You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
George Moghalu: Ka anyị jụọ ajụjụ anyị
Mkparịtaụka BBC News Igbo na George Moghalu na-azọ ọkwa gọvanọ Anambra Steeti na pati LP
Ka anyị jụọ ajụjụ anyị bụ emume mkparịtaụka BBC Igbo na ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti na-enwe iji nye ha ohere ka ha kọwaara ọhanaeze ebumnobi ha ma ọ bụrụ na ha nweta mmeri na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti a ga-eme n'ụbọchị Satọde Nọvemba 8, 2025.
Mkparịtaụka nke a bụ anyị na George Moghalu ji aha Labour Party azọ ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti.
Ọkpụrụkpụ okwu George Moghalu kwuru na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere
George Moghalu ji ohere mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere kwupụta ọtụtụ ihe ọ ga-eme ma ọ bụrụ na ọ nweta mmeri na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti.
Moghalu kwuru na ọchịchị ya ga-ebu agha megide ndị omekome ma weta ezi nchekwa n'Anambra Steeti.
O kwukwara na ọ ga-agba mbọ iwulite udo, ịhụnanya nakwa ịdị n'otu n'etiti ndị Anambra Steeti niile.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ ga-eme ka ndị ntorobịa nwee ọrụ, wulite ọnọdụ agụmakwụkwọ nakwa azụmahịa.
O kwukwara na ọchịchị ya ga-anabata ma nye ụmụnwaanyị ohere iji hụ na Anambra Steeti na-aga n'ihu.
Moghalu mere ka ọ doo anya na ọchịchị ya ga-agba mbọ hụ na a tọhapụrụ Mazị Nnamdi Kanu iji hụ na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa nwere ezi udo.
Oge anyị jụrụ ya ihe mere o ji hapụ pati APC banye LP iji zọọ ọkwa Gọvanọ, Moghalu kwuru na ọ bụ maka na pati LP bụ pati ọtụtụ mmadụ hụrụ n'anya.
O kwere nkwa na ọ ga-agbanwe ọnọdụ obibi ndị Anambra ma mee ka ndị ọrụ, ndị azụmahịa, ụmụakwụkwọ na ndị ntorobịa rite uru ọchịchị onyekwuouche ya.