You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Chioma Ifemeludike: Ka anyị jụọ ajụjụ anyị
Mkparịtaụka BBC News Igbo na Chioma Ifemeludike na-azọ ọkwa gọvanọ Anambra Steeti na pati African Action Congress (AAC)
Ka anyị jụọ ajụjụ anyị bụ emume mkparịtaụka BBC Igbo na ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti na-enwe iji nye ha ohere ka ha kọwaara ọhanaeze ndị Anambra Steeti ebumnobi ha ma ọ bụrụ na ha nweta mmeri na ntuliaka ọkwa Gọvanọ a ga-eme n'ụbọchị Satọde Nọvemba 8, 2025 na steeti ahụ.
Mkparịtaụka nke a bụ anyị na Chioma Ifemeludike ji aha African Action Congress (AAC) azọ ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti nwere ya.
Ọkpụrụkpụ okwu Chioma Ifemeludike kwuru na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere
Banyere ihe mere o ji chọọ ịbụ Gọvanọ Anambra Steeti, Nwaada Ifemeludike kwuru na ọchịchị mara ya ama.
O kwuru na ọchịchị ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti bụ oku chi ya kpọrọ ya iji weta ezi mgbanwe ma wulite ọnọdụ azụmahịa, nchekwa, akụnaụba nakwa agụmakwụkwọ n'Anambra steeti.
O kwuru na ọ ga-agbanwe ọnọdụ ụlọakwụkwọ gọọmenti steeti ma kwuo na ọchịchị ya ga-eme ka a agụmakwụkwọ Praịmarị na Sekondri bụrụ na-efu.
Ihe ọzọ o kwuru bụ na ọ ga-eweta ezi nchekwa ma buo agha megide ndị omekome na-akpa mkpamkpa n'Anambra Steeti.
Banyere ndị ọrụ gbanụgbanụ gụnyere Ọcha Brigade na ndị otu ha, Chioma Ifemeludike kwuru na ọ ga-ekpochapụ ha ma hazigharịa ndị ọrụ nchekwa obodo ma nye ha ọzụzụ zuru okè.
Nwaamadị Ifemeludike kwuru na ọchịchị ya ga-arụ n'okporoụzọ na ọtụtụ ihe ndị ọzọ ga-enyere aka wulite obibi ndị Anambra.
O mekwara ka ọ doo anya na ọchịchị ya ga-akwụsị ụmụaka na-arịọ arịrịọ n'okpuruụzọ n'Anambra.
O kwuru na ọchịchị ya ga-enye ndị ọrụ ugbo ezi nkwado iji mee ka Anambra Steeti bụrụ ọkaibe n'ihe gbasara ịkọ ihe n'ubi.