Gọvanọ Hope Uzodimma ekwela nkwa ịnye ndị ekperima 'amnesty' ma ha chegharịa n'abalị iri

Mgbe e biputara ya
Gọọmentị Imo steeti bụ Hope Uzodimma echerela ndị ekperima niile nọ na Steeti ahụ aka udo ịnabta ha ma gbaghara ha mmehie ha ma ha chegharịa.
Gọvanọ steeti ahụ bụ onye kwuru nke a ụbịọchị Sọnde sị na ya nyere ndị ekperima a ụbọchị iri ịchegharị maọbụ ya akpọtara ha ndị agha.
Uzodimma sị na ya chọrọ iji ohere ahụ nabata ndị niile chọrọ ichegharị iji mee ka udo tọrọ atọ bata na steeti ahụ.
























