Anwara m ugboro anọ tupu m merie asọmpi nwaanyị kacha mma na Naịjirịa - Ada Eme
Ada Eme dị afọ 24 bụ onye meriri asọmpị nke Nwaanyị Kacha Mma na Naijirịa nke afọ 2022 akọọrọla BBC Igbo etu njem ya siri bido.
Eme bụ onye obodo Abịrịba nke dị n'Abia Steeti kwuru na ọ bụ mgbe ọ lere ihe onyonyo mgbe Agbani Darego meriri dịka nwaanyị kacha mma n'ụwa nile nke afọ 2002 ka mmụọ ya kpalịrị ịzọ asọmpị nwaanyị kacha mma na Naịjirịa.
O kwuru sị, " Kamgbe ahụ ka m bidoro gwawa ndị ezinụlọ m na m ga-emeri dịka nwaanyị kacha mma. Ekwugidere m ya nke mere na ọ bụ nne m wetere ego m jiri zụta akwụkwọ eji azọ ọkwa a".
Eme kwuru na ọ nwara ugboro ugboro kama na ọ bụ na nke anọ ka o meriri.
O kwukwara na ụfọdụ ihe a na-ekwu maka ndị na-azọ ọkwa nwaanyị kacha mma na Naijirịa abụghị eziokwu.
Lee akụkọ nwaada a mara mma n'uju ebe a.
Ndị mere akụkọ a bụ Makuochi Okafor, Vining Ogu na Chioma Nkemdilim.




