Gịnị bụ 'interim government'?

Mgbe e biputara ya

Interim Government bụ gọọmentị nwa mgbe nta a na-ehiwekarị mgbe a chọrọ inyefe ọchịchị maọbụ mgbe e nwere nsogbu ọchịchị.

Ihe dịka ndịagha ịnapụ ọchịchị n'ike, mgbanwe ọchịchị site na ndọrọndọrọ ọchịchị, ọnwụ onyeisiala maọbụ onyeisiala ịgba arụkwaghịm na nnupuisi ebe ọchịchị obodo nọ nwereike ime ka e hiwe 'interim government'.

Iji maa atụ, n'afọ 1993 dịka Moshood Abiola meriri ntuliaka nke ọkwa onyeisiala Naịjirịa nke e mere na Juun 12 1993, onye ọchịchị Naijirịa oge ahụ bụ Ọchịagha Ibrahim Babangida kagburu ya bụ ntuliaka ma hiwe ọchịchị nchere oge (interim government) nke o jiri nyefe Ernest Shonekan ọchịchị nwa mgbe nta dịka onyeisiala n'ụbọchị 27 nke ọnwa Ọgụst afọ 1993.

Ndị nchekwa uweojii nzuzo

Ebe foto si, DSS

Etu ụfọdụ ndị si akpa nkata itinye ọchịchị 'interim government' na Naịjirịa - DSS

Ngalaba nchekwa a kpọrọ Department of State Services (DSS) ekwoula na ọ bụ eziokwu na o nwere ndị na-akpa nkata itinye ọchịchị nwa mgbe nta a kpọrọ ‘interim government’ na Naịjirịa.

Ọnụ na-ekwuru ngalaba a bụ Peter Afunanya kwupụtara nke a na Wenezde, ma sị na ha ga-eme ihe niile iji mebie nkata ndị a na-akpa.

Ọ gakwara n’ihu kwuo na ha maara ụfọdụ ndị so na-akpata nkata itinye ọchịchị nchere oge a.

DSS kwuru na nkata ndị a na-akpa bụ ịgbahapụ ụzọ iwu ma dọo aka na ntị na nke a nwereike ibute ọgbaghara n’obodo.

“Anyị agaghị anabata nke a n’ụzọ ọbụla n’oge ọchịchị onye kwuo uche ya ma megide udo ndị Naịjirịa.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

“Nke ka nke a bụ nkata ndị a na-abịa dịka e mechara ntuliaka udo na mpaghara Naịjirịa dị iche iche.

Ifunanya gara n'ihu kọwaa atụmatụ ndị a ji na-eme ihe iji hụụ na ha tinyere ọchịchị nchere oge a.

"Ndị na-eme nke a atụleela usoro dị iche iche ha ga-eji mee ya nke gụnyere ịkwado ọgbaghara site na ngagharịiwe n'obodo ndị mepere emepe nke a ga-eji etinye ọnọdụ ọdịrịụkọ 'state of emergency'. Ọzọ bụ inwete ikike n'ụlọikpe iji gbochie inyefe ọchịchị n'aka gọọmentị etiti nakwa nke steeti ọhụrụ."

“DSS kwadoro atụmatụ onyeisiala nwere n’inyefe ọchịchị n’aka onye ọzọ n’udo, ha ga-agba mbọ ịhụ na nke ahụ bịara na mmezu. Ha na ndị ọrụ nchekwa dị iche iche ga-arụkọ ọrụ iji hụụ na e nyefere ọchịchị n'udo na-enweghi nsogbu ọbụla."

"N'ihi nke a, anyị na-adọ ndị niile na-akpa nkata a aka na ntị ka ha sepu aka enwe n'ofe tupu ọ ghọọ aka mmadụ."

"Anyị na-akpọkukwa ndị ụlọikpe, ụlọọrụ mgbasaozi nakwa ndị ọzọ ka ha ekwela ka ndị a were ha kwara ngwaọrụ iji bute ọgbaghara n'obodo."

"Ngalaba DSS agaghị egbu oge usoro ụzọ iwu kwadoro iji hụụ ka a kụpịara atụmatụ ọjọọ ndị a na-akpa."

Ozi ịdọ aka na ntị a na-abịa n’ime otu ọnwa e mechara ntuliaka ọkwa onyeisiala, nke ụlọọrụ Inec kpọpụtara Bola Ahmed Tinubu nke All Progressive Congress (APC) dịka onye meriri.

Ụfọdụ ndị zọrọ ọkwa a n’aha pati ọzọ dịka Peter Obi nke Labour Party (LP) na Atiku Abubakar nke Peoples Democratic Party (PDP) ewepụla okwu a n’ụlọikpe ma sị na nrụrụaka dị na ntuliaka a.