Ọ dịzi Gọvanọ Uzodimma n'aka ikpebi ma ọ ga-achụ Ọkaikpe Ukwu Imo Steeti - Ndị omeiwu

Gọvanọ Imo Steeti na Ọkaikpe Ukwu Steeti

Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị ụlọomeiwu Imo Steeti nọọrọ n’ụbọchị Tọzde tinye atụmatụ ka a chụọ Ọkaikpe Ukwu nke steetị ahụ Theresa Chukwuemeka-Chikeka n’ebubo na ọ tụrụ asị maka afọ ole ọ dị nakwa akparamagwa ọjọọ.

Na nzukọ ha nwere, ọkara abụọ n’ime atọ ha tụrụ vootu sị ka e tinye anya na nyocha kọmitii ahụ mere banyere mkpesa otu Civil Society Engagement Platform (CSEP) dere megide Ọkaikpe a.

Atụmatụ ahụ rịọrọ ka Gọvanọ Hope Uzodimma wepụ Ọkaikpe Chukwuemeka-Chikeka n’ọkwa maka ebubo ịda iwu ngalaba 292 nke iwu 1999.

Ndị a tụkwara arọ ka e zigara otu na-ahụ maka ndị ọkaikpe na Naịjirịa bụ National Judicial Council (NJC) nchọpụta ahụ maka ileba ya anya.

Kedụ ihe butere okwu a?

Mgbe a na-edu ya n'iyi ọrụ

Otu a bụ CSEP wetere mkpesa megide Ọkaikpe Ukwu Imo steeti bụ Theresa Chukwuemeka Chikeka maka ịtụ asị afọ ole ọ dị bụ nke e ji maka ya chụọ ndị ọkaikpe n’ọrụ nakwa na e nyocha ndị ọzọ.

Ndị omeiwu nyefere mkpesa ahụ n’aka kọmitii ka ha nyocha ebubo dị na mkpesa ahụ bụ nke ha kpọrọ ọtụtụ ndị ka ha bịa zara ọnụ ha na nyocha ahụ.

Ha chọpụtara n’ezie na Ọkaikpe Theresa gbanwere afọ a mụrụ ya site n’ụbọchị 27 Ọktoba, 1957 ka ọ bụrụzie n’ụbọchị 27 Ọktoba, 1958 site na nkwupụta n’ụlọikpe na-agbanyeghi na ọ gụchaala ngalaba ọkaiwu.

Ndị kọmitii a kpọrọ Ọkaikpe Chukwuemeka-Chikeka oku ka ọ bịa zara ọnụ ya n’ebubo ndị a mana ọ jụrụ ajụ ma kwuo na ọ bụ naanị komitii ngalaba NJC hiwere ka ọ ga-aza oku.

N’ihi nke a, ndị kọmitii ahụ tụnyere arọ ka a chụọ ya n’ọkwa Ọkaikpe Ukwu nke Imo Steeti maka na ọ kpara agwa megide iwu Naịjirịa.

'Ọ dịzi gọọmentị Imo n'aka ikpebi ha ga-eme n'okwu a'

Otu onye omeiwu n’Imo Steeti na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ha nwetere mkpesa banyere Ọkaikpe a ịgbanwe afọ ole a mụrụ ya.

“Anyị nwetere mkpesa banyere Ọkaikpe Ukwu a, anyị wee hiwe kọmitii ga-eleba anya na mkpesa ahụ.

“Kọmitii ahụ degaara ngalaba NJC nakwa isiụlọorụ ndị ọrụ Bekee n’Imo steeti akwụkwọ bụ nke ha zaghachịrị ozi ndị ahụ.

“N’ikpeazụ, nyocha komitii mere gosiri na e nwere ndịiche dị n’afọ ole Ọkaikpe a kwuru na a mụrụ ya.”

Omeiwu a gara n’ihu kwuo na ha emeela ihe dịịrị ha banyere okwu a ma zigaara gọọmentị Imo Steetị nakwa otu jikọtara ndị ọkaikpe ihe ha chọpụtara.

O kwuru na ọ dịzi n’aka Gọọmentị Imo Steetị na otu na-achịkwa ndị Ọkaikpe ikpebi ihe a ga-eme Ọkaikpe a - maọbụ ịchụ ya n’ọrụ maọbụ inye ya ntaramahụhụ masịrị ha.