Anti Immigration Protests South Africa: Nigeria agbarụọla ihu n'ogbugbu nwafọ mba ha ọzọ na Cape Town

Onye uweojii mba South Africa na onye mbịarambịa
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Gọọmenti Nigeria akpọọla oku ka e nyochaa ogbugbu e gburu nwafọ Nigeria aha ya bụ Odueze Chimezie Odueze na mba South Africa.

Ụlọọrụ nnọchitanya Nigeria na mba ndị ọzọ kpọrọ oku ahụ maka ọnwụ Odueze Chimezie Odueze bụ onye nwụrụ n'oge ndị uweojii na-eti ya ihe na mba South Africa

Odueze Chimezie Odueze nwụrụ n'abalị itoolu nke nke ọnwa Ọktoba afọ 2026 na Parklands, Cape Town, dịka Ụlọọrụ nnọchitanya Nigeria dị na Johannesburg nke South Africa si kwuo.

Ha sị na e jidere Chhimezie n'ebe a na-ere ihe maka na ha na-enyo ya enyo na o ji ọgwụike. Ndị uweojii kpụụrụ ya gaa n'ụlọ ya mana ha ahụghi ọgwụike ọbụla.

E kwuru na ndị uweojii tiri ya ihe nke mere o ji nwụọ mgbe a na-akụ ya ihe.

BBC achọpụtabeghị kpọmkem ihe gburu ya maọbụ ihe butere ọnwụ ya nakwa ebubo niile a na-ebo ndị uweojii maka ya.

Mana ụlọọrụ nnọchitaanya Nigeria kọwara nke a dịka 'ihe mgbawa obi' ma kpọọ ndị gọọmenti mba South Africa ka ha mee nnyocha maka ọnwụ nwa amadị a ma mee ka onye ọbụla dara iwu taa ahụhụ so ya.

Ozi ha wepụtara kwuru sị "ebubo ọbụla e boro mmadụ nwere usoro e si enwete ikpe ziri ezi, onye ọbụla kwesiri ịga zara ọnụ ha n'ụlọikpe ma ghara iji aka ha kpebie ikpe"

Ha gwakwara ụmụ Nigeria nọ na South Africa ka ha dere juu, rube isi n'iwu ma gwa ndị ọrụ nchekwa mgbe ọbụla ha na-atụ egwu mwakpo maọbụ iyi ndị mbịarambịa egwu.

Mgbe ndị uweojii mba South Africa na-enyocha mmadụ.

Mana n'ọnwa Julaị afọ a, Nigeria katọrọ ogbugbu e gburu ndị Nigeria abụọ. Gọọmenti kwuru na ndị uweojii Tshwane Metro Police dị na Pretoria gburu Emeka Charles Iroegbu na Musa Yunana Joe ka e gburu Witbank.

Na nsonso a ụmụafọ South Africa mere ngagharịiwe megide ndị mbịarambịa na mpaghara dị iche iche na mba ahụ.