Divination: Lekwa sayensi dị n'ịgba afa

Gịnị bụ afa?
“Afa bụ ụzọ ndị mmụọ na ndị mmadụ si enwe mkpakọrịta. Ọ bụ ụzọ ndị ichie si agwa ndị dị ndụ okwu. Ihe ndị dibia na ndị mmụọ anaghị ahụ anya ji akpa nkata”.
Nke a bụ ọnụokwu dibịa nakwa onye na-agba afa bụ Chuwkwunwike Aniesona bụ nwantorobia, onye si na dibia afa mara ya ama n’afọ nne ya.
Aniesona sị na nke mbụ bụ na ịgba afa na-ama ama.
“Ọ bụrụ na ọ maghị gị, ịgaghị emeli ya”.
Ihe a ka ọ gwara BBC Igbo na mkparịtaụka anyị na ya.
Ọ sị na nke abụọ bụ na onye ya bụ ihe mara kwesiri ịchọta oke dibia ọzọ ga-agbaziri ya ụzọ, kuzikwara ya mkpụrụ okwu dị na ya ịgba afa.

Mkpụrụ okwu afa?
Aniesona kwuru,“Onye afa mara ga-ebu ụzọ mee agwụ be nna, na nke nne. Mgbe i mechere nke a, ịrụzịa agwụ, e were bunyezie onye ahụ ọfọ ọ ga-eji mee dibia.
" Mgbe ahụ ka ọ ga-etozu igote “ugili” maọbụ mkpụrụ ihe e ji agba afa."
Aniesona kuziere anyị mkpuru okwu afa dị iche iche.
Dịka o kwuru, “afa nwere asụsụ nke ya dị iche. E nwere mkpụrụ okwu dị 256.
Ọ sị na ịmuta okwu afa bụ ịmụta mkpuru okwu ndị a dịka otulu obii, Otulu ede.
Otulu obii bụ ihe buru ibu.
Obala ede buru ihe na egbu mmadụ.
Odi ọbala bụ “nwanne nne gị, yaabụ nna gị ochie”.
“Otule ede bụ ‘akụ”.
Otule nwere n’ime ya otule ede, otule obi, otule ọbala, otule ururu, otule agwụ, otule ogoli etc
“Ogeli” nwere “ogoli tule” nke pụtara ịkọ akụkọ, Ogeli obii, pụtara ihe ji mmadụ.
Okwu ndị dị na ya bụ mkpụrụ ede e ji agba afa.
Kedu ka e si akọwa afa?
Ya bụ mkpụrụ ede Enugu Agidi na-akpọ ujili na-adị mkpụrụ anọ.
Anọ ahụ na-adị n’otu eriri ekere iche iche, nke mere ha iri na isii.
Otu ya bụ ede siri nọrọ mgbe a ghara ya na-akọwa ihe afa na-ekwu.

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ịkọwa afa adịchaghị mfe mana e nwere ike ịmụta ya.
Onye na-amụ ịgba afa ga-ebu mkpụrụ okwu 256 a n’isi mara ihe edè afa ya na-ekwu ma o kpuchie ihu n’ala maọbụ o chewe ihu n’elụ.
Ọ bụrụ na ede maọbụ ugili, eriri nke mbụ dị n’aka nri, ọ bụrụ na atọ n’ime ya nọketere dibia kpuchie ihu n’ala, otu chee ihu n’eli, mara na nke ahụ pụtara “Ọbara”.
N’eriri nke abụọ so ya, ọ bụru na edè abụọ nke nọ n’ala (ndị nọ dibia nso) kpughe ekpughe, abụọ dị n’elu kpughe ekpughe nke ahụ pụtara “Tule”.
Yaa bụ “Ọbara tule”nke pụtara dibia.
Abụọ dị na etiti kpuchie, abụọ dị n’elu na ala kpughe nke a bụ Odii.
O nweghị ihe nke apụtara
Abuọ dị n’ala kpuchiri ekpuchi, abụọ dị n’elu kpughe ekpughe nke a pụtara “ururu”.
Ọ bụrụ na ikpọkọọ “Odii” na “ururu” nke ahụ pụtara “ikwu nne.
Na nchịkọta okwu ihe edè anọ ndị a kwuru bụ, "ọbala tule "(i bụ dibia), "Otule Odii" (dibia buru ibu) , "Odii ururu" (Ikwu nne gị) "ọbara ururu" (ahihia na ọgwụ).
Ya bụ nke a pụtara na onye bịara ya bụ iji bụ oke Dibia ji mgbarogwu na mkpaakwụkwọ agwọ ọrịa, si ikwu nne ya.
Nke a pụtara na otu ahiri ugili maọbụ edè anaghị akọwa okwu.
A na-ejiko ya ọnụ iji mata ihe ọ na-ekwu.
Aniesona sị na ọ bụrụ na ọ bụ ndị mmụọ na-eme ka mmadụ ghọta ihe ugili na-ekwu agbanyeghị na onye ahụ ma ihe mkpuru okwu ya pụtara.

