Etu ndị ojiegbe si wakpo ma gbuo onye nche Ebube Agu n'Ebonyi

Ndị nche Ebube Agu

Ebe foto si, Ebube Agu Ebonyi Steeti

Nkọwa foto, Ndị nche Ebube Agu
Mgbe e biputara ya

Otu onye nche Ebubeagu aha ya bụ Sunday Izhikpa alaala mmụọ dịka ndị ekperima amaghị ndị ha bụ wakporo ya n'ụbọchị Fraịde.

Izhikpa, onye obodo Nduakparata Igbeagu nke dị n'okpuru ọchịchị Izzi, nọ n'ihu ọrụ ya n'obodo Mkpuma Ekwa-oku oge ndị ekperima a wakporo ya ma were egbe gbagbuo ya.

Otu onye Ebube Agu na-achọghị ka anyị kpọpụta aha ya kwuru na ha buuru ozu Izhikpa ga tinye n'ụlọ ozu.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi steeti bụ Chris Anyanwu kwuru na ọ bụ eziokwu na mwakpo a mere eme.

Anyanwu kwuru na ọ na-eche ka onyeisi ndị uweojii ebe ya bụ ihe mere wetara ha akụkọ kpọmkwem etu o si mee.

Ndị uweojii abụọ merụrụ ahụ na mwakpo ndị ojiegbe

Onye uweojii

Na nke dịka ibe ya, ndị uweojii abụọ merụrụ ahụ oge ndị ojiegbe wakporo ha ma gbaa ụgbọala ha ọkụ n'Ebonyi steeti n'ụbọchị Tọọzde.

Mwakpo a mere na mpaghara Nkomoro-Agba, n'okpuru ọchịchị Ezza North na steeti ahụ.

Dịka Chris Anyanwụ, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi, si kwuo, ndị uweojii a nọ n'ụgbọala ha na-akpagharị dịka ọrụ ha si dị, oge ndị ekperima a wakporo ha ma malite ịkwa ha mgbọ.

Mana ndị uweojii lusokwara ndị omekome ahụ ọgụ .

"Ndị uweojii abụọ merụrụ ahụ site na mgbọegbe, mana onweghị onye n'ime ha nwụrụ anwụ," Anyanwu kwuru.

"Eburula ndị ahụ merụrụ gaa ụlọọgwụ maka ịnata ọgwụgwọ."

"Anyị ahụla akụkọ ụgha na-efegharị ebe nniile, na-ekwu na ndị uweojii abụọ nwụrụ, nke a abụghị eziokwu."

"Ọ bụghịkwa eziokwu na ndị ekperima ahụ bukọọrọ egbe na ngwaọgụ ndị uweojii."