Etu ndị omekome ruru 30 si wakpo ụlọorụ ndị uweojii n'Abia steeti

Ndị uweojii nọ n'ime ụgboala ha

Ebe foto si, AFP

Mgbe e biputara ya

Ndị omekome ruru mmadụ iri atọ awakpoola ma gbaa ọkụ ụlọorụ ndị uweojii dị n'okpuruọchịchị Ugwunagbo dị n'Abia steeti.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Geoffrey Ogbonna gwara BBC na ọ bụ n'ụzụ ụtụtụ ụbọchị Tọzde, ebe elekere atọ ka ndị ahụ bịara n'igwe ha ma wakpoo ụlọorụ ndị uweojii ahụ.

"Ha gbara ụlọorụ dị ebe ahụ ọkụ ma wakpoo ebe anyị na-edebe ngwa agha dịka egbe na ihe ndi ọzọ" ka o kwuru.

O kwuru na ha na ndị uweojii nọ n'eche nche kwakọrịtara mgbọ tupu ha azọbanye n'ime ya bụ ụlọọrụ ndị uweojii.

Ihe ndị ọzọ ha gbara ọkụ gụnyere ụgbọala ndị uweojii abụọ ebe ha mebikwara ụlọorụ onyeisi ndị uweojii n'ebe ahụ bụ DPO.

"DPO anọghị nso n'ụlọọrụ ya mgbe ndị ahụ batara ịme mwakpo" ka ọ gwakwara BBC.

Otu onye ụweojii merụrụ ahụ na ya bụ mwakpo nọzị n'ụlọọgwu anata ọgwụịgwọ dịka e ji mma oge gbuwa ya isi.

Nsogbu nchekwa malitere n'izu ntuliaka a

Oyibo Chukwu

Ebe foto si, Oyibo Chukwu

Nkọwa foto, Oyibo Chukwu bụ onye ikpeazụ ndụ ya furu na mwakpo gbasara ndọrọndọro mere n'ọwụwa anyanwụ

Kemgbe otu izu gara aga ka akụkọ gbasara mwakpo na-efesa ebe niile.

Ndị omekome echeere bụ ndị Ipob/ESN wakporo ụlọọrụ ndị uweojii abụọ dị n'Ọnịcha.

Ha mechara gbaa otu ebe ọkụ n'Imo steeti n'ụbọchị Wenzde nke otu agadị nwaanyị amabeghi nwụrụ na ya bụ ọkụ.

N'abalị ụbọchị ahụ, e gburu onye na-azọ ọkwa ụlọomeiwu ukwu n'aha otu Labour Party aha ya bụ Oyibo Chukwu.

Nke ikpeazụ mere bụ ugbua a na-awakpo ụlọorụ ndị uweojii dị n'Abia steeti.