Mikhail Gorbachev: Onye ndu ikpeazu Soviet Union alaala mmụọ

Ebe foto si, Getty Images
Mikhail Gorbachev, onye ndu Soviet Union ikpeazu alaala mmụọ ka ọ gbachara afọ 91.
Gorbachev, bụ onye biri agha uche Soviet Union na mba ndị si Ọdịda Anyanwu Yurop buru onwe ha ọtụtụ afọ .
Gorbachev weghara ọchịchị n'afọ 1985, were mepere ụwa ọnụụzọ otu USSR dịka o wetara ọtụtụ mgbanwe.
Mana o nweghụghị ike igbochi nkụsa otu Soviet Union, bu ebe Rọshịa ọhụrụ si pụta.
Ihe ndị ndu mba ụwa na-ekwu maka ọnwụ ya
Dịka ozi ọnwụ Gorbachev pụtara, ọtụtụ ndị ọrụ na-eru n'okwu ewepụtala ozi mwute maka ọnwụ ya.
odeakwụkwọ ukwu otu United Nations bụ Antonio Guterres kọwara Gorbachev dịka onye ndu na mba ụwa ịchọ udo na-amasị ma sị, "Ọnwụ ya wutere m rinne".
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Praim Minista mba Briten bụ Boris Johnson tokwara maka idi ike nwe ike wụsị agha uche dara na Yurope ọtụtụ afọ dịka o kwuru na ọnwụ ya wutere ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Onyeisiala mba Fransi bụ Emman Macron kwuru n'ozi ya nke o wepụtara na Twitter sị: "Ozi iti aka n'obi maka ọnwụ Mikhail Gorbachev, nwoke udo, onye mkpebi o nwere mepere ndị Rọshịa ụzọ nwereonwe. Uchu o tinnyere n'ịchọ udo na Yurop gbanwere akụkọ anyị nile."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Onye bụdị Mikhail Gorbachev?
Mikhail Gorbachev bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị Rọshịa nakwa Soviet union, otu jịkọrọ mba ndị dị n'Ọwụwa Anyanwu Yorup kwenyeburu na kọmụnizm tupu ha ekesaa dịzịe mba 15.
A mụrụ ya n'abalị atọ nke ọnwa Maachị afọ 1931 na Privol'noe, Rọshịa.
Ọ bụrụ odeakwụkwọ ukwu otu Soviet Communist Party, nakwa onye ndu mba ahụ n'afọ 1985.