Tomi Arayomi: Ihe onye amụma a na nwunye ya kwuru ha gabigara n’aka DSS

Tomi Arayomi na Tahmar Arayomi bụ nwunye ya

Ebe foto si, Tomi Arayomi/Facebook

Nkọwa foto, Onye amụma Tomi Arayomi na Tahmar Arayomi bụ nwunye ya
Mgbe e biputara ya

Akụkọ pụtara etu e siri nwụchịe Tomi Arayomi na nwụnye bụ ndị isi otu ụka Kraịst bụ Rig Nation n’ụbọchị asaa nke onwa Eprel 2023.

E mechakwara akụkọ ọzọ apụta site n’akara Facebook ụka a nke nọ na mba Amerịka bụ Rig Nation USA ma kwuo na a tọhapụla ha mana enweghi onye nụrụ ozi ọzọ n’aka ha maọbụ etu ahụ dị ha.

N’ehihe Sọnde, abalị itoolu nke ọnwa Eprel, Tomi Arayomi zipụtara ozi n’akara soshal midia ya kelee ọha ndị mmadụ maka ekpere na nkwado e nyere ha dịka a nwụchịrị ha.

Ozi kwuru na a ka ji onye ọrụ enyemaka ya eji n’ụlọọrụ ndị uweojii pụrụiche bụ ‘Department of State Services’ (DSS).

O kwuru:

“N’abalị Fraịdee, ụbọchị ‘Good Friday’, bụ ụbọchị asaa n’ọnwa Eprel, anyị bịaruru Abuja ịga leta otu alaka ụka anyị mgbe otu mmadụ isii bu egbe nke na-ekweghi kwuo ndị ha bụ bịa nwụchie mụ na nwunye m nakwa onye ọrụ enyemaka m.”

“A napụrụ anyị ekwentị anyị n’ike, tinye anyị n’otu ụgbọala ma buga anyị ebe m mechara chọpụta bụ isi ụlọọrụ ndị DSS”

“E seere foto anyị, sete akara aka anyị ma nakọrọ anyị ozi banyere ndụ anyị tupu akpọchie anyị n’ime otu ụlọ ma ghara ịgwa anyị ihe mere e ji nwụchie anyị.”

“E mechara gba anyị ajụjụ ọnụ aghara aghara mana dịka oku ndị mmadụ na-akpọ na soshal midia riri elu, ha tọhapụrụ mụ na nwunye ma ghara ịtọhapụ onye ọrụ enyemaka m.”

“Anyị agaghị agba n’anwụ ugbua ihe ndị a jụrụ anyị dịka anyị ka na-eche ka atọhapụ onye ọrụ enyemaka m.”

Ọ gara n’ihu kwuo na ihe a mere emeela ya na nwunye ya nakwa ụmụ ya ekpebia na ha ga-apụ Naịjirịa ngwa ngwa.

O kwuru na ọ ma etu ihe dị na Naịjirịa tupu ha lọghachite ebe a mana ndị hụrụ ha n’anya nakwa ndị nkwado na ndị ndụmọdụ ha arịọla ha ka ha puo n’oge a maka ọdịnma ha.

Tomi Arayomi

Ebe foto si, Tomi Arayomi/Facebook

Etu akụkọ a siri malite

Cheta na n'ụbọchị Fraịdee na ụka Rig Nation USA dere

"Daalụnụ maka ekpere unu, a tọhapụla Apọstulụ na nwunye ya."

Ka anụghị ozi ọzọ banyere ndị a, ọha malitere ịjụ ajụjụ banyere ihe mere e ji nwụchie ya na nwunye ya.

N’ụbọchị ahụ akụkọ nwụchi ha gbara n'ọha, ejima Tomi Arayomi zipụtara ozi na soshal midia banyere nke a.

N'ihe onyonyo a ejima ya nwoke bụ Tobi Arayomi zipụtara, ọ rịọrọ ọha n’olu gbata gbata ka ha tinye ọnụ ma zipụta ozi na ndị ọrụ nchekwa nwụchiri ejima ya na nwunye ya bụ Tahmar Arayomi.

