Nkanu attack: Ihe anyị maka mwakpo a sị tara isi ndị ọrụ nchekwa abụọ n'Enugu

N'ụbọchị 27 Sepụtemba, akụkọ maka etu ndị ojiegbe si wee wakpoo ebe ndị ọrụ nchekwa na-anọ n’okporọụzọ Obeagu n'Enugwu steeti ma gbuo ndị ọrụ nchekwa abụọ gbara n'ụbọchị Webezde.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Enugu bụ Daniel Ndukwe gbara BBC Igbo ama na ha ma maka mwakpo mere n’akụkụ Amodu nke okpuruọchịchị Nkanu West.
Ụzọ ebe a sị mwakpo a mere si Obeagu gawa Amodu.
Ozi Ndukwe kwuru na ndị ojiegbe ji mkpuchi ihu wakporo ndị ọrụ nchekwa nọ ebe ahụ n’isi ụtụtụ Tuzde.
O kwukwara ha ga-ezipụta ozi n’uju banyere etu ha na ndị ahụ siri kwakọrịta mgbọ mana o kwughị ihe ọzọ banyere ma e nwere ndị otu ha ya bụ ihe tara isi ha dịka akụkụ na-efegharị siri kwuo.
O kwukwara na ha meminara ụfọdụ ndị ojiegbe ahụ ebe ndị ọzọ bu apa mgbọ egbe nwere gbaa ọsọ.

Ebe foto si, AFP
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Dịka akụkọ na-efegharị kwuru na mwakpo a metụtara ụfọdụ ndị agha Naịjirịa, anyị zigaara ọnụ na-ekwuru e ndị agha Naịjirịa n’Enugu ozi, onye bụ Major JE Unuakhalu ka ha gwa anyị okwu mana ọ azabeghị ya bụ ozi.
Ka ọ dị ugbua, BBC Igbo hụrụ na ọtụtụ ndị uweojii na ndị agha nọzị na ya bụ ụzọ Obeagu-Amodu na-eme nnyocha ndị mmadụ nakwa ụgbọala ha n’uju.
Otu nwoke jiri anya ya hụ ihe a mere, gwara onye ntaakụkụ anyị n'Enugu na ndị omekeome ahụ ji ụgbọala abụọ were wụbata ebe ahụ ndị ọrụ nchekwa nọ.
Ọ sị na ngwa ngwa ha rụtere nso ebe ahụ na ha wepụtara egbe ma gbagbuo ndị ọrụ nchekwa mmadụ abụọ nke mere ka ọsọ pụọ ndị niile nọ ebe ahụ ụkwụ.
Mwakpo a ga-eme ya nke ugboro atọ a na-eche na a gbagbugoro ndị uweojii nakwa ndị agha na ‘Checkpoint’ ahụ dị n'Obeagu Nkanụ ahụ.
Ya bụ ebe bụ nke ndị agha na ndị uweojii jikọrọ aka guzobe.
Ndị nọ ebe ahụ na-ekwu na odochabeghị anya ma ọ bụ ndị uweojii ka ọ bụ ndị agha lara mmụọ na mwakpo ahụ, dịka ozu abụọ tọgbọrọ n'ụzọ ahụ.
Ọnọdụ enweghị nchekwa n'Ọnwụwa Anyanwụ Naịjirịa
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ọtụtụ mwakpo malitere silitewa isi n'akụkụ ọwụwa anyanwụ Naịjirịa n'afọ ole m ole gara aga.
E gbuola ọtụtụ ndị nchekwa nke gụnyere ogbugbu otu nwaada Igbo bụ Gloria Matthew nke bụ onye agha Naịjirịa bụ onye Nkwere n'Imo steeti dịka ya na ọdịnaobi ya, onye 'Southern Kaduna', na-aga ịgbankwụ ha.
Mwakpo ndị a emetụtala ụlọọrụ ndị ọrụ nchekwa, ọtụtụ ụlọọrụ gọọmentị, ụlọọrụ ndị nkiti, ụlọakwụkwọ, okporoụzọ ndị njem nakwa ihe ngalaba ndị ọzọ n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirị.
Ọzọkwa bụ mkwapo na-eso ụbọchị Mọnde bụ ụbọchị a na-eme iwu ndị mmadụ ịnọ n'ụlọ.
Nke a emeela na ndị mmadụ anaghịzị emepee ọrụ kwa ụbọchị Mọnde n'izu ọbụla maka egwu mwakpo.
Mwakpo ndị a gụnyere: Mwakpo be ndị mmadụ, ntọrọ ndị mmadụ, mwakpo ụlọọrụ ndị uweojii, mwakpo ụlọ nga, mwakpo ndị ọrụ nchekwa, mwakpo ndị ọrụ gọomentị dị ịcheịche, mwakpo na ịgba ọkụ nye be ndị mmadụ maọbụ akụnụba ndị mmadụ maọbụ ụgbọala ndị mmadụ.
Gọọmentị Naịjirịa agbarụọla ihu etu ọnọdụ enweghị nchekwa si dị n'Ọwụwa Anywanụ Naịjirịa ugbua ma kwuo na ha na-agba mbọ idaju ọnọdụ ya bụ ihe.




























