You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Mama m na-egosipụta agwa ya dịka ihe mere eme - Nuel Iyke
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
Onye na-eme ihe nkiri a ma ama na soshal midịa bụ Nuel Ikechukwu, a maara dịka Nuel Iyke ekwuola ihe mere ya na nne nna ya jiri malite ime ihe nkiri.
Oge ya na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche, Nuel Iyke kwuru na ya malitere ime nkiri dịka ihe o ji egbu oge.
"Amalitere m ime ihe nkiri n'ihi enweghị ihe m ji oge m eme. Ana m esiri mmadụ nri oge ahụ".
"M sichaa nri, ana m anọ nkịtị tupu onye m na-esiri nri alọta n'oge mgbede. Ọ bụ mgbe ahụ ka m gwara onwe m ka m tinye ihe na TikTok".
"Ihe nkiri m buru ụzọ mepụta bụ otu ụda na-ewu ewu oge ahụ na-atọ ọchị. M tie ah! Mmadụ 60,000 hụrụ ya. Nke ahụ gbara m ume."
Nuel Iyke, onye nne nna ya na-akpọ Chidiebere kwuru na oge mbụ ya na mama ya mere ihe nkiri bụ mgbe ọ gara ileta ya.
"Oge m gara ka m hụ nnenna m n'obodo anyị, o teela m siiri ya nrị, m sịzie ka m siere ya nri".
"Ọ bụ oge ahụ ka m sịrị ka m sete etu m si esiri ya nri ebe ọ bụ na m na-emezi ihe nkiri. Ọ bụzi mgbe m hụrụ etu o si amasị ndị mmadụ, ka m bịara tinye uche m na ya."
Nuel Iyke bụ nwaafọ Ohuhu dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Umuahia North n'Abịa Steeti.
O kwuru na nna ya nwụrụ oge ọ ka bụ nwata ebe nne ya nwụrụ oge ọ nọ na mahadum, mana o bidoro ime ihe nkiri oge ọ na-esiri mmadụ nri.