Osee foto atọọrọ n'Abia nakwa okwu nchekwa ọwụwa anyanwụ ndị mere n'izu a

Ebe foto si, Getty Images
Ndị tọọrọ otu osee foto n'Ebonyi steeti ekwuputala na ha chọrọ nde naira iri ise (50m) tupu ha atọghapụ ya.
Akụkọ kwuru na atọọrọ ya na ndị ọzọ o bu n'ime ụgbọala ya n'okporoụzọ Okigwe-Aba-Enugu kemgbe ụbọchị Wenzde.
Osee foto ahụ a ma dịka Uchenna Nwube na-arụ na ngalaba mgbasaozi Ebonyi steeti bụ EBBC sokwa arụ ọrụ n'obi gọọmentị steeti ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi steeti bụ Chris Anyanwu kwuru na nke a mere n'eziokwu.
O kwukwara na n'agbanyeghi na nke a emeghi na mpaghara ọ na-elekọta, na agbawala mbọ ịhụ na-azọpụtara nwa amadi a.
Otu onye so Nwube arụ ọrụ gwara BBC Igbo na ọ ka bụ izu ụka gara aga ka ọ lụrụ nwaanyị ọhụrụ.
Sit at Home: Etu e si gbaa ụgbọala ‘Trailer’ ọkụ na Nsukka n'ụbọchị Monde

Ebe foto si, Getty Images
Ndị na-amanye ndị mmadụ ịnọ n’ụlọ bụ ‘sit at home’, agbaala otu nnukwu ụgbọala ‘Trailer’ ọkụ n'isi ụtụtụ taa bụ Mọnde, ụbọchị isii nke ọnwa Juun.
Mwakpo a mere n’ụzọ Beach Junction nke Nsukka, Enugwu Steeti mere oge nnukwu ụgbọala ahụ nke a sị bụ nke ndị ụlọọrụ Dangote bu cementi na-agafe n’ụzọ Nsukka.
Ndị nọ ebe ahụ ihe a mere kwuru na ọ bụ ndị ekperime na-amanyekarị ndị mmadụ iwu ịnọ n'ụlọ kwa ụbọchị Mọnde ọbụla, wụbara n’ogige Beach Junction, Nsukka were wakpoo ụgbọala ahụ.
E kwuru na onye ọkwọ ụgbala ahụ gbapụrụ ọsọ tupu ha amụnye ụgbọala ya ọkụ.
Ndị nọ ebe ihe a mere kwuru na dịka ndị ekperima ahụ malitere ịgba ya bụ ụgbọala ọkụ, na ha kwupụtara na iwe ha bụ na ọkwọụgbọala ahụ nupuru isi n’iwu nọrọ n'ụlọ na-eme na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijiria niile kwa ụbọchị Mọnde.

Ebe foto si, Getty Images
Ihe Ị kwesịrị ima maka iwu sit at home
Dịka a nwụchiri Mazi Kanu, onyeisi otu Indigenous People of Biafra (Ipob), ndị otu Ipob kwuru na ha etinyela mmachi mkpagharị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ niile, kwa ụbọchị Mọnde ọbụla.
Ọ bụ eziokwu na ha mechara kwuo na ha ewepụla iwu a ha tiri, mana ndị ekperima bucha egbe ka na-eyi ndị mmadụ egwu n'ihi ya bụ 'sit-at-home'.
Onweghị onye ụjọ na-ekwe ka ọ pụta ezi n'ụbọchị Mọnde ọbụla n'ala Igbo niile.
Soludo akpọọla oku ugboro ugboro, rịọ arịrịọ, baa mba, ma tie mkpu ka a kwụsị ọnọdụ ịnọ n'ụlọ a, n'ihi na ọ na-emebi ọnọdụ akụnụba ala Igbo, mana ihe niile a amịtabeghị mkpụrụ.
Etu ndị ọrụ nchekwa si memina ndị ojiegbe n’Ekwulobia, Anambra
Ndị uweojii n’Anambra ekwuola etu ha si gbapụta ndị atọọrọ n’akụkụ Oko na Ekwulobia ma memina ụfọdụ ndị ojiegbe tọọrọ ndị a.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC Igbo na ha ntara banyere ntọrọ na mwakpo a mere n’akụkụ Oko na Ekwulobia n’ebe elekere otu na ọkara nke ihihe ụbọchị ụka.
End of Akụkọ ndị ọzọ banyere mwakpo n'Anambra
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ọ kọwara na ọ bụ mmadụ atọ ka ndị a zubere ịtọrọ.
O kwuru na: “Anyị gbaara ọsọ gbagaa ebe ahụ ma gbuo ya ndị ojiegbe ahụ atụmatụ ntọọrọ ahụ”
“Anyị na ndị a kwakọrịtara mgbọ nke mere anyị memina ụfọdụ n’ime ha”
Ikenga kwukwara na ha napụrụ ndị ọtụtụ ngwa ọgụ nakwa ụgbọala ha ji akpa ike.
O sị “Anyị gbapụtara mmadụ atọ ndị a achọrọ ịtọrọ”
Dịka Ikenga si kwuo, ndị uweojii ka nọ ebe ahụ agba mbọ inyochapụ etu ihe a siri mee.
Ọtụtụ ihe onyonyo pụtara na soshal midia na mgbede Sọnde a sị si Ekwulobia pụta gosiri ọtụtụ ndị nchekwa nọ ụzọ nke gụnyere ma ndị agha ma ndị uweojii.
Ihe onyonyo ụfọdụ gosiri mmadụ abụọ a gbagburu dịka ndị nchekwa nọ ozu ha nso.
Ozu ndị nọ n’ala ebe ahụ n’agba ọbara.
A na-eche ozi ndị uweojii banyere mmadụ ole kpọm kwem ha meminara nakwa ihe ndị ọzọ banyere mgbapụta a mere na mgbede Sọnde.
Nke a na-abịa dịka gọọmentị Anambra steeti kwurula na ha ga-agba mbọ hụ na ha memilara ndị ojiegbe na-akpa ike n’akụkụ steeti ahụ niile gbaa gburugburu.
Cheta na gọọmentị Anambra steeti kwere nkwa inye onye ọbụla kwupụtara ihe ọ ma banyere ndị ojiegbe maọbụ ndị na-akpa ike na steeti ahụ otu nde naịra ebe ha kwekwara nkwa inye onye ọbụla ga-agba ama banyere ogbugbu otu omeiwu steeti ahụ nde naịra iri.
Cheta na ndị ojiegbe gburu Okechukwu Okoye bụ onyeomeiwu na-anọchiteanya mpaghara Aguata II n'ụlọomeiwu Anambara steeti n’ọnwa Mee, 2022.
A tọọrọ Okoye n’ụbọchị 15 nke ọnwa Mee dịka ahụrụ ozu ya n’ụbọchị 21 nke ọnwa Mee.
Mwakpo a mere n’akụkụ Ekwulobia na Oko na-eme ya izu atọ mkpa mkpa a kpachara.




























