You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Anyị na-atụzi ụjọ ịlọta ala Igbo n'ihi nsogbu nchekwa n 'Ọwụwa Anyanwụ - Ndị Igbo bi ofesi
Henry Ahamefule , ama dịka Ikenga Imo, bụ onye nchịkọta ndị Igbo bi na Morocco etiela mkpu gbasara oke ogbugbu mmadụ na mkpamkpa ndị ọzọ na-akpa n'Ọwụwanyanwụ ugbua.
Nsogbu nchekwa na-arị elu n'Ọwụwa-Anyanwụ.
Na nso nso a, e gburu ihe karịrị ndị ntorobia asaa n'Awomama, Imo steeti, ebe a tọọrọ ihe karịrị mmadụ 30 nọ n'ụgbọala atọ na Lokpanta Abia steeti.
Ahamefule sị na ụdị akụkọ ndị abụghị ihe e ji mara ndị Igbo.
Dịka o si kwuo, "Ndị niile bi mba ofesi ugbua, ha na-achọ ịlọta ụlọ ugbua, ụjọ na-atụzị onye ọbụla." "Ụfọdụ na-eme ha lọta, ha anọrọ na Legọs, ụfọdụ anọrọ n' Abụja, maka na Igbo enweghizi ezi nchekwa".
Ọ gara n'ihu kwuo na nwanne igbuzi nwanne abụghị ihe e ji mara ndị Igbo, na "ọ bụ arụ".
Ọ rịọrọ arịrịọ "ka anyị kwụsị igbu ụmụnne anyị".
Ahamefule sị na "Ọ bụ eziokwu na anyị na-azọ ka anyị nwete ihe anyị na-achọ, mana anyị nwetezie ya, enweghizi ndị nọ, kedụzi uru ọ bara?" "Onye ọbụla eche echiche, ka anyị kwụsịnata ihe, onye ọbụ mịba mma ya n'ụbọ".
Ahamefule kọwara etu ndị Igbo niile nọ na Morocco si ebikọ ka ụmụnne na etu ha si enyere onwe ha aka na Morocco.
Gbasara ntuliaka 2023, Ahamefule sị na ha dị njikere ịlọta Naịjirịa bịa soro tụọ vootu na ntuliaka onyeisiala 2023.
Ọ sị na nke a dị oke mkpa maka ịgbanwe ọnọdụ Naịjirịa, ka e nwee mgbanwe ọfụma na Naịjirịa.