Ihe ise Atiku Abubakar kwuru banyere APC na atụmatụ Tinubu maka ego enyemaka

Ebe foto si, Atiku Abubakar /Facebook
Onye bụbụ osote Onyeisiala Nigeria, ma jiri otu ndọrọndọrọ ọchịchị African Democratic Congress (ADC) na-azọ ọkwa onyeisiala Nigeria na ntuliaka afọ 2027 bụ Atiku Abubakar akatọọla atụmatụ gọọmenti Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu maka iwepụ ego enyemaka n'ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala bekee kpọrọ 'oil subsidy'.
Atiku Abubakara mere ka a mata nke a n'oge ọ gwara ụwa niile nakwa ndị ntaakụkọ okwu ma tinye ọnụ ya n'ihe dị icheiche na-eme na Nigeria.
Ọ tụrụ arịrị na Onyeisiala Bola Tinubu wepụrụ ego enyemaka mmanụ ụgbọala mana o ibughị ụzọ chekwaa ezinaụlọ, ndị ọrụ, ndị ọrụ ugbo na ndị na-azụ ahịa bụ ndị atụmatụ ahụ kachasị emetụta ma tinye n'ihe ụkọ.
N'akụkọ a BBC News Igbo ga-enwetere gị ihe ise gbara ọkpụrụkpụ n'ihe niile Atiku Abubakara kwuru.
O ruola mgbe gọọmenti kwesiri itule usoro ọchịchị ha
Atiku Abubakar kwuru na oge eruola mgbe Gọọmenti Onyeisiala Bola Tinubu kwesiri itule ihe megoro kamgbe o wepụrụ atụmatụ enyemaka n'ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala bekee kpọrọ 'fuel subsidy' ma wete atụmatụ ga-enyereaka wedata ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala.
N'okwu Atiku "mgbe mbụ m kwuru na gọọment kwesiri itule etu o si wepụ ego enyemaka e ji enwedata ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala Onyeisiala Bola Tinubu sị na 'm amaghị ihe ọbụla maka akụnụba".
"Mana ihe megoro kemgbe ahụ na-arịọ ọsịsa ya".
"Otu jikọtara ndị ọrụ bụ 'Nigeria Labour Congress, NLC' bụ ndị na-arịọ ka enyere ndị ọrụ aka maka ahụhụ ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala riri elu na-ata ha esokwa na ndị na-amaghị maka akụnụba?"
"Ndị na-ere mmanụ ụgbọala bụ ndị kwadoro ka e nyereaka kwalite ụlọọrụ na-esipụta mmanụ ụgbọala ma hazie ọnụ ahịa a na-ere ya esokwa na ndị amaghị maka akụnụba".

Ebe foto si, others
"Ndị na-arụpụta ngwaahịa bụ ndị sị na-ego ha ji azụ mmanụ ụgbọala nakwa ego ha ji arụpụta ihe ha na-ere mere na ha adịghị enwete uru esokwa na ndị amghị maka akụnụba?"
"Ma ezinaụlọ dị icheiche ma ndị ọrụ na-ebekwa maka ọnụ ahịa ihe nri ma ihe ndị ọzọ abụkwa ndị amaghị maka akụnụba?
Atiku gara n'ihu kwuo na ugbo "mgbe ọbụla ndị ọchịchị bidoro na-ahụ onye katọrọ usoro maọbụ atụmatụ ọchịchị ha dịka ndị amaghị ihe; mara na anyị enweela nnukwu nsogbu enweghi onye ndu".
Atiku sị na nke bụ eziokwu bụ na "ndị ndu maọbụ ndị nọ n'ọchịchị kwesiri inwe ume inabata mkpụrụ ọbụla atụmatụ ha hiwere n'ọchịchị mịtara, ma nwee obi igbanwe ihe".
Ndụmọdụ Atiku nyere Onyeisiala Tinubu

Ebe foto si, Atiku Abubakar/Bayo Onanuga/ facebook
Atiku Abubakar ji ohere ahụ nye Onyeisiala Bola Tinubu ndụmọdụ pụrụiche ma kwuo na ọ họrọ "Tinubu naanị ọwa asatọ n'ọkwa ka gọọmenti bịa n'isi njedebe.
N'okwu ya "Tinubu kwesiri ime ihe ọbụla ọ ga-emewu ma beleta oke ihe ụkọ dị na Nigeria".
"Ya ejikwala ihere maka na ọ bụ Atiku Abubakar wepụtara atụmatụ ahụ".
"Ya were atụmatụ ahụ, gbanwe aha ya maka na ezigbo atụmatụ dị mma ka ga-adị mma n'agbanyeghị na ọ bụ onye na-agba gọọmenti ụkwụ wepụtara ya"
"Ọ bụrụ na ego enyemaka ga-eme ka ọnụ ahịa mmadụ ụgbọala dị ọnụ ala, biko mee ya".
Ihe m ga-eme ma ọ bụrụ na m emerie ntuliaka 2027 - Atiku
Atiku Abubakar kwuru sị "Ọ bụrụ na m emerie na ntuliaka Onyeisiala nke afọ 2027, a ga m eme ka akụnụba Nigeria banyewakwa n'udi ọ gaghị abụ nke a nọ n'Abuja n'agụpụtara ndị mmadụ n'akwụkwọ; kama n'udi ezinaụlọ ọbụla na Nigeria ga-amara ma rite erere ya".
"Akụnụba ọbụla bụ ebe a na-arụpụta ihe bụ nke na-enye ọrụ. Nke ego gọọmenti na-enwete bụ maka ọdịmma onye ọbụla, ebe a ga-eji ike mmefu ego ụmụ amaala Nigeria were na-agbakọ ka akụnụba si eto"
"Nke maka na ụmụ Nigeria adịghị adị eji ihe e dere dịka ndekọ ebi ndụ ha.



























