Etu ndị ojiegbe ezu ohi si yie ndị Umuahia egwu, gbagbuo otu onye

Otu nwaanyị alaala mmụọ dịka mgbọ tụrụ ya n'afọ oge ndị ojiegbe ezu ohi wakporo Umuahia n'ụbọchị Tọzde.
Mwakpo a tinyere ọtụtụ mmadụ nnukwu ụjọ n'ahụ, ọ kachasị n'ihi na ndị ekperima ahụ si n'ihu ụlọ gọọmentị Abia steeti gbaa ọsọ.
Ndị ojiegbe a wakporo otu onye gara weta nnukwu ego n'ụlọakụ na mpaghara Aba road, mana ndị uweojii chụwara ha ọsọ.
Oge ndị ekperima a rutere na mpaghara ụlọọgwụ gọọmentị 'Federal Medical Centre', kpachikpachi ụzọ jidere ha nke mere ka ha tinyere isi n'okporo ụzọIbiam road nke gawara n'ụlọ gọọmentị Abia steeti.
N'ihi kpachi kpachi ụzọ ahụ dịnụ, ndị ohi ahụ bidoro ịgba egbe aghara aghara iji chụsaa ndị mmadụ n'ụzọ.
Mgbọ egbe tụrụ mmadụ abụọ: otu onye na-ere ahụekere n'okporoụzọ nakwa otu onye nọọsụ na-arụ ọrụ na FMC.
Oge onye ntaakụkọ BBC Igbo gara n'ụlọọgwụ FMC, ọ hụrụ mmadụ abụọ ahụ mgbọ tụrụ ebe ha dina na-echere ọgwụgwọ; otu ka mgbọ tụrụ n'akpịrị ebe mgbọ tụrụ onye nke ọzọ n'afọ.
Mana onye nke mgbọ tụrụ n'afọ nwụrụ n'ụtụtụ taa bụ Fraịde.
Ndị ekperima ahụ mechara tinye isi n'ụzọ Afara ma si ebe ahụ gbalaa.

Mwakpo ahụ mere ka ụlọakụ niile dị n'ime obodo Umuahia mechie ngwangwa n'ihi ụjọ.
Ọtụtụ ụgbọala ndị uweojii mapụtaakwara na-akpagharị n'obodo iji kụjụọ ndị mmadụ obi.
Ihe ndị uweojii kwuru maka mwakpo a
Na nkọwa ya, Geoffrey Ogbonna bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abia Steeti kwuru na ọ bụ otu onye gara dọrọ nnukwu ego n'ụlọakụ ka ndị ohi ahụ chọrọ ịwakpo.
O kwuru na ndị uweojii chụwara ndị ekperima ahụ ọsọ nke mere ka ha hapụ ihe ha chọrọ ime ma zọwa isi onwe ha.
Ogbonna gara n'ihu kwuo na mgbọ tụrụ mmadụ abụọ na-agara onwe ha nakwa otu onye uweojii, oge ha na-achụ ndị ohi ahụ ọsọ.
"Anyị jichiri otu ụgbọala ndị ekperima ahụ ji bịa ohi ma jichikwaa otu egbe AK47 na mgbọ egbe atọ nakwa mma obejiri," Ogbonna kwuru.
Nnyocha gbasara ihe a merenụ ka na-aga n'ihu ugbua.




