O kwuru:

“A nwụchịrị nwanne m n’ọdọ ụgbọelu nke Legọs ya na nwunye, biko ndị na-eso ya ebe niile, na UK, na Naịjirịa, tipụnụ mkpu maka ihe a”

N’ihe onyonyo ahụ, Tobi boro ebubo na ndị ọrụ nchekwa nwụchiri ejima ya maka okwu nakwa amụma ụfọdụ ndị o buru nke na-adaghị ha nke ọma na ntị.

Skip Facebook post
Hapụ Facebook ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Facebook. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Facebook iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of Facebook post

Akụkọ na-ekwu na anwụchiri Tomi na nwunye ya bụ Tahmar n'ọdụ ụgbọelu Legọs

Ebe foto si, Tomi Arayomi/Facebook

Nkọwa foto, Akụkọ na-ekwu na anwụchiri Tomi na nwunye ya bụ Tahmar n'ọdụ ụgbọelu Legọs
Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Ọ gara n’ihu kwu:

“Ihe gọọmentị Naịjirịa na-eme bụ ihe ihere, e nwere ndị ụkọchukwu ndị e deturu aha ha imegide nke gụnyere aha nwanne m nwoke.”

O kwuru:

“Ọ bụrụ na ị na-akwanyere nwanne m ugwu maọbụ bụrụ onye na-eso ya nakwa amụma ya, biko kesaa ihe a ebe niile ọha nụ. Biko tinyenụ ya na nwunye ya n’ekpere unu.”

"Ihe a bụghị ihe njakarị, ọ bụghị ihe egwuregwu, bikonụ."

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

O dobeghi anya ihe mere ndị ọrụ nchekwa jiri nwuchie ya mana ọtụtụ ezipụta ozi na soshal midia na-ebo ebobo na ọbụ maka na-akwadoghi onye nwetere mmeri na ntuliaka a bụ Bola Ahmed Tinubu mere e jiri nwụchie ya.

Ebubo a nweghi ihe aka ebe dịka ụlọọrụ DSS bụ ndị a na-arụ aka n'okwu nwụchi ha azabeghị ozi ndị BBC Igbo zitere ha banyere okwu a ruo ugbua.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 3

Arayami bụ onye ọtụtụ ndị na-eso okpukperechi Kraịst ma ọkachasị dịka ọ na-ebu amụma na-ada ụda. Ụfọdụ okwu o kwurula akpatakwala okwu n’ọha dịka ọ na-ekwu karị na ‘anaghị m atụ egwu’ nakwa na ‘anaghị m ezo ọnụ’.

Tomi Arayomi

Ebe foto si, Tomi Arayomi/Facebook

Onye bụ Tomi Arayomi?

Arayomi so na ndị isi ụka tinyere ọnụ na ntuliaka Naịjirịa 2023 ma sorokwa buo ọtụtụ amụma maka ya bụ ntuliaka.

O gosirikwa nkwado ya nye otu n’ime ndị zọrọ okwa onyeisiala 2023 nke na-enwetaghi mmeri. Ụfọdụ okwu ya rụkwara onye nwetere mmeri na ntuliaka a aka.

Websaịt ọbaozi ya depụtara sị dịka “Onye na-ebu amụma banyere gbasara ọchịchị nke nwerela ohere jiri amụma ya nye ndị ọchịchị mba dị iche iche ndụmọdụ nke bụ mba ndị nọ n’otu ‘United nations’ nakwa ndị ụlọomeiwu ha”.

Ihe ndị ọzọ dị mkpa ịma maka Arayomi

  • Ọ malitere ịrụ ọrụ dịka onye ụkọchukwu n’ụka Foundation Faith Church mgbe ọ dị afọ 16
  • Ọ gụrụ akwụkwọ dịka onye ọkaiwu na mahadum Hertfordshire nke mba Briten
  • Ọ nwere ngalaba ụka Kraịsti nke ya na-arụ ọrụ ibu amụma n’akụkụ ụwa dị iche iche gụnyere mba Amerịka, Afrịka, Eshịa, Kanda na ebe ndị ọzọ
  • Ya na nwunye ya bụ Tahmar lụrụ n’afọ 2015 dịka ha abụọ na-arụkọ ọrụ ụkọchukwu, ibu amụma nakwa nhazị ọrụ na ngalaba ụka ha
  • Ha abụọ ji ụmụ atọ
  • Ya na ezinaụlọ ya hapụrụ mba Briten na nso nso kwalata Naịjirịa ebe ha nọzị arụ nkwalite ụka ha