Ihe mere ọtụtụ mmadụ alụbeghị di maọbụ nwunye - Kingsley Okonkwo
Ihe mere ọtụtụ mmadụ alụbeghị di maọbụ nwunye - Kingsley Okonkwo
Mgbe e biputara ya
Pastor Kingsley Okonkwo nke David's Christian Centre ekwuola banyere ọkpụkpọ oku ya nke na-enyere ndị nke Kraịst aka ịchọta ndị ha ga-alụ.
O nwere ogbe nzirịtaozi nke ndị nwere mmasị na-akwụ ego ruru narị puku naịra asaa 700,000 ($526) iji debanye aha ha.
Onye a na-enye ndụmọdụ gbasara mmekọrịta mmadụ na ibe ya nakwa onye nchụàjà kwuru banyere ogbe nzirịtaozi ahụ n'ajụjụ ọnụ ya na BBC News Igbo.
O kwukwara banyere ihe mere ọtụtụ ndị ntorobịa ji ahọrọ ịnọrọ onwe ha ma ghara ịbanye na mmekọrịta maọbụ alụmdi na nwunye.



