Ọ bụ eziokwu na APC, PDP na APGA n'Imo North ekposaala, banye Labour Party?
Akụkọ na-ekwu na ọtụtụ ndị otu 'All Progressives Congress' (APC); 'Peoples Democratic Party' (PDP), na 'All Progressives Grand Alliance' (APGA), na mpaghara Imo North, ekwuola na ọ bụ 'Labour Party' ka ha ga-akawado na ntuliaka onyeisiala Naịjirịa ga-adị n'afọ 2023.
Ọtụtụ mmadụ gbakọrọ n'obodo Umuaro nke dị n'okpuru ọchịchị Isiala Mbano, Imo steeti n'ụbọchị Sọnde, abalị iri na itoolu nke ọnwa Jun, iji kwupụta nke a.
N'ọgbakọ ahụ, Chikwem Onuoha, onye si APC pụọ banye Labour pati, kwuru na ihe mere ha ji mee mkpebi a bụ maka na ha kwenyere na Peter Obi, onye ji ọkọlọtọ 'Labour Party' azọ ọkwa onyeisiala.

Onuoha kwuru sị: "Peter Obi egosila na ọ bụ olileanya ndị nkịtị na Naịjirịa, ya mere anyị ji kpebie ịkwado ya."
"Ka ọ dị ugbua, n'ime ndị niile pụtarala ịzọ ọkwa onyeisiala na 2023, Peter Obi bụ onye anyị kwenyere na ọ kacha ndị ọzọ mma."
Anyị nwere onye na-azọ ọkwa onyeisiala, aha ya bụ Tinubu - APC

Ebe foto si, Cajetan Duke/Facebook
Mana Cajetan Duke, bụ ọnụ na-ekwuru APC n'Imo steeti, gwara BBC Igbo na Chikwem Onuoha bụ onye mmiri na-eri na-achọ ebe ọ ga-ejide aka.
"Onuoha azọọla ọchịchị ugboro ugboro na APC ma kụọ afọ n'ala; ugbua ọ gbakpuola Labour Party," Duke kwuru.
"APC bụ pati a kacha mara aha ya n'Imo steeti. Ị gaa n'Okigwe Zone, Onuoha esoghi na ndị a ma aha ha n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị."
"APC Imo steeti kwụ chịm na-akwado onye jia aha pati anyị azọ ọkwa onyeisiala, bụ Bola Ahmed Tinubu."
Labour Party bụ 'IDP camp' ndị ndọrọndọrọ ọchị - APGA

Ebe foto si, John Iwuala
N'otu aka ahụ kwa, BBC Igbo kpọtụụrụ John Iwuala bụ onyeisi Apga n'Imo steeti, o wee kwuo na ihe niile Chikwem Onuoha kwuru bụ okwu asị.
O kwuru na 'Labour Party' aghọọla ogige ịgbaga ọsọ ndụ nye ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-achịtaghị aja.
Iwuala kwuru sị: "Chikwem Onuoha nọbụ na Apga, si ebe ahụ mabaa PDP, sikwa ebe ahụ makpuo APC, ugbua ọ banyela Labour Pati."
"Onuoha achịtaghị aja na ndọrọndọrọ ọchịchị n'Imo steeti. O nweghị ikike ikwuchitere APGA ọnụ."
"Apga nwere ndị tozuru etozu na-azọ ọkwa ọchịchị na mpaghara niile dị n'Imo North."
BBC kpọkwara Collins Opuruozor, bụ onyeisi mgbasaozi ọgbara ọhụrụ na PDP Imo steeti, mana ọ zaghị ekwentị ya ugboro ugboro.
Ọ bụ okpuruọchịchị isii mebere mpaghara a na-akpọ Okigwe Zone n'Imo steeti.
Ha gụnyere: "Ehime Mbano; Ihitte/Uboma; Isiala Mbano; Obowo; Okigwe; na Onuimo.





























