Ojoto, Obodo e ji ịrụ ụzọ ama odogwu

Aha onyonyo, Anambra steeti: Ojoto, obodo e ji iru ụzọ ama odogwu
Mgbe e biputara ya

"Irụ ụzọ bụ ihe anyị ji ama aka n'Ojoto. Ọ bụrụ na ị rụbeghị ụzọ, ị mara na i sobeghị n'ihe a na-eme".

Nke a bụ ọnụokwu onye ntorobia bụ Anayo Chukwujama bụ onye kọwara BBC Igbo ka ịrụ ụzọ si dị ndị Ojoto, okpuruọchịchị Idemili Saụt, Anambra steeti, oke mkpa.

Onyeisi ọgbakọ ndị Ojoto bụ Chukwudi Maduabuchi kwuru na isi sekpụ ntị na ịrụ ọrụ obodo ọbụla bụ ntụkwasị obi ndị mmadụ nwere na ndị ọchịchị ha.

Ọ sị na, "mgbe anyị hụrụ otu ụzọ anyị dị, ụmụnne anyị sị ka ha malite iru ya maka na anyị agaghị ahapụrụ gọọmentị ihe niile".

Otu ahụ ka ha si malite ịrụ ụzọ niile, malite n'otu rụọ abụọ na atọ.

Ụzọ ndị ojoto rụrụ
Nkọwa foto, Ndị Ojoto na-arụ ụzọ ijio ama aka

Chukwudi sị na ebumnobi ha bụ ịrụcha ụzọ niile n'Ojoto, agbanyeghị na ọ dị oke ọnụ.

O kwuru na "ụmụnne anyị zuru ka e mee".

Ihe onye ọbụla ma bụ na ọ bụ gọọmentị na-arụ ụzọ maka oke ego so ya bụ ọrụ.

Ọzọ bụkwa na ọtụtụ mgbe gọọmentị ụfọdụ anaghị achọ ka ndị mmadụ tinye aka n'ọrụ dị ọtụ ahụ.

Mana Anambra steeti emegharịala ya bụ iwu edeghị ede nke mere na ha pụrụ iche na nke a.

Odeakwụkwọ ukwu bụ 'Permanent Secretary' nke Ministry n'ahụ maka ọrụ na Steeti ahụ bụ Laz Okafor sị na "ọ bụ n'ọchịchị Peter Obi ka a malitere ndị obodo ịrụ ụzọ ha".

Okafor sị na otutu obodo ndị ọzọ n'Anambra arụọla ọtụtụ ụzọ be ha.

O kwuru na gọọmentị Peter Obi na-enyere ndị obodo nkwado site na-iruru ha kilomita ole ha ruru. "ọ bụrụ na obodo ruo kilomita iri, gọọmentị ga-arụkwara ha iri", ka Laz kwuru mgbe BBC Igbo kpọrọ ya n'ekwentị.

Gbado anya kirie ihe onyonyo a n'uju ya.