Ebubeagu alleged attacks: Ụlọikpe ekposala otu Ebubeagu n'Ebonyi steeti

Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abakaliki ekposala otu na-ahụ maka nchekwa Ọwụwa Anyanwụ bụ Ebubeagu ,ngalaba nke Ebonyi steeti maka imegide iwu Naijiria.
Ọkaikpe Jọstịs Akintayo Aluko, nyere mkpebi ahụ n'ikpe o kpere ụbọchị Wenezde abalịlị 15 nke ọnwa Febrụawrị n'Abakaliki.
Mazi Abia Onyeike gbara agbara otu nche EBubeagụ akwụkwọ n'ụlọ ikpe na-ebo ha ebubo na ha tọọrọ ya na ọnwa November afọ 2022 ma tie ya ihe tinka tiri pan.
N'ikpe ya Jọstis Aluko kwuru na Ụlọomeiwu Ebonyi Steeti enweghị ikike iguzobe Ebubeagu.
Ọ gara n'ihu nye iwu ka ndị uweojii nzuzo Naijria bụ DSS n'ịchafụ napụtacha ndị ọrụ nchekwa ahụ egbe ha nakwa akụrụngwa ọrụ nchekwa ndị ọzọ.
N' okwu ya, onye ji ọkwa kọmishiọma Ebonyị stat ebụ Mazi Uchemn Orji kwuru na gọọmenti Ebonyi anabataghị ya bụ ikpe o kwuru na ozighi ezi.
Ọ gwara ndị Ebonyị na gọọmenti Ebonyi steeti ga-agbaghara mkpebi ahụ n'Ụlọikpe Mgbegharị.
Cheta na ọtụtụ ebubo a na-ebo Ndị ọrụ nchekwa Ebubeagụ bụ na ha na- atọrị mmadụ ma na- egbu ndị ọ bụ mara gọmenti aka.































