Etu onye eze si mịpụ n'aka ndị ntọrị tọọrọ ya

Ebe foto si, Eze Joel Nwankwo Family
Onye eze ọdịnala na-achị obodo Isiala Umudi, nke dị na Nkwere, Imo steeti, bụ Joel Nwankwo, enwerela onwe ya n'aka ndị ntọ tọọrọ ya.
A tọọrọ Eze Nwankwo n'ụbọchị Fraịde gara aga, abalị itoolu nke ọnwa Sepụtemba 2022, n'ihu ụlọọrụ ya dị n'Owere.
Ndị ekperima tọọrọ ya kpọrọ ndị ezinụlọ ya n'ekwentị ma gwa ha ka ha kwụọ nde naịra 200 tupu ha atọhapụ eze ahụ.
Ha mechara butuo ego ahụ ruo nde naịra 12, mana dịka ndị ezinụlọ Nwankwo ka na-achọ ego ha ga-eji gbapụta nna ha, ihe ọrụ ebube mere.
Eze Nwankwọ mịpụrụ n'aka ndị ekperima ahụ ji ya n'ime ọhịa dị n'obodo Okwu, nke dị n'Ikeduru Imo steeti.
Otu onye ezinụlọ Nwankwo na-achọghị ka a kpọpụta aha ya gwara onye ntaakụkọ anyị na eze alọtala n'ụlọ ya ugbua.
Onye ahụ kwuru sị: "Ọ bụ site n'amara Chineke ka eze ji mịpụ n'aka ndị ntọ ahụ ji ya."
"Ọsọ ka o ji gbapụta n'okporoụzọ ebe ụfọdụ ndị mmadụ nyeere ya aka. Ugbua, ọ lọrutela ụlọ, mana ekwentị ya abụọ ka dị n'aka ndị ekperima ahụ."
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Michael Abattam azaghị ekwentị ya oge anyị kpọrọ ya gbasara akụkọ a.




























