Arịrị eriela ndị nwụnye ndị uweojii abụọ a gbagburu n'Aba ọnụ

Ebe foto si, Abia State Govt
Nwunye ndị uweojii abụọ a gbagburu n'Aba n a ezinaụlọ ha nọ n'arịrị obi na anyammiri dịka Gọvanọ Abia steeti bụ Alex Otti gara leta ndị mwakpo ndị ojiegbe metụtara na ngwụcha izu.
Ndị omekome bu egbe a maghị ndị ha bụ wakporo ma gbagbuo ndị uweojii abụọ , ma merụkwa abụọ ndị ọzọ ahụ a na mgbede Fraide n'okporoụzọ Opobo dị na Aba, Abia steeti.
N'okwu ya, Otti onye kwuru na ihe ahụ mere bụ "aka ọrụ ndị iro" Abia steeti, kwere nkwa ịzụ ụmụ ndị uweojii abụọ a gbagburu rue ogogo mahadum.
Otti kwekwara nkwa na a ga-achọpụta ndị kpara ya bụ mkpamkpa dịka a maliterela mekwa n'okwu ndị agha a gbagburu na steeti ahụ na nsonso a.

Ebe foto si, Abia Government
Etu ndị 'Unknown gunmen' si gbagbuo ndị uweojii abụọ n'Abia steeti

A gbatuola ndị uweojii abụọ n'Aba, Abia steet n' Opobo Junction dị n'ebe Ogbor Hill, n'okporoụzọ awara awara si Aba gawa Ikot Ekpene na mgbede Fraide.
Nke na-abịa abalị abụọ a gbagburu ọtụtụ mmadụ n'imo Steeti nakwa Ebonyi steeti dịka ndị bu egbe wakporo steeti ahụ.
Akụkọ kwuru na ọ bụ dịka ndị uweojii ahụ nọ ọrụ ịkwụsị ma nyocha ụgbọala n'okporoụzọ ahụ nke ha na-emekarị na mgbede ka ndị bu egbe ruru isii ji ụgbọala Siena wakporo ha.
Ya bụ ije ndụmadị tinyere ọgbaghara dịka ndị mmadụ wụrụ ọsọ ndụ, ebe ndị nwere ọdọ ahịa nakwa ndị na-azụ ahịa n'ahịa Ekere dị nso ebe ahụ kpọchiri ọdọ ahịa ha rie mbọ mbọ ọsọ.
Oge a kpọrọ ya, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abia steeti bụ Maureen Chinaka azaghị ekwentị ya nke ọ na-asa ozi onye ntaakụkọ anyị zigara ya n'ọbaozi Whasapp tupu akụkọ apụta.
N'Imo steeti, e gburu mmadụ isii dịka ndị ojiegbe wakporo Ama Awụsa dị na Gariki n'Okpuru Ọchịchị Okigwe n'abalị Wenezde.
N'aka nke ọzọ, e gburu mmadụ ise dịka ndị bu egbe wakporo ogige ndị uweojii n'Ishieke n'Ebonyi Steeti n'abalị Wenezde.
Kemgbe ọnwa Jenụwarị afọ 2021, tigbuo-zogbuo malitere ịrị elu n'Ọwụwa Anyanwụ Naijiria.
Ya bụ mkpamkpa eeriela isi ọtụtụ ndị uweojii, ndịagha nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu, ebe a gbarala ụfọdụ ogige ndị uweojii ọkụ.
Gọọmentị Etiti na ndịsi ọrụ nchekwa Naijiria eboola otu nnwereonwe Biafra bụ Ipob n'ịchafụ na alaka ọgụ ha bụ ESN ebubo na ọ bụ ha mụnyere ọkụ na-enwu n'Ọwụwa Anyanwụ mana Ipob agọọla ugboro ugboro na aka ha adịghị ya.
Akụkọ ka na-abịa































