Etu ụlọelu ogogo ise si daa n'ụlọakwụkwọ DMGS dị n'Onitsha, Anambra Steeti

Etu ụlọelu ogogo ise si daa n'ụlọakwụkwọ DMGS dị n'Onitsha, Anambra Steeti
Mgbe e biputara ya

Ụlọelu ogogo ise dara n’ụlọakwụkwọ Dennis Memorial Grammar (DMG) n’Onitsha, Anambra Steeti ataala isi otu onye mma merụọ mmadụ abụọ ahụ.

Ụlọ a bụ nke nọ n’ogogo ngwụcha ya dara n’ihe dịka elekere asaa nke ụtụtụ ụbọchị Wenezde 13 Juun, 2024.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara ebe ụlọ a dara kọwara na ọ bụ ụlọakwụkwọ DMG nwee ụlọelu ahụ, bụ nke ndị gụrụ akwụkwọ ebe ahụ n’oge gara aga na-arụ.

Akụkọ kwuru na a malitere ịrụ ụlọ ahụ n’ihe dịka afọ abụọ gara aga bụ nke a na-akwado ịgbape ya n’afọ ọzọ iji mee emume ncheta afọ 100 ụlọakwụkwọ ahụ malitere.

Mmadụ atọ ahụ o metụtara bụ ndị ọrụ na-arụ n’ụlọ ahụ, otu onye nwụrụ ebe mmadụ abụọ merụrụ ahụ - ha na-anata ọgwụgwọ ugbua.

Ndị ọkachamara n’ịrụ ụlọ gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na ha chọpụtara na akụrụngwa ndị e ji rụọ ụlọ ahụ dị mma kama na otu ihe mere ụlọ ahụ jiri daa bụ na e soghi ezi usoro rụọ yaa bụ ụlọ.

Ha gara n’ihu nye ndụmọdụ na gọọmentị kwesịrị ihiwe kọmitii gaa na-eme nyocha ma na-akụziri ndị ọrụ aka na-arụ ụlọ usoro e kwesịrị iji na-arụ ụlọ.

Ihe gọọmentị Anambra Steeti kwuru

Osote gọvanọ Anambra Steeti bụ Onyeka Ibezim gara njem nleta n’ụlọọgwụ ebe ndị merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ.

O tikwara ezinaụlọ ndị nwanne ha nwụrụ aka n’obi ma kwuo na gọọmentị amalitela ime nyocha banyere ya.