị uweojii anwụchiela ya bụ dibia onye kwetara na ya bụ ihe mere n’abalị 16 nke ọnwa Novemba afọ 2022 ebe Elekere 11 nke abalị.

Ebe foto si, AFP
Iji kọwa ihe nwereike ime mmadụ agwọ ya bụ ọgwụ, otu dibia ọdịnala bụ Olueze Durugwu si kọwaa “Ihe ndị mmadụ ji agwọ odeshi bụ ka mgbọ hapụ ịtụpu ha ahụ adịghị ama ama.”
O kwuru na a na-agwọkwa odeshi maka mma, nsi nakwa ihe mmerụ ahụ ndị ọzọ ghara idi ire nye onye a gwọrọ ya.
Dibia ọdịnala bụ Duruagwu kwuru na ọgwụ odeshi na-adị ire n’ezie.
Na nkọwa ya, o kwuru na e ji nnụnụ a na-akpọ Nkenu na ụfọdụ akwụkwọ agwọ odeshi.
Mana ọ gara n’ihu kwuo na odeshi nwereike ịnyụ ọkụ ma ọ bụrụ na onye gwọrọ ya maọbụ onye agwọrọ ya dajọọ nsọ ya.
“Ị sị na o nweghị ihe dịka odeshi, ị ma na ị na-atụ asị n’ihi na e nwere ndị a na-agba egbe mana egbe anaghị emetụ ha.”
“Ama m ihe m ga-enye gị taa , ị ṅụọ ya na mmanya, site n’elekere isii n'ụtụtụ rue elekere isii nke abalị, o nweghị ihe mmadụ ga-agba gị na mgbọ ga-aba gị n’ahụ mana a kpara gị n’aka n'oge ahụ gafee, i fuela.”
Odeshi ọ na-adị ire n'ezie?
Ndị ọkachamara sayensi na ndị ọdịnala akwụghị otu ebe n'okwu ma odeshi ọ bụ ihe dị ire n'ezie ka ọ bụ ịkpanye akụ n'akpa mpụ.
Dkt. Chukwueloka Umeh, Onye ọkammụta Sayensị na ngalaba 'Rọcket Science' ma bụrụkwa onye ọrụ Ịnjịnịa nke ngalaba 'Aeronautical engineering' kwuru na sanyesi kwenyere n'odeshi.
Ọ sịrị na n'ọrụ sayensi, e nwere ka “ikike ihe na-esị agbanwe site n’ụdịrị ọzọ banye n’ọzọ.”
O ji okwu a kwado na nchekwa ike nwereike isi n'ụzọ ọha amaghị chekwa mmadụ onye gwọrọ odeshi.
Ọkammuta Obasi Igwe nke mahadum 'University of Nigeria Nsukka' kwuru na na "Ihe onye kwenyere na ya, na-arụrụ ha ọrụ."
"Ọ bụ onyinye chukwu nyere mmadụ."
O kwuru na odeshi dị n'Akwụkwọ nso ụka Kraịst, dị n'okpukpere ndị ọzọ dịka n'ekpere ndị Kraisti, Budha wdgz."
"Ike dị n'okwu, dịrị n'asụsụ."
Ọ bụ okwu ka-eji kee ụwa.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
“Ihe ndị nwereike ịrụ ọgwụ odeshi"
Ọ bụ ngharịpụ ka odeshi gharịpụrụ Maazị Odunze, egosighị na o nweghị ihe dịka 'odeshi'.
Dkta Umeh kwuru na ọ bụladị Sayensi na-agharịpụ ndị mmadụ mgbe ụfọdụ, ma kọwa na nke a apụtaghị na Sayensi adịghị ire.
" Ụgbọala nwereike imebi n'ụzọ, ọ pụtaghị na sanyesi e jiri rụọ ya bụ ụgbọala adịghị ire."
"I nwereike ịṅụọ ọgwụ, ọ rụghị ọrụ n'ahụ, nke apụtaghị na sayensi adịghị ire n'okwu iji ọgwụ gwọọ ọrịa.
Na nkọwa ya, Duruagwụ kwuru na o nwere ihe nwereike tụbọ ọgwụ odeshi mee ka ọ ghara ịrụ ọrụ.
Ha gunyere:

Ebe foto si, Duruagwu
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Nke mbụ bụ onye na-arụ ọgwụ ahụ tụbọrọ onwe ya
“Otu nwoke na ndị nche na-achụ ndị ekperima gara ebe ha ga-agwọ ọgwụ ka agba ha egbe ka ọ ghara ịtụ ha, akanyechaa ha ọgwụ, ma were nnukwu egbe gba ha, o nweghị ihe mermere ha.
“A kanye yanwa bụ nwoke ọgwụ ahụ, ma gbaa ya egbe, egbe adọwasi ya ahụ, gbuo ya ebe ahụ.”
“Mgbe a gara n’afa jụọ ihe mere ya, achọpụta na ọ bụ di ụwa (di mmiri) enyi ya nwaanyị na-ewe iwe sị na ọ bara nara ya nwaanyị ya, ya wepụcha ọgwụ a gwọrọ ya ma ya ka ọ ghara ịdị ire.”
Nke abụọ: Onye a na-agwọrọ tụrụ onwe ya.
Nke atọ: O nwere ke ọ bụrụ ọgwụ na-asọ nwaanyị nọ na nso.
Nke anọ: O nwere ike bụrụ ọgwụ na-asọ ihe ndị ọzọ.
Agbanyeghị na Sayensi nakwa usoro ya ekwenyeghi n'okwu ịdị ire ọgwụ a, ọtụtụ ndị n'akụkụ ụwa dị icheiche nke gụnyere Afrịka kwenyere na ya.
Okwukwe nakwa okpukperechi ndị mmadụ bụ ihe dịrị ha ọkachasị dịka ihe onye kwenyere bụ ihe na-arụrụ ya.
Ọtụtụ ndị mmadụ ekwuola na ha nwere ike aka ebe ma jiri anya ha hụ na ọgwọ odeshi dị ire mana mmwepụta ihe ịgbaama kpọm kwem etu ya bụ ihe si arụ ọrụ bụ ihe dị omimi ọkachasị dịka a na-eche na okwu bụ okwu mmụọ.




