Kedụ onye na-achọ ịgba afa?
Ọ bụ onye nwere nsogbu bụ onye na-abịa agba afa.
Onye chọrọ ịmata nsogbu dịịrị ya.
Aniesona sị na ọ nwere ike bụrụ onye ahụ adịghị eme ọfụma maọbụ onye ahia anaghị aga n’ihu.
“Onye ahụ bịa jụọ ndị nna nna ya, agwa ya ihe ọ ga-eme iji wepụ ụchụ.
Onye ya na ndị nna nna ya dị na mma anaghị enwe nsogbu”.

Asụsụ afa ọ bụ “speaking in tongues” ndị ụka na-eme?
Aniesona sị na asụsụ afa abụghị “speaking in tongues”, ma onye aghọtaghị ya nwere ike iwere ya ka “speaking in tongues”.
Ọ kọwara na ọnye na-agba afa na-ege ndị mmụọ ntị mana "onye na-esụ n'ire” na-ekwu okwu nke ọ maghị ihe ọ pụtara.
Ọ sị na ọ ka mma ige Chineke ntị karịa ịgwa ya ihe ọ ga-eme maka na o nweghị ihe mmadụ ma ọ na-agwa Chukwu”.
“Onye gee Chineke ntị, ọ mụta ihe. Mana mkpọtụ na-eme n’ụwa ugbua anaghị ekwe ka mmadụ gee Chi ya ntị”.
Afa bụ ihe ndị Dibia na ndị mmụọ ji akpa nkata, dịka Aniesona siri kwuo.
Ihe ndị ọzọ anyị ma maka ịgba afa

Adebayo Olusegun Ajala bụ onye nchọputa na ihe omimi na-amasị sị na ịgba afa na mmụta Sayensi bu otu.
O ji “Binary numbers” nke e ji rụọ intaneti na kọmputa kọwa ya.
Ọ sị na, “edè dị anọ mana ọ bụrụ na ịwụọ ya, nke kpudoro ihu n’ala bụ “0” ebe nke chere ihu n’elu bụ “1”.
Ọ sị na ọ bụrụ na atọ n’ime anọ ahụ kpuo ihu n’ala nke ahụ pụtara “negative” ya bụ mba.
Ọ bụrụkwanụ na atọ maọbụ anọ chee ihu n’elu, nke ahụ pụtara “positive” nke pụtara eeh, gị gawa n'ihu.
Ọ bụrụ na abụọ n’ime anọ ahụ chewe ihu n’elu nke ahụ pụtara na ọnwereike ire isi abuọ, gị chee ya eche.
Onye bụ Chuwkwunwike Aniesona?

Chuwkwunwike Aniesona bụ oke dibia bụ onye Enugwu Agidi dị n’Anambra Steeti.
Ọ gụrụ "Purchasing and Supplying" na Polytechnic dị na Nekede.
A mụrụ ya n’afọ 1991.
Ọ sị na ya bụ agwụ dibia mara ya n’afọ 2014 mgbe o jiri ọrịa ịba anya edo tituo ya nke bugara ya ọtụtụ ụlọọgwụ nakwa ụlọụka.
Ọ sị na ya bụ ọrịa mere ka ọrụ ya daa pịa pịa.
Ọ mechere gaa n’omenala bụ ebe a sị ya na ọ bụ mmụọ be ha na-akpọ ya.
Mgbe ọ bidoro ife alụsị ndị a na 2017 ka ọrịa ndị ahụ lara kpamkpam.
Ugbua Chuwkwunwike Aniesona alụọala nwaanyị mụta ụmụ ise.
Ọ bụ ya bụ onyeisi alụsị atọ dị n’Enugwu Agidi.
Ya na nwunye ya ebiela afọ iri ugbua.





























