Etu otu nwa agbọghọ si makpuo n'ime osimiri na Legọs

Mgbe e biputara ya

Otu nwata nwaanyị amakpuola n'ime osimiri Lagoon dị na Legọs dịka ndị ọrụ gbatagbata steeti ahụ si kwuo.

N'akwụkwọ ozi si onyeisi 'Lagos State Emergency Management Agency bụ Olufemi Oke-Osanyintolu kwuru na nwaanyị ahụ si n'ime ụgbọala 'taxi' nọ n'ime ya rituo ma makpuo n'ime osimiri.

"Onye ọkwọ ụgbọala ahụ kwuru na oge nwata nwaanyị ahụ nọ n'ime ụgbọala, ya na enyi ya nwoke na-aba aba n'ekwentị tupu ọ rịtuo," Oke-Osayintolu kwuru.

"Ndị ọrụ LRT, ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ Legọs, ndị LASWA, na ndị DSS na-agba mbọ ugbua ịma ka a ga-agụpụta nwaanyị ahụ."