Etu e siri tọrọ ụkọchukwu Katọlịk n'Okigwe n'ụbọchị Fraịde

Ebe foto si, Jude Kingsley Maduka/Facebook
Ndị omekome atọrọla ụkọchukwu ụka katọlik bụ Jude Kingsley Maduka n'ụbọchị 19 nke ọnwa Mee bụ Fraịde n'ogige ụka Adoration ya nke dị n'obodo Ogii nọ n'okpuruọchịchị Okigwe, Imo Steeti.
Akụkọ na-ekwu na ọ bụ mgbe Maduka gara njem nleta n'ogige Adoration ya ka ndị omekome kpara mkpa mkpa a.
Ọ bụ n'akwụkwọ ozi nke ode akwụkwọ ụka katọlik nke Okigwe Diocese, bụ Princewill Iwuanyanwụ, depụtara ka ha kwuru nke a.
E chiri Maduka ụkọchukwu n'ụbọchị 22 nke ọnwa Sepụtemba afọ 2012.
Maduka bụkwanụ ụkọchukwu na-elekọta ụka Chrịst the King Catholic Church nke Parish Ezinachi/Ugwuago dị n'okpuruọchịchị Okigwe.
BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Imo steeti, bụ Henry Okoye, n'ekwentị.
O kwuru na ndị omekome tọrọ ya ebe elekere asatọ nke abalị n'ụbọchị Fraịde. O kwukwara na ha amalitela atụmatụ ịgbapụta onye ụkọchukwu ahụ, nakwa ijide ndị tọrọ ya.
Ọ gara n'ihu ikwu na ka ọ dị ugbua, o nwetabeghi ozi ọbụla n'aka ndị tọrọ ụkọchukwu Kingsley.




























